Ka Ebulie Mmadụ Niile
Ka anyị na-elekwasị anya na Jizọs Kraịst, kuzie ozizi Ya, na ịmụta nʻịdị uchu, anyị na-akpọ Mmụọ Nsọ ka o mee ka okwukwe anyị na Jizọs Kraịst sikwuo ike ma nyere anyị aka ime ka anyị yie Ya karịa.
A kọrọ akụkọ banyere otu nwa akwụkwọ mahadum na-eto eto bụ onye ya na otu klas na-ama aka, nʻihi ya o goro onye nkuzi ka o nyere ya aka. Ka ngwụcha nke nkuzi ahụ bịara nso, prọfesọ ahụ kwupụtara na ụmụ akwụkwọ nwere ike weta otu mpempe akwụkwọ nʻule ikpeazụ nke ha nwere ike tinye ihe ọ bụla ha chọrọ. Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ kwadoro site niime obere ihe ndetu nwere ozi sitere na nkuzi niile na akwụkwọ ọgụgụ niile, ndị a na-agụta naanị site nʻiji ugegbe na-ebuli elu. Mana nwa okoroọbịa ahụ bịarutere jiri mpe mpe akwụkwọ na-enweghị ihe ọ bụla edere ya na onye amaghị ama. Mgbe prọfesọ ahụ jụrụ ya ajụjụ, nwa okoroọbịa ahụ zara ya, “Ị sịrị na M nwere ike iweta otu mpempe akwụkwọ nwere ihe ọ bụla nʻelu ya.” Mgbe ahụ o tinyere mpempe akwụkwọ ahụ nʻala nʻakụkụ tebụl ya ma sị,“Ọ ga-amasị m ka onye nkuzi m guzoro nʻelu mpempe akwụkwọ m.”
Mmuọ Nsọ ahụ
Dị ka ndị otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, ndị agọziri site na onye nsuso nke onye otu nke Chukwu, anyị nwere ike nweta enyemaka nke Onye nkuzi zuru oke. Mmuọ Nsọ ahụ mazuru ihe niile, na-agba ama nke eziokwu, ma “ga-echetara [anyị] ihe niile.” Onyeisi Russell M. Nelson ekwuwo ugboro ugboro banyere mkpa ọ dị ịnụ olu nke Onyenwe anyị. Ọ kuziriwo anyị ka anyị ga-esi kpọkuo ntuziaka nke Mmụọ Nsọ ma rịọ anyị ugboro ugboro ka anyị mụbaa ikike ime mmụọ anyị iji nata mkpughe.
Taa ana m akpọ gị oku ka ị tulee ọrụ nke Mmụọ Nsọ, nke metụtara mmụta na nkuzi ozi ọma niime ebe obibi na niime nzukọ nsọ. A na-enye Mmụọ Nsọ site nʻekpere nke okwukwe na ka anyị na-agbalịsi ike ibi ndụ kwesịrị ekwesị nke onyinye a dị oke ọn̄ụ ahịa. Akwụkwọ ntuziaka nke Nzukọ nsọ Nkuzi nʻỤzọ nke Onye Nzọpụta na-akọwapụta ụkpụrụ agbakwunyere nke Onyenwe anyị hiwere nke na-enye aka na-akpọ mmetụta nke Mmụọ Nsọ ahụ.
Kpọkuo Mmụta Dị uchu
Otu niime ụkpụrụ ndị a bụ ị kpọkuo mmụta dị uchu. Nʻoge gara aga, anyị nwere ike iche maka nkuzi dịka ohere maka nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye nkuzi ịkpọ Mmụọ Nsọ niime nkwadebe ha ma mgbe ahụ wee kesaa ihe ha mụtara nʻetiti ụmụaka ma ọ bụ ndị otu klas, ndị ọrụ ha bụrịị ige ntị. Ma ọbụna ịdị ire karịa bụ mgbe anyị, dịka ndị mmụta, bịakwara na njikere na mgbe ndị nkuzi mepụtara ahụmihe niile mmụta nke na-akwalite mkpughe nke onwe kpọmkwem niime obi anyị na uche anyị. Mgbe ahụ, dịka enyere anyị ohere niile ịkọ ihe anyị na-amụta site na ọmụmụ ihe anyị na site na Mmụọ Nsọ, anyị na-enyere ibe anyị aka ka e wee kuziere anyị ihe ma kwalite mmụọ anyị. Dị ka anyị na-etinye ụkpụrụ niile ozi ọma nʻọrụ, Mmụọ ahụ ọzọ ga-agbaa aka ebe maka eziokwu ha.
