Ọgbakọ Zuru ọha
Nụrụ olu Ya!”
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Nụrụ olu Ya!”

Nna anyị maara na mgbe edoghi-anya na ụjọ gbara anyị gburugburu, ihe ga-enyere anyị aka kachasịa bụ ịnụrụ olu Ọkpara Ya.

Ezi ụmụnne m ndi Nwoke na ndi Nwanyị, ọ bụụrụ m ịhe ịnye ekele na site n’igwe teknụzụ, anyị nwere ike izukọta ma fee ofufe n’ụtụtụ Sọnde nkea. Ọ bụrụ anyị ngọzi ị mara na oziọma nke Jizọs Kraịst ka eweghachitere n’elu ụwa!

N’ime ọtụtụ izu ụka gara aga, ọtụtụ n’ime anyị ahụtawo ọgba aghara n’ime ndụ nke onwe anyị. Ala ọma jijiji, ọkụ, ide mmiri, oria mkpochapu, na ihe ndị sotere ya agbasasiwo usoro ihe niile ma mee nrị, staple niile, na ichekwa ego ebelata.

N’etiti ihe ndịa niile, anyị n’eto unu ma n’ekele unu maka ịhọrọ ịnụrụ okwu nke Onyenwe anyị n’oge ọgba aghara nkea site n’isoro anyị n’ọgbakọ zuru-ọha Ọchịchịrị ahụ n’amụbawanye nke n’eso mkpagbu na-eme ihé nke Jizọs Kraịst amukee karịa. Nanị chee banyere ihe ọma onye ọbụla n’ime anyị nwere ike ime n’oge nke-a ọgba aghara zuru ụwa. Ịhụnanya gị na okwukwe gị n’ime Onye Nzọpụta nwere ike n’ezie bụrụ ihe ga-eme ka otu onye mata Mweghachi nke ojuju nke oziọma nke Jizọs Kraịst.

N’afọ abụọ gara aga, Nwanne nwanyị Nelson na mụ zutere puku kuru puku unu gburugburu ụwa. Anyị na unu ezutewo n’ebe mgbakọ ezi ma n’ime ballroom hotel. N’ebe mgbakọ ọbụla, ọ dị m ka m nọ n’ihu ndị ahọrọ ahọ nke Onyenwe anyị ma na m naara ahụta mkpokọta nke Izrel na-eme n’ihu m.

Anyị bi n’ụbọchị nke “ndị nna anyị tụworo anya n’oke ọchịchọ.”1 Anyị nwere oche ihu iji gbaa aka ebe n’onwe ihe onye amụma Nifaị hụrụ nanị n’ọhụ, na ike nke Nwa Atụrụ nke Chineke” ga agbadata “n’isi ndị gbara ọgbụgba ndụ nke Onyenwe anyị, ndị ekposasịrị n’elu ihu nke ụwa niile; ma ha jiri ezi omume chekwa onwe ha ma jiri ike nke Chineke n’ebube dị ukwuu.”2

Unu, ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, so n’etiti ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị ndị ahụ ndị Nifaị hụrụ. Chee maka nke ahụ!

N’agbanyeghị ebe i bi ma ọbụ ihe ọnọdụ gị bụ, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta gị, ma onye amụma nke Chineke Josef Smit bụ onye amụma gị . Ebu-ụzọ chie ya echichi tutu ntọala nke ụwa a ịbụ onye amụma ọgbọ nke ikpeazụ a, mgbe “n’enweghị ihe aga egbochi”3 n’ihu Ndị Nsọ. Mkpughe n’aga n’ihu n’abịa site n’aka Onyenwe anyị n’oge usoro nkea n’aganihu nke mweghachi.

Gịnị ka ọ bụụrụ gị na eweghachiwo oziọma nke Jizọs Kraịst n’elu ụwa?

