Akwụkwọ nke Mọmọn—Akụ Na-enweghị Atụ na Njem Anyị
Dịka anyị na-eri oriri n’elu okwu niile nke Kraịst dị na Akwụkwọ nke Mọmọn, Mmụọ ahụ ga-enyere anyị aka ghọta eziokwu niile nke ebighị ebi.
Ịnwere ike ịcheta otu oge mgbe mmadụ nyere gị otu onyinye nke gbanworo ndụ gị? Na Ọktoba nke a mere ya afọ 40 kemgbe m natara otu niime onyinye nke kachasị ibe na ndụ m. Mgbe m nọ na sekọndịrị, a matara m otu niime ọgbọm na klas nwere ìhè dị iche site na ọtụtụ niime ndị ntoroọbịa ndị ọzọ. Ọ na-amasị m ịnọ nʻakụkụ ya. Otu ụbọchị, ọ gwara m na ọ bụ onye otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazu a. Ma emesịa ọ nyere m otu onyinye: otu kọpị nke Akwụkwọ nke Mọmọn. Ọ kpokuru m ka m gụọ ntakịrị ihuakwụkwọ ole nʻole ma zute ndị enyi abụọ nwere ike iza ajụjụ m niile. Ndị enyi ahụ bụ ndị mgbasa ozi ọma.
Nʻoge m zutere ndị mgbasa ozi ọma ahụ, ha kuziiri m ozizi nke Kraịst ma kpọkuo m ka m soro ọkpụkpọ okù nke onye amụma Moronaị: “Ma mgbe unu ga-anata ihe ndị a, aga m agba unu ume ka unu wee jụọ Chineke, Nna nke Ebighị ebi, nʼaha nke Kraịst, ma ihe ndị a ha abụghị ezi okwu; ma ọ bụrụ na unu ga-eji ezi obi, jiri ezi ebumnoobi, na-enwe okwukwe niime Kraịst, ọ ga-egosipụta eziokwu maka ya nye unu, site nʼike nke Mmụọ Nsọ.” (Moronaị 10:4).
A gụwo m ọtụtụ ihuakwụkwọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn ma kpee ekpere. Na-agbanyeghị na-enweghị m nghọta dị omimi nke ihe niile nke ndị mgbasa ozi ọma na-akuziri m, enwetere m mmetụta nʻobi m na ihe m na-agụ dị mma ma ọ si nʻaka Chineke bịa. A natara m akaebe maka nkwa nke Moronaị: “Ma site nʼike nke Mmụọ Nsọ unu ga-enwe ike mata eziokwu nke ihe niile.” (Moroni 10:5).
Mgbe m mere baptizim banye Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, ụfọdụ ndị enyi gbara mbọ iji mee ka m kwete na emewo m mkpebi na-ezighị ezi. Ma mgbe ọ bụla m zutere ụdị obi abụọ na mmegide dị otu a, a natara m akaebe ọhụrụ site na-ịmụ akwụkwọ nsọ na ikpe ekpere iji nọgide na ọgbụgba ndụ nke ahụ m banyere niime ya mụ na Chineke. Kemgbe ahụ, Akwụkwọ nke Mọmọn abụrụwo ihe nsiso m ma bụrụ akụ na-enweghị atụ na njem ndụ anụ ahụ m.
Akwụkwọ nke Mọmọn karịrị nnọọ akwụkwọ. Ọ bụ ama ọzọ nke Jizọs Kraịst, e dere site n’aka ọtụtụ ndị amụma mgbe ochie site na mmụọ nke ibu amụma na mkpughe.
Ihe omume nke kachasị e depụtara n’Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ije ozi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’onwe ya, o jere n’etiti ndị Nefi nwa ntịntị oge Mbilite nʻọnwụ Ya gasịrị. Akwụkwọ nke Mọmọn “na-akọwa ozizi niile nke ozi ọma ahụ, gosikwa atụmatụ nke nzọpụta, ma gwa ụmụ mmadụ ihe ha na-ahaghị ime ka ha wee nweta udo n’ụwa nke a na nzọpụta ebighị ebi n’ụwa nke na-abịa” (ndụbata nye Akwụkwọ nke Mọmọn).
