Ọgbakọ Zuru ọha
Otu Ọkwa nchụaja si Na-Agọzi Ndị ntoroọbịa
Ọgbakọ Zuru-ọha Eprel 2020


Otu Ọkwa nchụaja si Na-agọzi Ndị Ntoroọbịa

Anyị nwere ike nwete mbuli elu site na ọkwa nchụaja ahụ. ọkwa nchụaja na-ewete ihe n’ime ụwa anyị.

Obi m juru na-ekele ị nọ ebe a. Mgbe m buuru ụzọ chọpụta na m ga-enweta ohere ị gwa unu okwu taa, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu, mana n’otu aka ahụkwa e nwere m umeala. O weela m ọtụtụ oge iche echiche banyere ihe m na-aga ikwu, e nwere m olileanya na Mmụọ Nsọ ga-agwa unu okwu site na ozi m.

N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, Lihaị nyere ụmụ ya ndị nwoke ọbụla ngọzi tupu ya a nwụọ nke nyere ha aka ị hụta nkwamiike ha na ike nke mmụọ dị ebighị ebi. A bụ m onye nke kacha dị nta n’ime ụmụ asatọ, ma na-afọ nke a gara aga ọ bụ naanị m nọ n’ebe obibi ugbu a ke mgbe a mụrụ anyị. Na-enweghị ụmụnne m nọ nso na enweghị onye m ga na-agwa okwu mgbe niile a bụrụwo nsogbu nyere m. E nwego anyasị ndị owu kụrụ m. Obi m juru na ekele maka nne na nna m ndị na-anwago ike ha inyere m aka. Otu ọmụmaatụ banyere nke a bụ mgbe nna m wepụtara onwe ya inye m ngọzi nke ọkwa nchụaja nke nkasi obi n’oge m na-agabiga nnwale. Ka o nyechara m ngọzi, ihe niile agbanweghị ozugbo, mana e nwere m ike nweta udo na ịhụnaanya site n’aka Nna m nke bi n’Eluigwe nakwa nna mụrụ m. A bụ m onye a gọziri agọzi inwe nna tozuru oke nwere ike inye m ngọzi niile nke ọkwa nchụaja mgbe ọbụla m chọrọ ha na onye nke na-enyere m aka ịhụta nkwamiike m niile na ike nke mmụọ dị ebighị ebi, dịkwa ka Lihaị mere mgbe ọ gọziri ụmụ ya.

Na-agbanyeghị ọnọdụ ndị ị nọ n’ime ya, i nwere ike inweta ngọzi niile nke ọkwa nchụaja. Site n’aka ndị otu ezi na ụlọ, ndị enyi, ụmụnne nwoke na-eme nlekọta, ndị ndu ọkwa nchụaja, nakwa Nna nke Eluigwe na-adịghị agharịpụ, i nwere ike ịnata ngọzi niile nke ọkwa nchụaja. Okenye Neil L. Andersen sịrị na: “Ngọzi niile nke ọkwa nchụaja dịkarịsịrị ukwuu karịa onye nke ahụ a gwara ka onye onyinye ahụ. … Mgbe anyị tozuru oke, emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na-eme ka ndụ anyị baa ụbara.”1

E nwekwala obi abụọ ị nara ngọzi mgbe ị chọrọ ntụzi aka karịrị akarị. Ọ bụ n’oge ndị anyị nọ n’ihe nramahụ ka anyị kachasị nwee mkpa enyem aka Mmụọ Nsọ. O nweghị onye zuru oke, anyị niile na-enweta ihe isi ike. Ụfọdụ n’ime anyị nwere ike nwee nsogbu nke obi iko n’elu, mmụọ ịda mba, agwa ọjọọ rara ahụ nhapụ, ma ọ bụ nke inwe mmetụta na anyị ezughị oke dị ka a chọrọ. Ngọzi niile nke ọkwa nchụaja nwere ike nyere anyị aka merie aka mgba ndị a niile ma nata udo mgbe anyị na-aganiihu banye n’ọdịniihu. E nwere m olileanya na anyị ga-agba mbọ i bi ndụ ntozu oke maka ịnata ngọzi ndị a.

Ụzọ ọzọ ọkwa nchụaja na-esi agọzi anyị bụ site na ngọzị niile nke onye petrak. A mụtawo m ị na-agụ ngọzi nke onye petrak nyere m mgbe ọbụla obi jọrọ m njọ ma ọbụ mgbe owu dara m. Ngọzi m na-enyere m aka ị hụta ike dị n’ime m na kpọm kwem atụmatụ Chineke kwadooro m. Ọ na-enye m nkasi obi ma na-enyere m aka ịhụta ihe m tụrụ anya ya karịa ka m si ahụta ya ugbu a. Ọ na-echetara m maka onyinye m niile na ngọzi niile m ga-anata ma ọ bụrụ na m ebie ndụ tozuru oke. Ọ na-enyekwara m aka icheta ma nwee udo na Chineke ga-enye m ọsịsa niile ma megheere m ụzọ n’oge ọbụla ọkachasị m na mkpa.