Ọ pụtara na gị na ezi na ụlọ gị ka enwere ike ịrachikọta ruo mgbe niile! Ọ pụtara na n’ihi na i mewo baptizm site n’aka otu onye nwere ikike sitere na Jizọs Kraịst ma emewo ya onye otú nke Nzukọ nsọ Ya, i nwere ike rite nnọkọ nke Mmụọ Nsọ na anọgide. Ọ ga-edu gị ma chekwa gị. Ọ pụtara na agaghị ahapụ gị enweghị nkasị obi ma ọlị ma ọbụ enweghị ụzọ inwete ike nke Chineke iji nyere gị aka. Ọ pụtara na ike ọkwa nchụaja nwere ike gọzie gị dịka unu na anata emume nsọ ndị dị mkpa ma mee ọgbụgba ndụ gị na Chineke ma debe ha. Ụdị ebe ndabere nye mkpụrụ-obi anyị ka eziokwu ndịa niile bụ, kacha nke n’oge ndịa mgbe ebili mmiri na-agbali.

Akwụkwọ nke Mọmọn na-akọ akụkọ ntolite na ọdịda nke mba abụọ mepere anya. Agụgụala ha n’egosi otu osi dịrị mfe ọtụtụ ndị mmadụ ichefu Chineke, ju ịdọ aka na ntị niile nke ndị amụma nke Onyenwe anyị, ma na-achọ ike, iwu ewu na ihe ụtọ niile nke anụ ahụ.4 Ugboro ugboro, ndị amụma mgbe gara aga amawo ọkwa “nnukwu na ihe ndị dị ịtụnanya nye ndị ahụ, ndị nke ha na-ekwereghị.”5

Ọ dịghị iche n’ụbọchị nke anyị a. N’afọ niile ahụ, ihe ukwuu na ihe ịtụnanya ka anụworo site na pulpit edoro nsọ gburugburu ụwa. N’agbanyeghị ọtụtụ ndị mmadụ anaghị anabata eziokwu ndịa niile—onwere ike bụrụ na ha amaghị ebe ha ga-achọ ha6 ma ọbụ n’ihi na ha n’ege ntị nye ndị ahụ ndị n’enweghị eziokwu niile ma ọbụ n’ihi na ha anabataghị eziokwu n’ihi ọchịchọ nke anụ ahụ.

Onye iro ahụ nwere akọ. Kemgbe milenia ka ọ nọọrọ eme ihe ọma eyie njọ ma njọ eyie ihe ọma.7 Ozi ya niile n’ada oke ụda, dị obi ike, ma n’etu ọnụ.

Otuosiladị, ozi ndị sitere na Nna nke eluigwe dị iche nke ukwuu. Ọ n’eji okwu mfe, dị nwayọ, na n’ụdị ikwe nghọta pụrụ iche ekwu okwu na anyị agaghị aghọtaghe Ya.8

N’ịmaatụ, mgbe ọbụla Ọ mere ka amata Ọkpara Ya Amụrụ Nanị nye ndị mmadụ n’elu ụwa, O jiriwo mkpụrụ okwu ole ma ole mee otu ahụ. N’elu ugwu nke Mnwogharị nye Pita, Jemis, na Jọn, Chineke kwuru, “Nkea bụ Ọkpara m: nụrụ olu Ya.”9 Okwu Ya nye ndị Nifaị na Bountiful ochie bụụrụ “Lee Ọkpara m hụrụ n’anya, onye m nwere ezigbo mmasị na ya, onye m nyeworo aha m otuto n’ime ya nụrụ nụ olu ya.”10 Ma nye Josef Smit, n’ọkwa ahụ dị ịtụnanya nke mepere ọgbọ nkea, Chineke kwuru nanị, “Nkea bụ Ọkpara M Hụrụ n’anya. Nụrụ olu Ya!11

Ugbua, ezi ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, tulee eziokwu ahụ na n’ime ọnọdụ atọ ndịa ekwupụtara, tupu nnọọ Nna eme ka amata Ọkpara ahụ, ndị mmadụ ekwuru maka ha nọọrọ n’ọnọdụ ụjọ na, ruo n’ókè ụfọdụ, enweghị olileanya.

Ndị Ozi naara atụ egwu mgbe ha hụrụ Jizọs Kraịst ka urukpuru gbara ya gburugburu n’Ugwu nke Mnwogharị.

Ndị Nifaị naara atụ egwu n’ihi na ha ahụtawo mbibi na ọchịchịrị n’ọtụtụ ụbọchị.

Josef Smit nọọrọ na njigide nke ike nke ọchịchịrị nwa obere oge tupu eluigwe emepee.