Mbiputa nke mbụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn: Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst ka ebipụtara nʻobodo ntakịrị dị na steeti nke New York na March 1830. Onye amụma Josef Smit gbara nanị afọ 23 mgbe ọ mechara ntụgharị nke akwụkwọ ahụ nʻafọ 1829. Ọ tụgharịrị ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụru akwụkwọ niile ahụ ihe na-erughị mkpụrụ ụbọchị 75 ma usoro mbipụta ya weere ịhe ruru ọnwa asaa.
Taa, ihe fọrọ ntakịrị ka o ruo ndị mgbasa ozi ọma 80,000 nʻuju oge niime obodo karịrị 150 na-eje ozi dị ka ndị ọrụ afọ ofufo, ndị wepụtara ndụ ha iji gbaa akaebe na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu na ọ na-agba akaebe maka Jizọs Kraịst.
Na semina e mere na nsonso a maka ndị ndu ọhụrụ nke mishọn na Jun nke afọ nke a, Onyeisi Russell M. Nelson, kesara ama ya dị ike nke Akwụkwọ nke Mọmọn: “Akwụkwọ nke Mọmọn bụ … okwu Chineke. Ọ na-akuzi ozizi nke Kraịst ma na-akọwa karịa banyere Aja mgbaghara mmehie nke Onye nzọpụta karịa otu akwụkwọ ọzọ si eme.”
Ọ ga-amasị m inye aro atọ nke nwere ike ime ka ntọghata anyị nye Jizọs Kraịst mikpukwuo ime site nʻọmụmụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn:
1. Na-arụsi ọrụ Ike ma Nọgide Nʻọmụmụ ihe Gị Kwa ụbọchị
Dị nnọọ ka Alma na ụmụ ndị nwoke nke Mozaya, anyị kwesịrị “[inyochasị] akwụkwọ nsọ ike, ka [anyị] wee mata okwu nke Chineke” ma nwete agbam ume nʻeziokwu ahụ (Alma 17:2).
Mgbe anyị na-eje ozi dị ka ndị ndu mishọn nʻobodo Georgia Atlanta Mishọn, mụ na nwunye m anyị gbara onye mgbasa ozi ọma ọbụla ume ịmụ Akwụkwọ nke Mọmọn ihe ruru nkeji 30 kwa ụbọchị. Mkpebi obi ahụ wulitere okwukwe anyị ma nyere anyị aka ịchọ na ịtụ anya ọrụ ebube.
O kwere omume na mgbe mishọn ahụ gasịrị anyị enweghị ike inwe ụdị oge ahụ maka ọmụmụ akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, mana ana m ekwe nkwa na ọ bụrụ na i jiri ezi obi na ekpere jiri ọmụmụ Akwụkwọ nke Mọmọn kpọrọ ihe kwa ụbọchị, ị ga-achọta nnukwu ume nke ime mmụọ na obisiike niime Onyenwe anyị na nkwa Ya.
2. Mee Ọmụmụ Gị ka ọ bụrụ Ihe Bara uru site Na-iri oriri n’elu Okwu niile nke Kraịst.
Nefi kuziri: “N’eri nụ oriri n’elu okwu niile nke Kraịst; n’ihi na lee, okwu niile nke Kraịst ga-agwa unu ihe niile unu kwesịrị ime.” (2 Nefi 32:3).
Iri oriri pụtara ihe karịrị nanị ịgụ—iri mịchaa aka, ịtule nʻuche, na itinye nʻọrụ. Dị ka ị na-amụ Akwụkwọ nke Mọmọn, tulee ụzọ iji mee ọmụmụ akwụkwọ nsọ gị ka ọ bakwoo uru. Na-ịma atụ:
-
Jiri enyemaka ọmụmụ niile dị nime app Ọba akwụkwọ Ozi ọma.
-
Chọta eziokwu ebighị ebi ndị ahụ na-enyere anyị aka ghọta atụmatụ nke Chineke ma na-eduru anyị ime ma debe ọgbụgba ndụ anyị na Nna anyị nke Eluigwe.
-
Depụtachaa nkebiokwu ndị dị mkpa ma detuo echiche gị niile iji chekwaa ihe ị mutaworo nʻoge ọmụmụ gị.
