Ọgbakọ Zuru ọha
Ijikọta ọnụ n’Imezu Ọrụ nke Chineke
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Ijikọta ọnụ n’Imezu Ọrụ nke Chineke

Ụzọ kacha dị ire eji emejupụta ike anyị si na chi bụ ịrụkọta ọrụ ọnụ, agọziri site n’ike na ikike nke ọkwa nchụaja.

Ezi ụmụnne nwanyị na ụmụnne nwoke pụrụ iche, ọ bụ ihe obi ụtọ ịnọnyere unu. Ebe ọbụla unu nọ n’ege ntị, a na m esitipụ mmaku nye ụmụnne m nwanyị na ịna-aka ekele si m n’obi nye ụmụnne m nwoke. Anyị dị n’otu nọ n’ọrụ nke Chineke.

Mgbe anyị na-eche maka Adam na Iv, mgbe ụfọdụ ihe mbụ na-agba anyị na-echiche bụ maka ọmarịcha ndụ ha biri n’ime Ubi Iden. E chere m na ihu eluigwe na-adị mma mgbe niile—n’adịghị oke ọkụ ma n’ajụghị oke oyi—ma na mkpụrụosisi na-atọ ụtọ na akwụkwọ nri bara ụba, toro ebe aka ga-erute ka ha wee nwee ike rie ihe mgbe ọbụla ha chọrọ. Ebe nke a bụụrụ ha ụwa ọhụrụ, e nwere ọtụtụ ihe a ga- chọpụta, ya mere ụbọchị niile bụụrụ ụbọchị ọma dị ka ha na ndụ ụmụ anụmanụ na-akparịta ma ha a na-eleta ọmarịcha gburugburu ebe ha. E nyekwara ha iwu nsọ irube isi na ya ma ha nwere ụzọ dị iche iche ha ga-esi eso ntụzi aka ahụ, nke kpatara nchekasị na mgbagwoju anya na mbụ.1 Mana dị ka ha mere mkpebi nke gbanwere ndụ ha ruo ebighe ebi, ha mụtara ịrụkọta ọrụ ọnụ ma jikọtazie ọnụ na-imezu ebumnuche ndị Chineke mere maka ha—na maka ụmụ Ya niile.

Ugbua chee maka di na nwunye nke a na ndụ anụ ahụ. Ha rụrụ ọrụ ịkpata nri ha, ụfọdụ anụmanụ hụrụ ha dịka nri, ma enwekwara aka mgba ndị siri ike nke e nwere ike imeri nanị mgbe ha tikọtara isi ma kpekọta ekpere ọnụ. E chere m na-aga enwe nwa oge ole ma ole echiche ha gbara iche iche banyere otu ha ga-esi ezute mkpa ndị ahụ. Kaosiladị, site na Ọdịda ahụ, ha mụtara na ọ dị mkpa ime ihe n’ịdị n’otu na n’ịhụnanya. N’ime nkuzi ndị ha natara site na igwe, a kuziiri ha atụmatụ nke nzọpụta na ụkpụrụ niile nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst nke mere atụmatụ ahụ ekwe omume. N’ihi na ha ghọtara na nzube nke ndụ ha n’elu ụwa nke a na ebumnuche nke ebighị ebi ha yiri otu, ha nwetere afọ ojuju na mmeri na-ịmụta ịrụkọta ọrụ ọnụ n’ịhụnanya na n’ezi omume.

Foto, oyiyi
Adam na Iv na-akuziri ụmụ ha

Dị ka ha mụrụ ụmụ, Adam na Iv kuziiri ezi na ụlọ ha ihe ha mụtaworo site naka ndị ozi nke eluigwe. Ha tinyere obi na-inyere ụmụ ha aka ghọtakwa ma nabata ụkpụrụ ndị ahụ nke ga-eme ha obi ụtọ n’ime ndụ a, nakwa ikwado ịlakwuru nne na nna ha nke eluigwe mgbe ha mụbaworo ike ha ma gosipụta nrube isi ha nye Chineke. Site n’usoro ahụ, Adam na Iv mụtara ịnabata ume ha dị iche iche ma kwadoo otu onye na ibe ya n’ọrụ ebighị ebi ha pụrụ iche.2

