Akwụkwọ nsọ
Mọmọn 6


Isi 6

Ndị Nifaị wee gbakọta nʼala nke Kumora maka ịlụ-agha ikpe-azụ—Mọmọn wee zoo akụkọ-ndekọta nile ahụ dị nsọ nʼugwu Kumora—Ndị Leman nwere mmeri, ma e bibiri mba Nifaị—Ọtụtụ narị nke ọtụtụ puku ka e jiri mma-agha gbuo. Ihe dịka afọ 385 mgbe a mụsịrị Kraịst.

1 Ma ugbua edechaala m akụkọ-ndekọta m gbasara ambibi nke ndị m, ndị Nifaị. Ma o wee ruo na anyị zọrọ-ije gaa nʼiru ndị Leman.

2 Ma mụ, Mọmọn, degaara eze nke ndị Leman akwụkwọ-ozi, ma chọọ nʼaka ya ka o kwenye ka anyị kpọkọta ndị anyị ọnụ anʼala nke Kumora, nʼakụkụ ugwu nke a kpọrọ Kumora, ma nʼebe ahụ ka anyị ga-enwe ike nye ha agha.

3 Ma o wee ruo na eze ndị Leman kwere meere m ihe ahụ nke m chọrọ.

4 Ma o wee ruo na anyị zọgara-ije nʼala nke Kumora, ma anyị rụnyere ụlọ-ịkwuu anyị nile gburu-gburu ugwu Kumora ahụ; ma ọ bụụrụ nʼala nke ọtụtụ mmiri, osimiri nile, na isi-iyi nile; ma nʼebe a anyị nwererịị olile-anya ịnọ nʼọnọdụ-ọma karịa ndị Leman.

5 Ma mgbe narị afọ atọ na iri asatọ na anọ gafeworo, a kpọbatawọrịị ndị nke anyị nile fọdụrụ nʼala nke Kumora.

6 Ma o wee ruo na mgbe anyị kpọkọtaworo ndị anyị nile nʼotu nʼala nke Kumora, lee mụ, Mọmọn, malitere ika nka; ma ebe m matara na ọ bụ ịgba mbọ ikpe-azụ nke ndị m, ma ebe Onye-nwe nyeworo m ịwu ka m ghara ikwe ka akụkọ-ndekọta nile nke e nyedataworo site nʼaka ndị nna anyị, ndị nke dị nsọ, ịdaba nʼaka nile nke ndị Leman, (n’ihi na ndị Leman ga-ebibi ha) ya mere e mepụtara m aakụkọ-ndekọta a site nʼepekele nile nke Nifaị, ma bzoo nʼugwu Kumora akụkọ-ndekọta nile nke e tinyere m nʼaka site nʼaka nke Onye-nwe, ma ọbụghị epekele cole na ole ndị a nke m nyere nwa m nwoke dMoronaị.

7 Ma o wee ruo na ndị m, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha, hụrụ andị-agha nile nke ndị Leman ugbua ka ha na azọ-ije chee ha iru, ma nʼịtụ-egwu ahụ nke dị egwu nke ọnwụ nke jupụtara obi nile nke ndị ajọọ-omume, ka ha chere ịnabata ha.

8 Ma o wee ruo na ha bịara ịlụ-agha megide anyị, ma mkpụrụ-obi onye ọbụla jupụtara nʼoke egwu n’ihi nnukwu nke ọnụ-ọgụgụ ha nile.

9 Ma o wee ruo na ha jiri mma-agha dakwasị ndị m, ma jiri ụta, ma jiri akụ, ma jiri onyike, ma jiri ụdị ngwa-ọgụ nile dị iche iche nke agha.

10 Ma o wee ruo na ndị nwoke m e gbudara ha, e, ọbụna puku iri m ndị mụ na ha nọ, ma adara m na mmeru-arụ nʼetiti ha; ma ha gafere nʼakụkụ m nke mere na ha ewetaghị ndụ m na ngwụcha.

