Akwụkwọ nsọ
Mọmọn 8


Isi 8

Ndị Leman chọpụtara ma bibie ndị Nifaị—Akwụkwọ nke Mọmọn ga-apụta site nʼike nke Chineke—Ahụhụ nile ekwupụtakwasịrị ndị na-ekupụta ume iwe na esem-okwu megide ọrụ nke Onye-nwe—Akụkọ-ndekọta nke ndị Nifaị ga-apụta nʼụbọchị nke ajọọ-omume, ịdaghachi-azụ nʼagwa ọma, na ịgọnarị okwukwe. Ihe dịka afọ 400 ruo 421 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Lee mụ, Moronaị, edechaala akụkọ-ndekọta nke nna m, Mọmọn. Lee, enwere m nanị ihe ole na ole m ga-ede, bụ ihe ndị nke nna m nyeworo m nʼiwu.

2 Ma ugbua o wee ruo na mgbe nnukwu agha ahụ dị egwu gasịrị na Kumora, lee, ndị Nifaị ndị gbapụworo nʼime mba dị na ndịda-ndịda ndị Leman chụrụ-nta ha, ruo mgbe ebibiri ha nile.

3 Ma ha gbukwara nna m, ma ọbụna anọ m nanị m ide akụkọ mwute nke mbibi nke ndị m ahụ. Mana lee, ha agawo, ana m emezu iwu nke nna m. Ma ọbụrụ na ha ga-egbu m, amaghị m.

4 Ya mere aga m ede ma zolite akụkọ-ndekọta nile nʼime ala; ma ebe ọbụla m na-aga ọdịghị ihe o mere.

5 Lee, nna m edewo akụkọ-ndekọta nke a, ma o dewo ebum-nʼobi dị nʼime ya. Ma lee, agaara m ede kwa ya ma ọbụrụ na m nwere ohere nʼelu epekele nile ahụ, mana ọdịghị nke m nwere; ma ntụ-igwe onweghị nke m nwere, n’ihi na nanị m nọ. Egbuwo nna m nʼagha, na ndị ikwu na ibe m nile, ma enweghị m ndị enyị ma-ọbụ ebe m ga-aga; ma oge Onye-nwe ga-achọ ka m nọruo amaghị m.

6 Lee, narị afọ anọ agafewo site nʼoge ọbịbịa nke Onye-nwe anyị na Onye-nzọpụta anyị.

7 Ma lee, ndị Leman achụwo-nta ndị m, ndị Nifaị, gbada site nʼobodo-ukwu ruo nʼobodo-ukwu na site nʼebe ruo nʼebe, ọbụna ruo mgbe ha na-anọghị kwa ọzọ; ma nnukwu ka ọdịda ha diworo; e, nnukwu na ịtụ-nʼanya ka mbibi nke ndị m bụ ndị Nifaị dị.

8 Ma lee, ọ bụ aka nke Onye-nwe bụ ihe meworo ya. Ma lee kwa ndị Leman nọ nʼagha otu onye na ibe ya; ma iru ala nke a nile bụ otu gburu-gburu esepụghị aka nke igbu-mmadụ na ịkwafu-ọbara; ma ọdịghị onye matara mgbe agha ahụ ga-agwụ.

9 Ma ugbua, lee, anaghị m ekwu kwa ọzọ gbasara ha, n’ihi na enweghị ndị ọzọ fọdụrụ ma ọbụghị ndị Leman na ndị-ori ndị nọ n’elu iru nke nʼala ahụ.

10 Ma enweghị ndị nke matara ezi Chineke ahụ ma ọbụghị ndị na-eso-ụzọ nke Jisus, ndị nọgidere nʼala ahụ ruo mgbe ajọọ-omume nke ndị ahụ karịrị nnukwu nke mere na Onye-nwe achọghị kwa ka ha nọdụ ha na ndị ahụ; ma ọbụrụ na ha nọ nʼelu iru nke ala ahụ ọdịghị onye matara.