Ka senchuris na milenum bịara gasịa, ndabere ntikọrịta uche si na mkpalite nke mmụọ nke ndị ikom na ndị inyom pụtara ihe bịara jupụta na okwu asị na nghọtahie. N’oge dị n’etiti mmalite ahụ dị ịtụnanya n’ime Ubi Iden na ugbua, onye iro enwetewo mmeri na ebumnuche ya ikewa ndị ikom na ndị inyom site na mgbalị ya imeri mmụọ anyị. Lucifa amarala na ọ bụrụ na ya nwere ike mebie ịdị n’otu ndị ikom na ndị inyom n’enwe, ọ bụrụ na o nwere ike megharịa anyị anya n’ihe banyere uru anyị bara si na chi na ọrụ ịgba ndụ niile, ọ ga-enwe ike nwetezuo ebumnuuche ya na-imebi ezi na ụlọ niile, ndị bụ akụkụ dị oke mkpa nke ebigh ebi.

Setan na-akpasu ntụnyere dị ka ngwa ọrụ ikewapụta mmetụta nke kacha ma ọ bụ ịdị ala, n’ezokpu eziokwu dị ebighị ebi na ịdị iche iche e buru pụta ụwa nke ndị ikom na ndị inyom bụ nke Chineke nyere ma ha hara ọnụ. Ọ nwaala iweda ala ntụpụta uche nke ndị inyom nyere ma ezi na ụlọ ma n’ime obodo, ma si otu ahụ na-ebelata ike ha nwere maka ị kwalite ihe ọma. Ebumnuche ya abụrụworịị itinye mgba maka ike karịa ịńụrị ọńụ maka ntụnye pụrụ iche nke ndị ikom na ndị inyom nke n’emeju ibe ya ma nye aka maka ịdị n’otu.

Ya mere, n’ime afọ niile na gburugburu ụwa, nghọta zuru oke nke ngwakọta si na chi ma ọbụna ntụnye dị iche iche na ọrụ niile nke ndị inyom na ndị ikom furu nke ukwuu. ndị inyom n’ime ọtụtụ otu bụrụziri ndị nọ n’okpuru ndị ikom kama ịnọ n’akụkụ n’akụkụ, ebelata ihe ndị ha na-eme ka ọ dị nkénké. Uto ime mụọ gbadara nke ukwuu n’oge ndị ahụ siri ike; n’ezie, nwa obere ihe nke ime mmụọ bụ ihe nọ nime uche ndị mmadụ ma obi niile rịbara n’ime omenanla nke inwe ike.

Ma mgbe ahụ ihe nke ozi ọma eweghachitere pụtara “n’elu nchapụta nke anyanwụ”3 mgbe Chineke nke Nna na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, pụtakwutere nwata nwoke ahụ Josef Smit na mbido udu mmiri nke 1820 n’ime ebe igwe osisi ahụ dị ebube n’ime New York. Ihe ahụ mere bidoro nnupụta nke mkpughe sitere n’eluigwe. Otu n’ime mmewere mbụ nke Nzukọ nsọ nsinambụ nke Kraịst eweghachitere bụụrụ ikike nke ọkwa nchụaja nke Chineke. Dị ka Mweghachite ahụ garaniihu ikpughe, ndị ikom na ndị inyom bidoro ịmata ọzọ ị dị mkpa na ike nke ịrụ ọrụ dị ka ndị na-emekọ ihe, enyere ikikere ma duzie n’ọrụ dị nsọ nke a site na Ya.

Foto, oyiyi
Nhazi nke Otu Enyem aka

N’afọ 1842, mgbe ndị inyom nke Nzukọ nsọ n’eto eto chọrọ ihiwe otu a maara amaara iji nyee aka n’ọrụ ahụ, Onyeisi Josef Smit nwetere mmetụta nke mmụọ ịhazi ha “n’okpuru ọkwa nchụaja n’usoro nke ọkwa nchụaja.”4 O kwuru, “Ugbua a na m atụgharị ikike a nye gị n’aha nke Chineke …—nke a bụ mmalite nke ụbọchị ọma.”5 Ma kemgbe atụgharịrị ikike ahụ, ohere nke mmuta, nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na nke mkpata na mmefu maka ndị inyom ebidowo iji nwayọ mụbaa na gburugburu ụwa niile.6

Otu ndị inyom ọhụrụ nke Nzukọ nsọ nke a, akpọrọ Otu Enyem aka, diiri iche na otu nke ndị inyom ndị ọzọ e nwere taa n’ihi ehiwere ya site n’aka onye amụma onye jiri ikike ọkwa nchụaja rụọ ọrụ iji nye ndị inyom ikike, ọrụ ndị dị nsọ, na ọkwá ndị a maara amaara n’ime nhazi nke Nzukọ nsọ, n’abụghị isite na ya pụọ.7