Ngọzi niile nke onye petrak na-enye aka a kwado anyị ịlọghachi bịa binyere Nna anyị nke Eluigwe. Amaara m na ngọzị niile nke onye petrak si n’aka Chineke bịa ma ọ ga-enyere anyị aka gbanwee adịghị ike anyị ya a ghọọ ume. Ndị a abụghị ozi si n’aka ndị ọgba afa; ngọzi ndị a niile na-agwa anyị ihe ndị anyị kwesịrị ịnụ. Ha dị ka Laịhona nyere onye ọbụla n’ime anyị. Anyị jiri Chineke kporo ihu ma nwee okwukwe n’ime Ya, Ọ ga-edufe anyị n’ime ọzara nke onwe anyị.

Dị nnọọkwa ka Chineke siri gọzie Josef Smit nye ya ọkwa nchụaja ka e wee nwee ike iweghachi ngọzi niile nke ozi ọma, anyị nwere ike ịnata ngọzi niile nke ozi ọma n’ime ndụ anyị site na ọkwa nchụaja ahụ. Kwa izu ụka a na-enye anyị ikike na ohere nke ịnata oriri nsọ. Site na emume nsọ nke ọkwa nchụaja nke a, anyị nwere ike inwe Mmụọ Nsọ ịnọnyere anyị oge niile, nke nwere ike ịsachapụ anyị mee anyị adị ọcha. Ọbụrụ na anyị e nwee mkpa iwepụ ihe na ndụ anyị, kpọtụrụ onye ndu nwere ntụkwasị obi nwere ike inyere gị aka ị banye n’okporo ụzọ ziri ezi. Ndị ndu unu nwere ike inyere unu aka inwete n’uju Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Ekele dịrị Chineke maka ọkwa nchụaja ahụ, anyị nwekwara ike ịnata ngọzi nke emume nsọ niile nke tempụl. Ke mgbe m nwere ike baa na tempụl, a kpọwo m ya oke na ọrụ na isi ihe kwesịrị ekwesị ị na-aga ya esepụghị aka. Site na-iwepụta ohere na ichụ aja kwesịrị ekwesị ị nọ Nna m nke Eluigwe nso na ụlọ nsọ Ya, e nwetawo m ngọzi ịnata mkpughe na mkpalite nke mmụọ na-enyerewo m aka na-ezia n’oge ndụ m niile.

Anyị nwere ike nwete mbuli elu site na ọkwa nchụaja ahụ. ọkwa nchụaja na-ewete ihe n’ime ụwa anyị. Okenye Robert D. Hales sịrị na: “Ewezuga ike nke ọkwa nchụaja, ‘elu ụwa niile gaara ala n’iyi’ (lee D&C 2:1–3). Ihe agaghị adị, olileanya agaghị adị—naanị ọchịchịrị.”2

Chineke na-ańụrị ọńụ n’ebe anyị nọ. Ọ chọrọ ka anyị laghachitere Ya. Ọ maara anyị n’otu n’otu. Ọ maara gị. Ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ maara ihe banyere anyị mgbe niile na-agọzi anyị ọbụladị mgbe anyị chere na o kwesịghịrị anyị. Ọ maara ihe na-akpa anyị na mgbe anyị chọrọ ya.

“Na-arịọnụ, a ga-enye unu, na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu:

N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ, na-arịọta; onye ọ bụla nke na-achọkwa, na-achọta; onye ọ bụla nke na-akụkwa ka a ga-emeghere” (Matiu 7:7–8).

Ọ bụrụ na ị nwebeghịrịị ọgbụgba ama banyere ọkwa nchụaja ahụ, a na m agba gị ume ka i kpee ekpere ma rịọ ịmata na onwe gị ihe banyere ike ya, ma gụkwaa akwụkwọ nsọ maka ị nụ okwu nke Chineke. A maara m na ọ bụrụ na anyị a gbaa mbọ inweta ike nke ọkwa nchụaja nke Chineke na ndụ anyị, anyị ga-abụ ndị a gọziri agọzi. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Neil L. Andersen, “Ike dị na Ọkwa nchụaja,” Liahona, Nov. 2013, 92.

  2. Robert D. Hales, “Ngọzi niile nke Ọkwa nchụaja,” Ensign, Nov. 1995, 32.