Dị ka niime ihe niile, Jizọs Kraịst bụ ihe nlereanya zuru oke. Ọ kpọwo onye ọbụla niime anyị ka ọ bụrụ onye na-amụsi ọrụ ike ma na-ahụ maka ịgba aka ebe anyị niile. Ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ Ya ka ha jikere ịmụta ihe, ị kesaa ihe ha na-amụta, na iji okwukwe mee ihe. O kpere ekpere maka ha, hụ ikike dị nsọ ha, gee ha ntị, ma nyere ha aka ịmata na a hụrụ ha naanya ma dị mkpa.
Dịka ndị nkuzi, anyị nwere ike ilekwasịkwu anya nʻọganiihu onye mmụta karịa, nʻigbo mkpa ha niile, na nʻinyere ha aka izulite agwa niile nke ime mmụọ nke ịbụ ndị na-eso ụzọ ogologo ndụ ha niile. Dịka ndị mmụta, mgbe anyị na-eji ikike anyị eme ihe na usoro mmụta, anyị na-egosi Mmụọ Nsọ na anyị dị njikere ka Ya kuziere anyị ihe.
E nwere m ekele maka onye nkuzi nke kpọrọ m ka m bụrụ onye mmụta ka mma. Mgbe m malitere mahadum, e hiere m ụzọ na iche na ụlọ akwụkwọ bụ ihe m ga-atachi obi ga ka e wee kwee m ime egwuregwu niile. Otu ụbọchị, mgbe ọ gụchara akwụkwọ m deworo, prọfesọ m gwara m na ya chere na m bụ onye nwere nkaa iche echiche nyocha. Amaghị dị m ihe nke ahụ pụtara. O kwuru na site na ịgbasi mbo ike enwere m ike ịbụ ezigbo nwa akwụkwọ. Echiche ahụ abanyebeghị nʻuche m. Mmasị ya, agbamume, na ọkpụkpọ oku niile gbanwere usoro nke agụmakwụkwọ ma gọzie ndụ m nke ukwuu.
Kuzie Ozizi ahụ
Ụkpụrụ ọzo dị mkpa maka ịkpọ Mmụọ Nsọ bụ ikuzi ezi ozizi. Nke a pụtara na ọmụmụ ihe na ntuziaka ozi ọma anyị gbanyere mgbọrọgwụ nʻokwu nke Chineke ma na anyị adịghị atụgharị uche ma ọ bụ bulite ihe Onyenwe anyị na-ekpughebeghị. Kama, anyị na-elekwasị anya nʻụkpụrụ niile ozi ọma dị mkpa na dị ebighị ebi, nke na-enye Mmụọ Nsọ ohere ịgba akaebe maka eziokwu. Ọzọ, anyị na-agbaso ihe nlereanya nke Onye Nzọpụta ahụ. Ọ sịrị, “Ozizi M abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.”
Ezi ozizi ka a na-achọta niime akwụkwọ niile na nkuzi niile nke ndị amụma ọhụrụ. Ndụmọdụ nke Onyenwe anyị ka a mụọ akwụkwọ nsọ niile nʻotu nʻotu na dịka ezinaụlọ niile na ịga nzukọ nsọ kwa izuụka iji mụọ ozi ọma Ya na-enye usoro dị ịrịba ama iji mụta ozizi Ya na ịnụ olu Ya. Anyị na-enyocha akwụkwọ nsọ niile iji ghọta akụkọ, ụkpụrụ niile ha na-akuzi, na itinye eziokwu ndị a nʻọrụ niime ndụ anyị. Lee ngọzi ọ bụ inwe akwụkwọ nsọ nʻaka anyị. Chegodị echiche na Adam na Iv, Abinadaị, ma ọ bụ ọbụna Onye nkuzi Ukwu, Jizọs Kraịst, ka ọ na-eleta ebe obibi anyị niile ma ọ bụ klas anyị niile ikuziri anyị ihe. Ha nwere ike mgbe anyị na-eri oriri n’elu okwu nke Chineke. Site na mbọ nọgidere, anyị nwere ike ịmụta ịghọta na ịhụ akwụkwọ nsọ naanya ma tụkwasị obi na ha nwere azịza niile nye ajụjụ niile nke mkpụrụ obi.