11 Ma mgbe ha gazuworo ma gbuda andị m nile ma ewezuga anyị iri abụọ na anọ, (nʼetiti ndị nke nwa m nwoke nọ nʼime ha) ma anyị ebe anyị gbanarịworo ọnwụ nke ndị anyị nwụrụ-anwụ, hụrụ nʼechi ya, mgbe ndị Leman laghachịworo nʼebe izu-ike ha nile, site nʼelu nke ugwu Kumora ahụ, puku iri nke ndị m ahụ ndị e gbudara, ebe m nọ nʼiru nʼedu ha.

12 Ma anyị hụkwara puku iri nke ndị m ahụ ndị nwa m nwoke Moronaị duru.

13 Ma lee, puku iri nke Gịdgịdona ahụ adawọrịị, na kwa ya nʼetiti ha.

14 Ma Lama adawọrịị ya na puku iri ya; ma Gịlgal adawọrịị ya na puku iri ya; ma Lịmha adawọrịị ya na puku iri ya; ma Jeneum adawọrịị ya na puku iri ya; ma Kumenaịha, ma Moronaịha, ma Antionụm, ma Shịblọm, ma Shem, ma Jọsh, adawọrịị ha na puku iri ha onye ọbụla.

15 Ma o wee ruo na e nwere iri ndị ọzọ ndị nke dara na mma-agha, ha na puku iri ha onye ọbụla; e, ọbụna andị m nile, ma ọbụghị iri abụọ na anọ ndị ahụ mụ na ha nọ, na kwa ole na ole ndị nke gbabara na mba ndị nke dị na ndịda-ndịda, na ole na ole ndị nke gbafekwugara ndị Leman, ma ha adawo, ma anụ-arụ ha, na ọkpụkpụ nile, na ọbara tọgbọrọ nʼelu iru nke ụwa, ebe aka nke ndị ahụ gburu ha hapụrụ ha ka ha rekasịa nʼelu ala ahụ, na ka ha tụrisịa ma laghachịkwuru nne ha ala.

16 Ma mkpụrụ-obi m gbawara na mgbu, n’ihi ndị nke e gburu-egbu na ndị m, ma etiri m mkpu:

17 O unu ndị mara mma, olee otu unu gaara-esi fuo site nʼụzọ nile nke Onye-nwe! O unu ndị mara mma, olee otu unu gaara-esi jụ Jisus ahụ, onye guzoro nʼaka abụọ ghere-oghe ịnabata unu!

18 Lee, ọbụrụ na unu emebeghi ihe a, unu agaraghị ada. Mana lee, unu adawo, ma a na m eru-ụjụ ofufu unu.

19 O unu ụmụ-nwoke na ụmụ-ada, unu ndị nna na ndị nne, unu ndị di na ndị nwunye, unu ndị mara mma, olee otu o siri bụrụ na unu gaara adawo!

20 Mana lee, unu agawo, ma mwute m nile enweghị ike iweta nlaghachị azụ unu.

21 Ma ụbọchị ahụ na-abịa ọsọ-ọsọ mgbe arụ unu na-anwụ anwụ ga-eyịkwasịrịrị anwụghị-anwụ, ma arụ nile ndị a ndị nke na-erekasị ugbua nʼire ure ga-aghọrịrị aarụ ndị na-agaghị ere ure; ma mgbe ahụ unu ga-eguzorịrị nʼiru oche-ikpe nke Kraịst ahụ, ka e kpee unu ikpe dịka ọrụ unu nile siri dị; ma ọbụrụ na unu bụ ndị ezi-omume, mgbe ahụ ka unu ga-enwe ngọzi, unu na ndị nna unu ndị gafeworo tutu unu.

22 O ọbụrụ na unu chegharịworọrị tutu nnukwu mbibi nke a abịakwasị unu, Mana lee, unu agawo, ma Nna ahụ, e, Nna Mgbe-ebighi-ebi nke elu-igwe, matara ọnọdụ unu; ma ọ na-emeso unu dịka aikpe ya ziri-ezi na bebere ya siri dị.