Site na ụbọchị nke Onye amụma Josef Smit ruo na nke anyị taa, mweghachite nke ihe niile na-aganiihu ewetewo ezi nghọta doro anya na mkpa nke ikike na ike nke ọkwa nchụaja n’inyere ma ndị ikom ma ndị inyom aka mezuo ọrụ si n’eluigwe enyere ha. Na nso nso a akuziworo anyị na ndị inyom ndị edokwara n’okpuru ntụzi aka nke onye ji ọtụghe nke ọkwa nchụaja n’eji ikike ọkwa nchụaja eme ihe n’ọkpụkpọ oku ha.8

Na Ọktoba 2019, Onyeisi Russell M. Nelson kuziri na ndị inyom ndị nweteworo onyinye dị nsọ n’ime tempụl nwere ike ọkwa nchụaja n’ime ndụ ha nakwa nime ebe obibi ha dị ka ha n’edebe ọgbụgba ndụ dị nsọ ndị ahụ ha meworo n’ihu Chineke.9 Ọ kọwara na “eluigwe ahụ ka emepeworo nye ndị inyom ndi enyeworo onyinye dị nsọ site n’ike nke Chineke na-apụta site n’ọgbụgba ndụ ọkwa nchụaja ha dị ka ha dịịrị ndị ikom ndi ji ọkwa nchụaja ahụ.” Ma ọ gbara nwanne nwanyị ọbụla ume, “ị nara ike nke Onye-nzọpụta nụzọ sara mbara maka inyere ezinaụlọ gị na ndi ọzọ ị hụrụ n’anya aka.”10

Ya mere gịnị ka ọ pụtaara mụ na gị? Kedu otu nghọta ikike na ike ọkwa nchụaja si agbanwe ndụ anyị? Otu isi ihe bụ ịghọta na mgbe ndị inyom na ndị ikom rụkọtara ọrụ ọnụ, anyị na emezu nnukwu ihe karịa mgbe anyị rụrụ ọrụ iche iche.11 Ọrụ anyị na-emekorita karịa ị na-ama aka. N’agbanyeghị na-echigh ndị inyom echichi n’ụlọ ọrụ ọkwa nchụaja, dịka ekwuru mgbe gara aga ndị inyom ka e jiri ike ọkwa nchụaja gọzie dị ka ha nedebe ọgbụgba ndụ ha, ma ha ji ikike ọkwa nchụaja arụ ọrụ mgbe edokwara ha n’ọkpụkpọ oku.

N’otu ọmarịcha ụbọchị na Ọgọst, e nwetere m ohere ọma ịnọdụ ọdụ mụ na Onyeisi Russell M. Nelson n’ime ebe obibi nke Josef na Emma Smit arụgharịrị dị n’ime Harmony, Pennslyvania, n’akụkụ ebe eweghachitere Ọkwa Nchụaja nke Erọn nụbọchị ikpeazụ ndị a. Na mkparịta ụka anyị, Onyeisi Nelson kwuru banyere ọrụ dị mkpa ndị inyom rụrụ na Mweghachite.

Onyeisi Nelson: “Otu n’ime akụkụ kachasị dị mkpa nke na-abịa m n’uche mgbe m bịara n’ebe mweghachi nke ọkwa nchụaja ahụ bụ ọrụ dị mkpa nke ndịinyom rụrụ na Mweghachi ahụ.

“Mgbe Josef bidoro na mbụ ịtụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn, onye dere ihe? N’ezie, o mere nwa obere, kama o bughị ibu. Emma bịara nyee aka.

“Ma mgbe ahụ e chere otu Josef si banye n’ime ọdọ osisi ikpe ekpere n’akụkụ ebe obibi ha na Palmyra, New York. Ebee ka ọ gara? Ọ bara n’ime Grove Dị nsọ. Gịnị mere o jiri gaa ebe ahụ? N’ihi na ebe ahụ bụ ebe Nne na-aga mgbe ọ chọrọ ikpe ekpere.