Nna anyị maara na mgbe ịhe edoghi-anya na ụjọ gbara anyị gburugburu, ihe ga-enyere anyị aka kachasịa bụ ịnụrụ olu Ọkpara Ya.

N’ihi na mgbe anyị na-achọ ịnụ—nụrụ n’ezie—Ọkpara Ya, aga edu anyị ịmata ihe a ga-eme n’ọnọdụ ọbụla.

Okwu nke mbụ n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile bụ nụrụ.12 Ọ pụtara “iji ebumnuche nrube isi ege ntị.”13 Ị nụrụ pụtara ị “nụrụ olu Ya”—ị nụrụ ihe Onye Nzọpụta kwuru ma mgbe ahụ i rube isi nye ndụmọdụ Ya. N’ime okwu abụọ ndị ahụ—“Nụrụ olu Ya”—Chineke n’enye anyị usoro nke oganihu, ańụrị, na ọńụ n’ime ndụ a. Anyị kwesịrị ị nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị, nụrụ ha, ma rube isi n’ihe Ọ gwaworo anyị!

Dịka anyị na-achọ ịbụ ndị n’eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, mgbalị anyị niile ị ị nụrụ olu Ya kwesịrị inwe ebumnuche karịa. Ọ bụ site na mbọ nile akpachapụrụ anya mee mgbe nile ka eji ejiri okwu Ya niile, nkuzi Ya niile, na eziokwu Ya niile emejupụta ndụ anyị ụbọchi nile nke anyị.

Anyị agaghị nnọọ a tụkwasị obi n’ozi anyị hụtara na soshịal midia. N’okwu ijeri kwuru ijeri nọ n’ikuku na n’ime ụwa azụm ahịa juru ọnụ nke mbọ ọjọọ nke onye iro jiworo mkpọtụ banye mgbe niile, ebee ka anyị nwere ike ị nụrụ olu Ya?

Anyị nwere ike gaa na akwụkwọ nsọ. Ha na-akuzi banyere Jizọs Kraịst na oziọma Ya, ịdị ukwuu nke Aja mgbaghara mmehie Ya, na nnukwu atụmatụ nke ańụrị na mgbapụta nke Nna anyị. Imikpu onwe anyị kwa ụbọchị n’okwu nke Chineke dị oke mkpa maka ịdị ndụ ime mmụọ, kacha nke n’ime ụbọchi ndịa na-amụba n’ọgba aghara. Dịka anyị n’amụsike n’okwu nke Kraịst kwa ụbọchị, okwu niile nke Kraịst ga-agwa anyị otu esi ezute ihe isi ike niile anyị atụghị anya na anyị ga-emeli.

Anyị nwekwara ike nụrụ olu Ya n’ime tempụl. Ụlọ ahụ nke Onyenwe anyị bụ ụlọ nke mmụta. N’ebe ahụ Onyenwe anyị na-akuzi n’ụzọ nke onwe Ya. N’ebe ahụ emume nsọ ọbụla na-akuzi banyere Onye Nzọpụta. N’ebe ahụ anyị na-amụ otu esi emepe akwa mgbochi ma kwusara eluigwe okwu n’ụzọ kwere nghọta. N’ebe ahụ anyị na-amụ otu esi abara onye iro mba ma webata ike ọkwa nchụaja nke Onyenwe anyị ịgba anyị na ndị anyị hụrụ n’anya ume. Ọ kwesịrị ịnụ onye ọbụla nime anyị ọkụ n’obi ịchọ mgbaba n’ebe ahụ.

Mgbe ewepụrụ mmachi nwa oge Covid 19 ndịa, biko hazie oge mgbe niile maka ofufe na ije ozi n’ime tempụl. Nkeji niile nke oge ahụ ga-agọzi gị na ezi na ụlọ gị n’ọtụtụ ụzọ nke ịhe ndị ọzọ enweghị ike ị mee. Jiri oge tulee ihe ndị ị na-anụ ma na n’emetụta gị mgbe ị nọ ebe ahụ. Rịọ Onyenwe anyị ikuziri gị otu esi emepe eluigwe ịgọzi ndụ gị na ndụ ndị ị hụrụ n’anya ma ndị ị n’ejere ha ozi.