O nwere oge tupu anyị alụọ di na nwunye mgbe nwunye m, Kristi, nọ na-agba mbọ inwe mmetụta ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na ịghọta atụmatụ Ya maka ya. Ka ọ na-ekpe ekpere maka nduzi, e nwere echiche bịara na ya kwesịrị ịga institute, ya mere ya debanye aha na klas nke Agba Ọhụrụ. Ụzọ onye nkuzi institute ya si kuzie ihe site nʻakwụkwọ nsọ niile, ọbụna ụzọ o si jide ha, gosiri na ọ hụrụ okwu Chineke naanya nke ukwuu. Ka ọ gara, Mmụọ Nsọ ahụ takanyere ya na o nwere ihe dị niime akwụkwọ nsọ niile ọ chọrọ. Ịhụnaanya nke onye nkuzi ya nwere maka akwụkwọ nsọ niile na mkpali niile nke Mmụọ Nsọ nyere ya ọchịchọ ibido ọmụmụ ihe siri ike nke okwu Chineke—nke ghọrọ njem ogologo ndụ nke ntụgharị miri emi na ije ozi e doro nsọ.
Lekwasị anya na Jizọs Kraịst
Nʻikpeazụ, dịka N’ụzọ nke Ọnyenwe anyị na-atụ aro, nkuzi na mmụta anyị kwesịrị ilekwasị anya na Jizọs Kraịst. Anyị nwere ike ikwu okwu ugboro ugboro na nkwanye ugwu karịa maka Ya ma chọọ ohere ndị ọzọ karịa iji kwupụta ịgba ama, obi ekele, na ịhụnaanya maka Ya. Nʻagbanyeghị ọnọdụ ahụ, dịka anyị na-echeta Ya, anyị nwere ike inwe “Mmụọ ya ịnọnyere [anyị].”
Otu ụzọ isi tinye Jizọs Kraịst nʻetiti nkuzi anyị bụ imesi ya ike na Ya bụ ihe nlere zuru oke, njupụta na ngosịpụta nke ụkpụrụ niile nke ozi ọma. Ọbụna mgbe na-akpọtụghị Ya aha kpọmkwem niihi ndekọ akwụkwọ nsọ, anyị ka nwekwara ike ịrụtụ aka na Ya dịka ihe nlereanya nke ụkpụrụ a na-akuzi. Anyị nwere ike ijụ sị, “ị nwere ike icheta oge Jizọs Kraịst ji ụkpụrụ a mee ihe ịma atụ?”
Anyị nwekwara ike ilekwasị anya na Ya site na nʻịmụta itu aha Ya niile, ọrụ niile, na agwa niile, na-achọ ịmụta ọ bụghị naanị ihe O meworo kama ịghọta onye Ọ bụ nke ọma. Nʻịma atụ, mgbe ị na-amụ ụkpụrụ nke nchegharị, ọ dị mkpa ị ghọta otu esi echegharị. Mana ọ dịkwa mkpa icheta ihe Jizọs Kraịst meworo iji mee ka nchegharị kwe omume na ịghọta ihe nchegharị na-akuziri anyị gbasara Ya, gbasara ezi ọdịdị Ya na njirimara Ya niile. Gịnị ka ohere anyị ichegharị na-ekwu banyere ịhụnaanya, ndidi, na ebere Ya, nkwenye Ya nʻikike anyị dị nsọ, ọchịchọ Ya ikpuchi mmehie anyị niile, na ọn̄ụ Ọ na-enweta nʻịgbaghara ? Ma ịghọta itu aha Ya niile—dị ka Nwa atụrụ nke Chineke, Onye Mgbapụta, na Dọkịnta—na-enyere anyị aka ịhụ na nchegharị bụ ọkpụkpọ oku Ya ime ka anyị dị ọcha, gbanwee, ma gwọọ anyị. Ilekwasị anya nʻihe O meere anyị na ihe ọ na-ekwu gbasara onye Ọ bụ nwere ike inyere anyị aka inwe “okwukwe na nchegharị.”
Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ghara ịhụ ngwa ngwa njirimara niile nke Onye Nzọpụta niime otu ndekọ akwụkwọ nsọ. Nʻịma atụ, mgbe anyị na-agụ gbasara Nefi na-arụ ụgbọ mmiri, anyị nwere ike ilekwasị anya naanị na Nefi Mana ilekwasị anya nʻebe Onye Nzọpụta nọ nwere ike inyere anyị aka ịhụ na e debereghị ihe ndekọihe nke a iji kuziere anyị gbasara ịdị ukwuu nke Nefi kama iji gosi anyị ịdị ukwuu nke Chineke— na Ọ na-enye anyị ume idebe iwu nsọ Ya niile ma napụta anyị nʻoge mkpa.
Anyị nwekwara ike lekwasị anya na isi ọrụ nke Jizọs Kraịst na-arụ niime atụmatụ nke an̄ụrị nke Chineke. O nwere ike ịgbanwe usoro ndụ anyị ịhụ ọnọdụ anyị niile site na oghere nke atụmatụ nke ebighị ebi nke Chineke kama ịhụ atụmatụ ahụ site na oghere nke ọnọdụ niile anụ ahụ anyị. Ozi ọma ahụ abụghị ndepụta nke ihe a chọrọ; ọ bụ ozi ọma na Jizọs Kraịst meriri mmehie na ọnwụ. Ọ bụ site na inweta amara Ya dị ịtụnaanya site nʻidebe ọgbụgba ndụ niile anyị na Chineke ka anyị ga-enwe ike ibi ndụ nʻọn̄ụ ugbu a ma kwadoo maka ndụ anyị na Nna anyị bi Nʻeluigwe niime mgbe ebighị ebi. Ka anyị na-amụta ịhụ Nna nke Eluigwe na Onye Nzọpụta niime akwụkwọ nsọ niile, anyị ga-abịa mara Ha nke ọma ma anyị ga-ahụ ịhụnaanya na mmetụta Ha karịa ugboro ugboro na ike karịa na ndụ anyị niile.
Aga m echeta mgbe ọbụla Mmụọ ahụ m nwere mgbe m bụ onye ntoroọbịa mgbe onye nkuzi anyị kuziri gbasara ụbọchị ikpeazụ nke ndụ nke Onye Nzọpụta. O nyere anyị aka ịhụ ihe ndị mere niime ọnụ ụlọ dị elu, Getsemani, Golgotha, na ili tọgbọ chakoo pụtara. O keere oke ekele ya maka Onye Nzọpụta na oke ọchịchọ ya isoro Ya. Nkuzi ya bụ otu ọkpụkpọ oku maka Mmụọ Nsọ ịgba ama maka Jizọs Kraịst. Ma Mmụọ ahụ m nwere niime klas ahụ mere ka okwukwe m sikwuo ike ma mụbaa ịhụnaanya na ekele m nwere maka Onye Nzọpụta ahụ. Mmetụta ahụ nke onye nkuzi ahụ anọgidewo na-adị na ndụ m niile. Dị ka e kwuru banyere onye nkuzi ọzọ, “Anyị nwere ike iji ọkụ nke okwukwe ya kpọọ aka anyị.”
Nchịkọta
Niime ebe obibi anyị niile na nzukọ niile nke Nzukọ nsọ, ka anyị na-elekwasị anya na Jizọs Kraịst, kuzie ozizi Ya, na ịmụta nʻịdị uchu, anyị na-akpọ Mmụọ Nsọ ka o mee ka okwukwe anyị na Jizọs Kraịst sikwuo ike ma nyere anyị aka ime ka anyị yie Ya, nke bụ ebumnobi nke nkuzi na mmụta nke ozi ọma.
E nwere m ekele maka ndị nkuzi niile niime ndụ m, site na ezigbo ndị nne na nna na ndị ndu obodo na ndị nkuzi ruo na ndị nwoke na ndị nwanyị ndị a kpọrọ ka ha kuzie ma gbaa ama site nʻelu ikpo okwu a, ndị na-enyere anyị aka ịmata na isoro Jizọs Kraịst. Ma e nwere m ekele maka Mmụọ Nsọ, Onye nkuzi zuru oke. Ọ bụ site na Mmụọ Nsọ ka m matara na Nna nke Eluigwe hụrụ anyị naanya ma nwee otu atụmatụ zuru oke maka anyị, na Jizọs bụ Kraịst ahụ, Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa, ma na eweghachiwo ozi ọma na Nzukọ nsọ Ya. E ji m ekele na-agba ama ihe ndị a n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.