“Ndị ahụ bụ nnọọ ndị inyom abụọ nwere ọrụ dị mkpa na mweghachi nke ọkwa nchụaja na n’ime Mweghachi nke Nzukọ nsọ ahụ. Enweghị mgbagwoju anya, anyị nwere ike kwuo na ndị nwunye anyị dị nnọọ mkpa taa dịka ha dị mkpa oge ahụ. N’ezie ha dị.”

Dị ka Emma na Lucy na Josef, anyị na-emepụtali ihe nke ọma karịchaa mgbe anyị dị na njikere ịmụta ihe site n’aka onye na ibe ya ma dịrị n’otu na ebumnuche anyị ị bụrụzi ndị n’eso ụzọ nke Jizọs Kraịst ma nyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ahụ.

Akụziiri anyị na “ọkwa nchụaja na-agọzi ndụ ụmụ nke Chineke n’ụzọ apụghị ịgụta ọnụ. … Na ọkpụkpọ oku [Nzukọ nsọ], emume nsọ tempụl, mmekọrịta ezi na ụlọ, na mgbasa ozi nke onwe dị nwayọ, ndị inyom na ndị ikom nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a na-aganiihu jiri ike na ikike nke ọkwa nchụaja. Ndaberekọta a ndị ikom na ndị inyom n’imezu ọrụ nke Chineke site n’ike Ya hiwere isi na ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere site n’aka Onye amụma Josef Smit.”12

Ịdị notu dị mkpa nye ọrụ si n’eluigwe nke anyị nwere ohere ọma ime na nke akpọrọ anyị oku ịrụ, mana ọ naghị eme na nkịtị. A na-ewe mgbalị na oge iji adụkọrịta ndụmọdụ n’ezie—ige ntị onye na ibe ya, ghọta echiche nke ndị ọzọ, ma kekọrịta nhụmihe—mana usoro ahụ n’akpata mkpebi si na mmụọ karịa. Ma ọ bụ n’ọrụ ebe obibi ma ọbụ nke Nzukọ nsọ anyị, ụzọ kacha mma iji mejupụta ike anyị si na chi bụ ịrụkọta ọrụ ọnụ, agọziri site n’ike na ikike nke ọkwa nchụaja ahụ n’ọrụ anyị gbara iche n’emeju ibe ya.

Kedụ ihe mmekọrịta ihe ahụ yiri ka ya na ndụ ndị inyom gbara ndụ taa? Ka m kọọ maka otu ọmụmatụ.

Foto, oyiyi
Dị na nwunye n’elu igwe mmadụ abụọ

Alison na John nwere mmekọ pụrụ iche. Ha nyara ụdị anyịnya igwe mmadụ abụọ na-agba n’ọsọ nta na nke ogologo. Inwe ike nwalie nke ọma aka n’ụgbọ ala ahụ, mmadụ abụọ ndị ahụ na-agba ya ga adịrịrị n’otu. Ha ga ehudata n’otu ụdịrị akụkụ n’oge ziri ezi. Otu onye agaghị akara nke ọzọ, mana ha ga ekwukọrịtarịrị nke ọma ma nwoke ma ọ bụ nwanyị ọbụla e mee akụkụ nke ya. Onyeisi, nọ n’ihu, nwere ike kwuo mgbe ha ga-akwụsị na mgbe ha ga eguzoro. Onye mkpalite, nọ n’azụ, kwesịrị ileba anya nke ọma n’ihe na-eme ma dịrị njikere inyekwu ike ma ọ bụrụ na ha laa azụ obere ma ọbụ ijiri nwayọ ma ha ruo ndị ọgba meshịn ndị ọzọ nso nso. Ha ga-akwadorịrị ibe ha inwe ike gaa n’ihu ma nwetazuo ebumnuche ha.

Alison kọwara: “Na nwa oge nke mbụ, onye nọ n’ọnọdụ nke onyeisi ga-asị ‘Guzoro’ mgbe anyị kwesịrị iguzoro na ‘Kwụsịtụ’ mgbe anyị kwesịrị ịkwụsị ịzọ pedal. Emesịa, onye mkpalite nọ n’azụ amụta ikwu mgbe onyeisi ga-achọ iguzo ma ọbụ ịkwụsị, ma ọdịghị mkpa ikwu okwu ọzọ. Anyị mụtara ịmata otu onye na ibe ya si eme ma nwere ike mata mgbe otu onye nwere nsogbu ma [mgbe ahụ] onye nke ọzọ a tụtụrụ ụdọ ndu ahụ. Ọ bụ ihe dakwasịrị na ntụkwasị obi na ịrụkọta ọrụ ọnụ.”13