Ebe ife ofufe n’ime tempụl adịghị ire ugbua, a na m akpọku unu ịmụba nsonye gị na agụgụala ezi na ụlọ, tinyekọta nnyocha agụgụala ezi na ụlọ na indexing. A na m ekwe unu nkwa na oge gị n’ime tempụl na n’ọrụ agụgụala ezi na ụlọ, unu ga-amụba ma melite ike unu ị nụrụ olu Ya.

Anyị nakwa a nụrụ olu Ya n’ụzọ kwere nghọta karịa dịka anyị na-emezi ike anyị ịmata ntaka nke Mmụọ Nsọ. O nwebeghị mgbe ọ ka mma imatarịrị otu Mmụọ ahụ si ekwuru gị karịa ugbua. N’ime Chukwu, Mmụọ Nsọ ahụ bụ onyeozi. Ọ ga-etinye echiche n’ime mmụọ gị nke Nna na Ọkpara chọrọ ka gị nata. Ọ bụ Onye Nkasi obi. Ọ ga-ewete mmetụta nke udo n’ime obi gị. Ọ na-agba ama eziokwu ma ga egosi ihe ndị bụ eziokwu dịka unu na a nụrụ ma n’agụ okwu nke Onyenwe anyị

A na m ekwugharị arịrịọ m ka unu mee ihe ọbụla kwere iji mụbaa ike ime mmụọ gị ịnata mkpughe nke onwe.

Ime otu ahụ ga-enyere gị aka mata otu esi aganihu na ndụ gị, ihe ị ga-eme n’oge ọgba aghara, na otu esi amata ma zere ọnwụnwa niile na aghụghọ niile nke onye iro.

Ma, n’ikpeazụ, anyị na anụrụ olu Ya mgbe anyị n’erube isi n’okwu niile nke ndị amụma, ndị ọhụụ ụzọ, na ndị mkpughe. Ndị Ozi Echiri echi nke Jizọs Kraịst na-agba ama maka Ya mgbe niile. Ha n’egosi ụzọ dịka anyị na-achọta ụzọ anyị n’ime nsogbu na ọgba aghara nke nhụmihe nke ndụ anụ ahụ.

Gịnị ga-eme dịka ị na a eji ebumnuche ege ntị, nụrụ, ma rube isi n’ihe Onye Nzọpụta kwuworo na ihe Ọ na-ekwu ugbua site n’aka ndị amụma Ya? A na m ekwe nkwa na aga eji ike agbakwunyere agọzi gị iji megide ọnwụnwa, ndọlị niile, na adịghị ike. A na m ekwe nkwa ọrụ ebube n’ime alụm di na nwunye unu, mmekọrịta ezi na ụlọ niile, na ọrụ nke ụbọchị ọbụla. Ma a na m ekwe nkwa na ike gị ịhụta ọńụ ga-amụba ọbụna m’ọbụrụ na ọgba aghara na-abawanye n’ime ndụ gị.

N’ọgbakọ zuru-ọha Eprel 2020 nkea bụ oge anyị icheta ihe mere eme nke gbanwere ụwa. Dịka anyị n’atụanya emume ncheta ugboro 200 nke Ọhụ nke Mbụ nke Josef Smit, Otu Ndịisi Mbụ na Kansụl nke Ndị Ozi Iri na Abụọ naara eche ihe anyị nwere ike ime icheta n’ụzọ ziri ezi otu mmemme a.

Ngosipụta Chukwu ahụ bidoro Mweghachi nke uju nke oziọma nke Jizọs Kraịst ma kpọbata ọgbọ ozuzu oge akara aka.

Anyị na-eche ma aga akpụ ihe ọkpụkpụ ebe ahụ. Mana dị ka anyị tulere akụkọ pụrụ iche na mmetụta ozuru ụwa nke Ọhụ nke Mbụ ahụ, ọ metụrụ anyị imepụta ihe ọkpụkpụ n’abụghị nke granaịt ma ọbụ okwute kama nke mkpụrụokwu—mkpụrụokwu nke ịma ọkwa dị mkpa ma dịrị nsọ—edere, nke agaghị akanye n’elu “mbadamba nkume” kama nke aga edenye n’ime “mbadamba uru” nke obi anyị.14