11 Mana lee, nna m na mụ ahụwo ha, ma ha ekwusaworo anyị ozi-ọma.

12 Ma onye ọbụla nke ga-anata akụkọ-ndekọta nke a, ma ọ gaghị ekwutọ ya n’ihi ezughị-oke nile nke dị nʼime ya, onye ahụ ga-amata maka nnukwu ihe ndị karịrị ndị a. Lee, abụ m Moronaị; ma ọbụrụ na o kwere mee, aga m eme ka unu mata ihe nile.

13 Lee, abịa m na ngwụcha nke ikwu okwu gbasara ndị a. Abụ m nwa nwoke nke Mọmọn, ma nna m bụụrụ onye agbụrụ nke Nifaị.

14 Ma abụ m otu onye ahụ nke na-ezolite akụkọ-ndekọta nke a nye Onye-nwe; epekele nile dị na ya adịghị uru ha bara, n’ihi iwu-nsọ nke Onye-nwe. N’ihi na o kwuru nʼezi-okwu na ọdịghị onye ga-eji ha maka inweta uru; mana akụkọ-ndekọta ahụ dị na ya bara nnukwu uru; ma onye ọbụla ga-ewepụta ya ìhè, ya ka Onye-nwe ga agọzi.

15 N’ihi na ọdịghị onye ga-enwe ike iwepụta ya ìhè ma ọbụghị na Chineke nyere ya; n’ihi na Chineke chọrọ na a ga-eme ya lekwasị anya nanị n’otuto ya, ma-ọbụ ọdịmma nke ndị mgbe ochie na ndị ọgbụgba-ndụ nke Onye-nwe gbasasịrị oge dị anya.

16 Ma ngọzi na-adịrị onye nke ga-ewepụta ihe nke a nʼìhè; n’ihi na a ga-ewepụta ya site nʼọchịchịrị baa nʼìhè, dịka okwu Chineke siri dị; e, a ga-ewepụta site nʼala ahụ, ma ọ ga-enwupụta site nʼọchịchịrị, ma bịaruo na mmata nke ndị ahụ; ma a ga-eme ya site nʼike nke Chineke.

17 Ma ọbụrụ na e nwere iri-mpe nile ha bụ iri-mpe nile nke mmadụ. Mana lee, anyị amaghị iri mpe ọbụla; otu ọ sịla dị Chineke matara ihe nile; ya mere, onye nke na ekwutọ, ya kpachara anya adịghị ama ama na ọ ga anọ nʼihe egwu nke ọkụ ala-mụọ.

18 Ma onye nke na asị: Gosị m, ma-ọbụ a ga eti gị ihe—ya kpachara anya adịghị ama ama ọ ga-enye iwu nke ihe ahụ nke Onye-nwe sị emela.

19 N’ihi na lee, onye ahụ nke na-ekpe ikpe aghara-aghara a ga-ekpe kwa ya ikpe aghara-aghara; n’ihi na dịka ọrụ ya nile siri dị ka ụgwọ ọrụ ya nile ga-adị; ya mere, onye nke na-eti mmadụ ihe a ga-eti kwa ya ihe, site nʼaka Onye-nwe.

20 Lee ihe akwụkwọ-nsọ kwuru—mmadụ agaghị eti onye-ọzọ ihe, ọbụghị ma ọ ga-ekpe onye ọzọ ikpe; n’ihi na ikpe ikpe bụ nke m, ka Onye-nwe kwuru, ma ịbọ ọbọ bụ kwa nke m, ma aga m akwụghachị.

21 Ma onye ọbụla nke ga-ekupụta ume iwe na esem-okwu nile megide ọrụ nke Onye-nwe, ma megide ndị ọgbụgba-ndụ nke Onye-nwe ndị bụ nke ụlọ nke Israel, ma ga-asị: Anyị ga-ebibi ọrụ nke Onye-nwe, ma Onye-nwe agaghị echeta ọgbụgba-ndụ ya nke o meworo nye ụlọ nke Israel—onye ahụ nọ nʼihe egwu igbutu-egbutu ma tụba nʼime ọkụ.