John na Alison dịịrị n’otu n’abụghị nanị dịka ndị na anya igwe ha, mana ha dịịrị n’otu n’ọlụlụ ha kwa. Onye ọbụla na-achọ ańụrị maka onye nke ọzọ karịa nke onwe ya; nke ọbụla na-achọ agwa ọma dị na ndụ nke onye ọbụla ma rụọ ọrụ imeri nhụta agwa na-adịchaghị mma dị n’ime onwe ha. Ha kere ya eke idu ma kee kwa inye aka mgbe otu onye mmekọ nọọrọ na nsogbu. Onye ọbụla na-anabata ntụnye uche nke onye ọzọ ma chọta ezi azịza nye mkpa ha dị ka ha tinyekọtara akara aka na akụrụngwa ha ọnụ. Ha jikọtara nnọọ onwe ha n’ezie site n’ịhụnanya dị ka Kraịst.

Ịnọgide n’atụmatụ dị nsọ nke ịrụkọta ọrụ ọnụ n’ịdị n’otu dị oke mkpa n’ụbọchị taa nke ozi “onwe m-mbụ” gbara anyị gburugburu. Ndị inyom nwere onyinye pụrụ iche, dị nsọ14 ma enyere ha ọrụ pụrụ iche, mana ndị ahụ adịghị mkpa karịa—ma ọbụ dị nta karịa—onyinye na ọrụ dị mkpa nke ndị ikom. Ndị niile ka e kere ma chọọ na-iweta atụmatụ dị nsọ nke Nna nke Eluigwe inye onye ọbụla n’ime ụmụ Ya ohere kachasị mma imejupụta ike ya dị nsọ.

Taa, “anyị chọrọ ndị inyom ndị nwere mgbamume na ike ịhụ ọhụ nke Nne anyị Iv”15 ijikọta ha na ụmụnna ha n’ikpọbata ọtụtụ mkpụrụ obi nye Kraịst.16 Ndị ikom kwesịrị ịbụrụzi ezi ndị mmekọ karịa ichere na ha bụ ndị ihe niile dị n’aka ma ọbụ mee dị ka ndị mmekọ “nghọgbu” ebe ndị inyom na-arụkarịcha n’ọrụ. Ndị inyom kwesịrị ịdị na njikere “ịkwụniihu [ma] were ọnọdụ ruuru [ha] na nke kwesịịrị ha”17 dị ka ndị mmekọ karịa iche na ha ga-eme ihe niile n’onwe ha ma ọbụ chere ka agwa ha ihe ha ga-eme.18

Ịhụta ndị inyom dị ka ndị dị so eme ihe dị mkpa abụghị maka ịbụ ọgbọ kama maka ịghọta eziokwu nke ozi ọma. Kama ihiwe atumatu iwete nke ahụ na mmezu, anyị nwere ike rụsie ọrụ ike ịhụta ndị inyom dị ka otu Chineke si ahụta ha: dị ka ndị mmekọ dị mkpa n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu.

Anyị dị na njikere? Anyị ga agbalị imeri omenaala ọjọọagwa kama ị nabata usoro na agwa dị nsọ dabeere na ozizi nke ntọala. Onyeisi Russell M. Nelson n’akpọku anyị ka anyị “tikọta aka n’ọrụ a dị nsọ … [i] nye aka kwadoo ụwa maka Ọbịbịa nke Abụọ nke Onyenwe anyị.”19 Dịka anyị na-eme ya, anyị ga-amụta ịnabata ntụnye uche nke onye ọbụla ma welite ịdị nkọ nke anyị ji emezu ọrụ anyị dị nsọ. Anyị ga-enwete nnukwu ọńụ karịa nke anyị nweteworo mbụ.

Ka onye ọbụla n’ime anyị họrọ ịdị n’otu n’ụzọ nke Onyenwe anyị kwalitere iji nye aka ka ọrụ Ya gaa n’ihu. Site na aha nke Onye Nzọpụta anyị hụrụ n’anya, Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee Genesis 3:1–18; Mozis 4:1–19.