Kemgbe ahaziri Nzukọ nsọ a, nanị ịma ọkwa ise ka enyewororịị, nke ikpeazụ abụrụ “Ezi na ụlọ Ahụ: Ịma Ọkwa nye Ụwa,” nke Onyeisi Gordon B. Hinckley tụpụtara n’afọ 1995

Ugbua dịka anyị na-atụgharị uche n’oge nkea dị mkpa n’agụgụala nke ụwa na iwu nke Onyenwe anyị ịkpokọta Izrel gbasasịrị na nkwado maka Ọbịbịa nke Abụọ nke Jizọs Kraịst, anyị, Otu Ndịisi nke Mbụ na Kansụl Ndị Ozi Iri na Abụọ, na-enye ịma ọkwa a sotere. Isiokwu ya bụ “Mweghachi nke Uju nke Oziọma nke Jizọs Kraịst: Ịma Ọkwa Narị Afọ Abụọ nye Ụwa.” Otu Ndịisi Mbụ na Kansụl Ndị Ozi Iri-na-abụọ nke Nzụkọ-nsọ nke Jizọs Kraist nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazu a dere ya. Ụbọchị edere ya bụ Eprel 2020. Ịkwado maka taa, e rekọọdụrụ m ịma ọkwa nkea n’ime Ọdọ osisi Dị nsọ oge gara aga, ebe Josef Smit hụrụ na mbụ Nna na Ọkpara ahụ.

“N’obi nwayọ anyị na-ama ọkwa na Chineke hụrụ ụmụ Ya n’anya n’ime mba niile nke ụwa. Chineke Nna enyewo anyị ọmụmụ dị nsọ, ndụ na-enweghị atụ, na aja mgbaghara mmehie n’enweghị oké nke Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, Jizọs Kraịst. Site n’ike nke Nna, Jizọs bilitere ọzọ ma nwee mmeri megide ọnwụ. Ọ bụ Onye Nzọpụta anyị, Onye Ọmụmatụ anyị, na Onye Mgbapụta anyị.

“Afọ narị abụọ gara aga, n’ọmarịcha ụtụtụ mmalite udu mmiri n’afọ 1820, Josef Smit nta, na-achọ ịmata nzukọ nsọ nke ọ ga-esonye, banyere n’ime ọdọ osisi ikpe ekpere n’akụkụ ebe obibi ya n’obodo New York, USA. O nwere ajụjụ ndị gbasara nzọpụta nke mkpụrụobi ya na nwee ntụkwasị obi na Chineke ga-edu ya.

“N’ịdị umeala, anyị na ama ọkwa na n’azịza nye ekpere ya, Chineke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, pụtakwutere Josef ma bido ‘nkwụghachi nke ihe niile’ (Ọlụ 3:21) dịka ekwuru na mbụ n’ime Baịbụl. N’ime ọhụ nkea, ọ mụtara na mgbe Ndị Ozi isimbụ ahụ nwụworo, Nzukọ nsọ Agba Ọhụụ nke Kraịst furu efu site n’ụwa. Josef ga-abụ ngwa ọrụ na nlaghachi ya.

“Anyị n’ekwenye na n’okpuru ntụzi aka nke Nna na Ọkpara, ndị ozi si n’eluigwe bịara ikuziri Josef ma rụpụtagharịa Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Jọn O Me Baptizm bilitere n’ọnwụ weghachitere ikike nke ime-baptism site na-imikpu n’ime mmiri maka nsachapụ nke mmehie niile. Ndị Ozi atọ n’ime ndịozi isimbụ—Pita, Jemis, na Jọn—weghachitere ịbụ onyeozi na ọtụghe niile nke ikike ọkwa nchụaja. Ndị ọzọ bịakwara n’ezie, tinyekọta Eliaja, onye weghachitere ikike nke ijikọ ezi na ụlọ ruo mgbe niile n’ime mmekọrịta ebighi ebi nke gafere ọnwụ.