22 N’ihi na ebum-nʼobi ebighi-ebi nile nke Onye-nwe ga-aga nʼiru, ruo mgbe a ga-emezu nkwa ya nile.

23 Chọọ amụma nile nke Aịsaịa. Lee, enweghị m ike ide ha. E, lee asị m unu, na ndị nsọ ahụ nke gaworo nʼiru m, ndị nwereworo ala nke a, ga-eti mkpu, e, ọbụna site nʼuzuzu ka ha ga-etiku Onye-nwe; ma dịka Onye-nwe na-adị ndụ ọ ga-echeta ọgbụgba-ndụ ahụ nke o meworo ya na ha.

24 Ma ọ matara ekpere ha nile, na ha bụ maka ụmụnne ha ndị nwoke. Ma ọ matara okwukwe ha, n’ihi na nʼaha ya ka ha nwere ike iwepụ ugwu-ukwu nile; ma nʼaha ya ka ha nwere ike ime ụwa ka ọ maa jijiji; ma site nʼike nke okwu ya ka ha mere ụlọ-mkpọrọ nile ka ha tụgharịa daa nʼala; e, ọbụna oke ọkụ ahụ dị egwu enweghị ike imerụ ha arụ, ọbụghị anụ-ọhịa ma-ọbụ agwọ nile bu nsi, n’ihi ike nke okwu ya.

25 Ma lee, ekpere ha nile bụ kwa maka onye ahụ nke Onye-nwe ga-ekwe ka o wepụta ihe ndị a.

26 Ma ọdịghị onye kwesịrị ikwu na ha agaghị abịa, n’ihi na nʼezi-okwu ha aghaghị abia, n’ihi na Onye-nwe ekwuwo ya; n’ihi na site nʼala ka ha ga-abịa, site nʼaka nke Onye-nwe, ma ọdịghị onye nwere ike ịkwusị ya; ma ọ ga-abịa nʼụbọchị nke a ga-asị na ọrụ-ebube nile adịghị kwa ọzọ; ma ọ ga-abịa ọbụna dịka mmadụ ọ ga-esi na ndị nwụrụ-anwụ kwuo okwu.

27 Ma ọ ga-abịa nʼụbọchị mgbe ọbara nke ndị-nsọ ga-akpọkụ Onye-nwe, n’ihi ntụgwa nzuzo nile na ọrụ nile nke ọchịchịrị.

28 E, ọ ga-abịa nʼụbọchị mgbe a ga-agọnarị ike nke Chineke, ma nzukọ-nsọ nile ga-abụ ihe e merụrụ emerụ ma ga-ebuli onwe ha elu na mpako nke obi ha nile; e, ọbụna nʼụbọchị mgbe ndị ndu nile nke nzukọ-nsọ nile na ndị nkuzi nile ga-ebili na mpako nke obi ha nile, ọbụna ruo na ntaji-anya nke ndị bụ ndị nke nzukọ-nsọ ha nile.

29 E, ọ ga-abịa nʼụbọchị mgbe a ga-anụ maka ọkụ nile, na oke-ikuku-mmiri nile, na uzu nile nke anwụrụ-ọkụ nʼala ndị mba ọzọ nile;

30 Ma a ga-anụ kwa maka agha nile, asịrị nile nke agha nile, na ala-ọma-jijiji nile nʼọtụtụ ebe nile dị iche iche.

31 E, ọ ga-abịa nʼụbọchị mgbe a ga-enwe nnukwu mmerụ nile nʼelu iru nke ụwa; a ga-enwe igbu-mmadụ nile, na izu-ori, na ikwu okwu-ụgha, na aghụghọ nile, na akwụnakwụna nile, na ụdị ihe arụ nile dị iche iche; mgbe a ga-enwe ọtụtụ ndị ga-asị, Mee nke a ma-ọbụ mee nke ahụ, ma ọdịghị ihe o mere, n’ihi na Onye-nwe ga-akwado ụdị ahụ nʼụbọchị ikpe-azụ. Mana ahụhụ ga-adịrị ụdị ndị ahụ, n’ihi na ha nọ nʼime olulu ilu na agbụ nile nke ajọọ-omume.