  2. Lee Mozis 5:1–12. Amaokwu ndịa na-akuzi banyere ezi mmekọ nke Adam na Iv: ha abụọ mụrụ ụmụ (amaokwu 2); ha rụkọrịtara ọrụ ọnụ na-ịkpata nri maka ha onwe ha nakwa ezi na ụlọ ha (amaokwu 1); ha kpekọrọ ekpere ọnụ (amaokwu 4); ha abụọ rubere isi nye iwu nsọ niile nke Chineke ma chụọ aja (amaokwu 5); ha mụkọrịtara ihe ọnụ (amaokwu 4, 6–11) ma kuzikọrịtara ụmụ ha ozi ọma nke Jizọs Kraịst (amaokwu 12).

  3. Josef Smit—Agụgụala 1:16.

  4. Joseph Smith, n’ime Sarah M. Kimball, “Akụkọndụonwe,” Nkwado Nke Onye inyom, Sept. 1, 1883, 51; lee kwa Nkuzi niile nke Ndịisi Nzukọ nsọ: Josef Smit (2007), 451.

  5. Joseph Smith, n’ime “Nauvoo Relief Society Minute Book,” 40, josephsmithpapers.org.

  6. Lee George Albert Smith, “Okwu a gwara Ndị otu Enyem aka,” Magazin Otu Enyem aka, Dec. 1945, 717.

  7. Lee John Taylor, na Minit Otu Enyem aka nọ na Nauvoo, Mar. 17, 1842, nke e nwere na churchhistorianspress.org. Dị ka otu Eliza R. Snow kwuru, Josef Smit kuzikwara na ndị inyom ka ahaziworo n’ọgbọ ndị gara aga (lee Eliza R. Snow, “Otu Enyem aka Ụmụ nwanyị,” Deseret News, Apr. 22, 1868, 1; Ụmụada nọ na-Alaeze M: Agụgụala na Ọrụ nke ndị Otu Enyem aka [2011], 1–7).

  8. Lee Dallin H. Oaks, “Ọtụghe niile na Ikike nke Ọkwa Nchụaja,,” Liahona, Me 2014, 49–52.

  9. Lee Russell M. Nelson, “Spiritual Treasures,” Liahona, Nov. 2019, 78, 79.

  10. Russell M. Nelson, “Akụ nke Ime mmụọ,” 77.

  11. “Mana ozi ọma eweghachitere na-akuzi uche ebighị ebi na ndị di na ndị nwunye na emekọrịta ihe onye na ibe ya. Ha hara ọnụ. Ha so onwe ha” (Bruce R. and Marie K. Hafen, “Nkụfe Ọnụ ụzọ na Ị bụ Ndị na-eso Ha otu,” Liahona, Aug. 2007, 28).

  12. Isi okwu niile nke Ozi ọma, “Nkuzi niile Josef Smit nyere gbasara Ọkwa nchụaja, Tempụl, na Ndị inyom,” topics.ChurchofJesusChrist.org.

  13. Nzikọrịta-ozi nke onwe

  14. Lee Russell M. Nelson, “Arịrịọ nye Ụmụnne M Nwanyị,” Liahona, Nov. 2015, 95–97.

  15. Russell M. Nelson, “Arịrịọ nye Ụmụnne M Nwanyị,” 97.

  16. Lee Akwụkwọ ntụzi aka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a,, 1.4, ChurchofJesusChrist.org.

  17. Russell M. Nelson, “Arịrịọ nye Ụmụnne M Nwanyị,” 97.

  18. “Ezi ụmụnne m nwanyị, nke ọbụla bụ ọkpụkpọ oku unu, ọnọdụ ọbụla unu nọ, anyị chọrọ echiche unu, nghọta unu na mkpatemmụọ unu. Anyị chọrọ ka unu kwulite okwu ma kwupụta okwu na kansụl ngalaba ukwu na nke stek. Anyị chọrọ ka nwanne nwanyị ọbụla lụrụ di kwuo okwu dịka ‘onye nsiso na-atụpụta uche ma zuo oke’ dị ka unu n’ejikọ aka unu na di unu n’iduzi ezi na ụlọ unu. Ma ị lụọla ma ị nọọrọ onwe gị, unu bụ ụmụnne nwanyị nwere ike pụtara ihé na akọnuche pụrụ iche unu nataworo dị ka onyinye sitere n’aka Chineke. Anyị bụ ụmụnna enweghị ike imepụtali ụdị mmetụta pụrụ iche nke unu. …

    “… Anyị chọrọ ume unu!” (Russell M. Nelson, “Arịrịọ nye Ụmụnne M Nwanyị,” 97).

  19. Russell M. Nelson, “Arịrịọ nye Ụmụnne M Nwanyị,” 97.