Anyị n’aga n’ihu ịgba akaebe na enyere Josef Smit onyinye na ike nke Chineke ịtụgharị asụsụ ihe mere mgbe gboo:Akwụkwọ nke Mọmọn—Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst. Peeji ederede a dị nsọ tinyekọtara akụkọ nke mgbasa ozi nke onwe nke Jizọs Kraịst n’etiti ndị mmadụ n’ime Western Hemisphere ngwa ngwa Mbilite n’ọnwụ Ya gafere. Ọ na-akuzi maka ebumnuche nke ndụ ma na-akọwa ozizi nke Kraịst, nke bụ isi ebumnuche ahụ. Dịka akwụkwọ nsọ nsiso nye Baịbụlụ, Akwụkwọ nke Mọmọn n’agba ama na mmadụ niile bụ ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwanyị nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnanya, na O nwere atụmatụ dị nsọ maka ndụ anyị, ma na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, n’ekwu okwu taa dịkwa ka otu ọ dị n’ụbọchi niile nke mgbe ochie.

“Anyị na-ama ọkwa na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi ikpeazụ a, ahaziri na Eprel 6, 1830, bụ Nzukọ nsọ Agba Ọhụrụ nke Kraịst eweghachitere. Nzukọ nsọ a dabeere na ndụ zuru oke nke isi nkume-njikọ ya, Jizọs Kraịst, na Aja mgbaghara mmehie Ya n’enweghị oké na Mbilite n’ọnwụ Ya mere eme. Jizọs Kraịst ọzọkwa akpọwo Ndị Ozi ma nyewo ha ikike nke ọkwa nchụaja. Ọ na-akpọku anyị niile ịbịakwute Ya na Nzukọ nsọ Ya, ịnata Mmụọ Nsọ, emume nsọ nke nzọpụta, na irite ọńụ na anọgide.

“Afọ narị abụọ agafewo ugbua kemgbe Mweghachi nkea bidoro site n’aka Chineke Nna na Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya, Jizọs Kraịst. Nde kwuru nde gburugburu ụwa anabatawo amamihe maka ihe ndịa eburu n’amụma.

“Anyị n’obi ụtọ na-ama ọkwa na Mweghachi ekwere nkwa na-aganihu site na mkpughe na-aganihu. Ụwa agaghị ma ọlị abụrụ otu ọ dị ọzọ, dịka Chineke ga ‘akpọkọta ọnụ n’otu ihe niile n’ime Kraịst’ (Ndị Efesọs 1:10).

“Na nsọpụrụ na obi ekele, anyị dịka Ndị Ozi Ya n’akpọku onye niile ịmata—dịka anyị ma—na eluigwe ghe oghe. Anyị kwenyere na Chineke n’eme ka amata uche Ya maka ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị. Anyị na-agba ama na ndị ahụ jupụtara n’ekpere ịmụ ozi nke Mweghachi ma mee ihe n’okwukwe ka aga agọzi irite akaebe nke onwe ha maka ịdị nsọ ya na nzube ya iji kwado ụwa maka Ọbịbịa nke Abụọ ekwere nkwa nke Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst.”15

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị m hụrụ n’anya, nke ahụ bụ ịma ọkwa narị afọ abụọ nye ụwa banyere Mweghachi nke oziọma nke Jizọs Kraịst n’uju ya. Atụgharịwo ya n’asụsụ ruru asụsụ 12. Asụsụ ndị ọzọ ga-esote n’oge n’adịghị anya. A ga-eme ya adịrị na website Nzukọ nsọ n’egbughị oge, site n’ebe i nwere ike nwete otu cọpị. Mụọ ya n’onwe gị na gị na ndị otu ezi na ụlọ gị na ndị enyi gị. Tụgharịa uche n’eziokwu ndị ahụ ma chee maka mmetụta eziokwu ndị ahụ ga-enwe na ndụ gị ma ọ bụrụ na ị ga-anụrụ olu ha, nụrụ ha, ma rube isi na iwu nsọ niile na ọgbụgba ndụ niile so ha.

A maara m na Josef Smit bụ onye amụma ebu-ụzọ chie-echichi onye Onyenwe anyị họworo imepe ọgbọ nke ikpeazụ a. Site na ya Nzukọ nsọ nke Onyenwe anyị ka eweghachiworo n’elu ụwa. Josef jiri ọbara ya rachie ọgbụgba ama ya. Ụdị ịhụnanya na nnukwu ugwu m nwere n’ebe ọ nọ!

Chineke dị ndụ! Jizọs bụ Kraịst ahụ! Eweghachiwo Nzukọ nsọ Ya! Ya na Nna Ya, Nna anyị nke Eluigwe, n’elekọta anyị. A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.