Akwụkwọ nke Mọmọn nwere ike eji aza ajụjụ niile nke mkpụrụ obi anyị. Dịka Nefi kwuru, anyị kwesiri “iji akwụkwọ nsọ nile tụnyere anyị onwe-anyị, nke ga-eme ka anyị nweta uru na mmụta” (1 Nifaị 19:23).
Ka anyị na-eri oriri n’elu okwu niile nke Kraịst, ha ga-emeghere gị ụzọ inweta mkpughe ma gosi anyị ihe anyị kwesịrị ime nʻọnọdụ niile nke ndụ anyị iji dọta anyị nso nʻebe Ọ nọ.
3. Gbaa Ama Gị maka Eziokwu nke Akwụkwọ nke Mọmọn.
Dịka Lehi nwere ọchịchọ ikesa mkpụrụ osisi nke ndụ ahụ nye ezi na ụlọ ya (lee 1 Nefi 8:12), mgbe anyị nwetere ama nke Akwụkwọ nke Mọmọn, anyị na-ewulite ọchịchọ ikesa ọn̄ụ ahụ na-abịa site nʻịmata ozi ọma nke Jizọs Kraịst.
Otu niime onye mgbasa ozi ọma anyị, Nwanne nwanyi Benson, onye nọnyere anyị nʻọgbakọ nke a, gwara mụ maka ọchịchọ ya ịji nyere obere nwanne ya nwoke aka. Nʻoge ahụ, nwanne ya nwoke na-akwado ịga mahadum, ma ọ maghị maka ịje mishọn. Ọ metụrụ m niime obi ịkpoku Nwanne nwanyị Benson ka ọ gụọ Akwụkwọ nke Mọmọn nʻọnwa anọ mbụ nke mishọn ya, wee na-akanye ihe nʻokpuru amaokwu ndị masịrị ya, ma emesịa zigara otu kọpị ya nye nwanne ya nwoke.
Nwanne nwanyị Benson zigara otu kọpị Akwụkwọ nke Mọmọn akanyere ihe ma kpọkuo nwanne ya nwoke ka ọ gụọ site na ya abalị ọbụla. Ọ mechara gwa m sị: “Tupuu mishọn mụ, nwanne m nwoke amachaghị ma ọ chọrọ ije ozi mgbasa ozi ọma nʻuju oge. Nwayọọ nwayọọ, ka oge na-aga, ka nwanne ya nwoke na-agụ Akwụkwọ nke Mọmọn, ọ chọtara ọn̄ụ na-abawanye ụba na ndụ ya wee malite itule ije ozi mishọn.”
Izu ụka abụọ tupu Nwanne nwanyị Benson arụzuo ọrụ mishọn ya, nwanne ya nwoke natara ọkpụkpọ okù mishọn ya. Ugbu a ọ na-eje ozi na mishọn nke Mexico Tuxtla Gutierrez. Site n’Akwụkwọ nke Mọmọn, Okenye Benson bịara hụ ndụ jiri anya ime mmụọ doro anya, nke dugara ya ijere Onyenwe anyị ozi ma nwee ntụkwasị obi na ihe niile ga-adị mma. Mkpebi obi ahụ bụ ọrụ ebube—nke ewetara na mmezu site nʻokwu niile nke Kraịst.
Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị ndị m hụrụ naanya, a na m agba onye ọbụla niime unu ume ka unu mee ka ọmụmụ ihe unu nke Akwụkwọ nke Mọmọn mikpuo omimi. A mara m na dịka anyị na-eri oriri n’elu okwu niile nke Kraịst dị na Akwụkwọ nke Mọmọn, Mmụọ ahụ ga-enyere anyị aka ghọta eziokwu niile nke ebighị ebi ma kesaa ama anyị nye ndị ahụ Onyenwe anyị kwadoro ịnụ ozi Ya. Onyenwe anyị kwuru, “Ndị nke m ahọpụtara na-anụ olu m ma ha anaghị eme ka obi ha sie ike” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 29:7). Ana m agba ama na ndị ahụ ga-arịọ Chineke nʻokwukwe ga-enweta ọgbụgba ama nke eziokwu na ịdị nsọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn site n’ike nke Mmụọ Nsọ. Nke a ka m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.