32 E, ọ ga-abịa nʼụbọchị mgbe a ga-enwe nzukọ-nsọ nile e wulitere ndị ga-asị: Bịakwute m, ma n’ihi ego unu a ga-agbaghara unu mmehie unu nile.

33 O unu ndị ọjọọ na ndị nduhie na ndị na-akpọ-ekwe-nkụ, gịnị mere unu ji wulitere onwe unu nzukọ-nsọ nile inweta uru? Gịnị mere unu gbanweworo okwu nsọ nke Chineke, ka unu wee wetara mkpụrụ-obi unu ọmụma-ikpe? Lee lekwasị nụ anya na mkpughe nile nke Chineke; n’ihi na lee, oge ahụ na-abịa nʼụbọchị ahụ mgbe a ga-emezu ihe ndị a nile.

34 Lee, Onye-nwe egosịwo m nnukwu na ihe ịtụ-nʼanya nile gbasara ihe nke ga-abịarịrị na nso-nso, nʼụbọchị ahụ mgbe ihe ndị a nile ga-abịaru nʼetiti unu.

35 Lee, ana m agwa unu dịka a ga-asị na unu nọ nʼebe a, ma unu anọghị ya. Mana lee, Jisus Kraịst egosịwo m unu, ma a matara m ihe unu na-eme.

36 Ma a matara m na unu na-aga na mpako nke obi unu nile; ma enweghị ndị ma ọbụghị ole na ole nanị ndị na anaghị ebuli onwe ha elu na mpako nke obi ha nile, ruo na oyiyi nke ọmarịcha akwa-oyiyi, ruo na ntaji-anya, na esem-okwu nile, na echiche ọjọọ, na inye-nsogbu nile, na ụdị ajọọ-omume nile di iche iche; ma nzukọ-nsọ unu nile, e, ọbụna nke ọbụla, emeruwo ha n’ihi mpako nke obi unu nile.

37 N’ihi na lee, unu hụrụ ego nʼanya, na ihe onwunwe unu, na ọmarịcha ihe oyiyi unu, na ịchọ nzukọ-nsọ unu nile mma, karịa ka unu siri hụ ndị ogbenye na ndị mkpa-na-akpa, ndị ọrịa na ndị a na-akpagbu-akpagbu nʼanya.

38 O unu ndị merụrụ-emerụ, unu ndị iru-abụọ, unu ndị nkuzi, ndị na ere onwe unu maka ihe ahụ nke ga-an̄acha an̄acha, gịnị mere unu jiworo merụọ nzukọ-nsọ nke Chineke? Gịnị mere ihere ji na-eme unu iwekwasị onwe unu aha nke Kraịst? Gịnị mere unu anaghị eche na uru nke an̄ụrị agwụgh-agwụ dị ukwu karịa ọnọdụ ihuju-anya nke na anaghị anwụ-anwụ—n’ihi otuto nke ụwa?

39 Gịnị mere unu na-eji ihe nke na-enweghị ndụ na-achọ onwe unu mma, ma unu na ekwe ka ndị agụụ na-agụ, na ndị mkpa-na-akpa, na ndị gba-ọtọ, na ndị ọrịa na ndị a na-akpagbụ-akpagbụ gafee nʼakụkụ unu, ma unu anaghị ahụ ha?

40 E, gịnị mere unu jiri nʼewulite ihe arụ nzuzo nile unu inweta uru, ma mee ka ndịnyom isikpe na-eru uju nʼiru Onye-nwe, na kwa ndị na-enweghị nne na nna na eru-uju nʼiru Onye-nwe, na kwa ọbara nke ndị nna ha na ndị di ha ịkpọku Onye-nwe site nʼala, maka ịbọ-ọbọ nʼisi unu?

41 Lee, mma-agha nke ịbọ-ọbọ kọrọ nʼofe isi unu; ma oge ahụ na-abịa ọsọ-ọsọ mgbe ọ ga-abọso unu ọbọ nke ọbara nke ndị nsọ ahụ. N’ihi na ọ gaghị anagide kwa mkpọku ha ọzọ.