Ọgbakọ Zuru ọha
Ha Enweghị ike Imeri, Anyị Enweghị ike Ịda
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Ha Enweghị ike Imeri, Anyị Enweghị ike Ịda

Ọ bụrụ na anyị ewuo ntọala anyị n’elu Jizọs Kraịst, any enweghị ike ịda!

Onye amụma anyị hụrụ naanya, Onyeisi Russell M. Nelson, nọgbakọ zuru ọha anyị gara aga kwuru sị: N’oge ndịa dị egwu nke Onye Ozi Pọl buburu amụma banyere, Setan anaghịkwa agbalị ọbụna izo agha niile ọ na-ebuso atụmatụ nke Chineke. Oke ihe ọjọọ jupụtara ebe niile. Ya mere, naanị ụzọ enwere ike isi nyaa niime mmụọ bụ ime mkpebi i kwe ka Chineke merie n’ime ndụ anyị, ịmụta ị nụrụ olu Ya, na iji ume anyị nye aka ikpokọta Izrel.”1

Dị ka anyị na-atụle ọkpụkpọ oku nke onye amụma ịmụ ịnụ olu Chineke, obi anyị o meela mkpebi ka ọ kpọchiela? Ka anyị cheta ndụmọdụ e nyere niime Jekọb 6:6: “Ee, taa, ọbụrụ na unu ga-anụ olu ya, hapụ ịkpọchi obi unu; maka gịnị ka unu ga eji-anwụ?” Ka anyị kpebie i kwe ka Chineke nwee mmeri niime ndụ anyị.

Kedụ otu anyị nwere ike iji ekwe ka Chineke nwee mmeri niime ndụ anyị na-abụghị onye iro? Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 6:34 anyị gụtara, “Ya mere, atụla egwu, obere igwe anụ ụlọ; mee ihe dị mma; ka ụwa na ala-mụọ jikọta aka megide gị, n’ihi na ọbụrụ na e wuru unu n’elu oke nkume m, ha enweghị ike emeri unu.” Ọ bụ nkwa dị mkpa. Na-agbanyeghị na eluigwe na ụwa nwere ike ijikọta ọnụ megide ganyị, ha enweghị ike imeri ma ọbụrụ na anyị a họrọ ikwe ka Chineke nwee mmeri site niihiwe ndụ anyị n’elu oke nkume Ya.

Ka Ọ na-agwa ndị na-eso ụzọ Ya okwu, Jizọs Kraịst kuziri ihe banyere otu onye amamihe na otu onye nzuzu, edetara na Matiu isi nke 7 nke Agba Ọhụrụ. Ọtụtụ niime unu anụwo abụ ndị Praịmarị ahụ “Onye amamiihe na Onye Nzuzu.”2 Ọbụrụ na unu enwego ohere ịtụle usoro anọ ndị dị n’ime abụ ahụ, unu ga-achọpụta na usoro nke1 na nke 2 yiri nnọọ usoro nke 3 na nke 4. Ma onye amamihe na onye nzuzu naara ewu ụlọ. Ha na-achọ inwetara ezi na ụlọ ha ebe obibi nwere nchekwa ma dị mma na-ahụ. Ha nwere oke mmasị ibikọ ọnụ ebighị ebi n’obi ụtọ dị ka otu ezi na ụlọ, dị nnọọ ka mụ na gị. Otu ụdịrị ọnọdụ ahụ gbara gburugburu: “Mmiri ozizo ahụ zoro, ma ide mmiri agbagoo.” Anyị na-ekwe ya ugboro isii mgbe anyị na-ekwe ukwe ahụ. Naanị ihe dị iche bụ na onye amamiihe wuru ụlọ ya n’elu oke nkume ma ụlọ ahụ guzooro chịm, ebe onye nzuzu wuru ụlọ ya n’elu aja ma ụlọ ya dara mmiri asọpụ ya. Ya mere, ebe anyị tọrọ ntọala dị oke mkpa, ma nke a na-enye aka eme mkpebi ihe ga-apụta n’ikpeazụ na mgbe ebighị ebi.

Ana m atụanya ma na-ekpe ekpere na anyị niile ga-achọta ma nọgide n’ezi ntọala ahụ dị ka anyị na-ehiwe ndụ ọdịniihu anyị. Ana echetara anyị na Hilaman 5:12: “Ma ugbua, ụmụ m ndị nwoke, chetanụ, chetanụ na ọ bụ nʼelu oke nkume nke Onye Mgbapụta anyị, onye bụ Kraịst, Ọkpara nke Chineke, ka unu ga-ewurịrị ntọala unu; ka ọ ga-abụ mgbe ekwensu ga-ezipụ ikuku ike ya, ee, akụ ya niile n’ime ifufegburugburu, ee, mgbe ụzụ mmiri eluigwe ya na ebili mmiri ike ya ga-adakwasị unu, ọ gaghị enwe ike nʼahụ unu ịdọkpụba unu nʼolulu nke nhuju-anya na ahụhụ ebighị ebi, n’ihi oke nkume ahụ nʼelu nke e wukwasịrị unu, nke bụ ezi ntọala, ntọala nke ọ bụrụ na ndị mmadụ wuo ụlọ n’elu ya ha agaghị ada.”

Nke ahụ bụ nkwa si n’aka Chineke! Ọ bụrụ na anyị ewuo ntọala anyị n’elu Jizọs Kraịst, any enweghị ike ịda! Anyị were okwukwe nwee ntachi obi ruo ọgwụgwụ, hineke ga-enyere anyị aka hiwe ndụ anyị nelu oke nkume Ya, “ma ọnụ ụzọ ama nke ala mmụọ agaghị emeri [anyị]” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 10:69. O nwere ike bụrụ na anyị agaghị enwe ike ịgbanwe ihe niile na-abịa, mana, anyị nwere ike họrọ otu anyị nwere ike iji kwadoo maka ihe na-abịa.

Ụfọdụ niime anyị nwere ike chee na, “Ozi ọma ahụ dị mma, niihi ya anyị kwesịrị itinye ya niime ndụ anyị, elemanya otu ugboro niizu ụka.” Naanị ị na-aga ụka otu ugboro niizu ụka ezughị oke iwu ụlọ n’elu oke nkume ahụ. Ndụ anyị niile kwesịrị ijupụta na ozi ọma Jizọs Kraịst. Ozi ọma abụghị mpaghara nke ndụ anyị, kama ndụ anyị na-ezia bụ mpaghara nke ozi ọma Jizọs Kraịst. Chebara ya echiche. Nke ahụ ọ bụghị eziokwu? Ndụ nke anụ ahụ anyị bụ naanị mpaghara nke okpurukpu atụmatụ nke nzọpụta na mbuli elu.

Chineke bụ Nna anyị nke bi N’eluigwe. Ọ hụrụ anyị niile n’anya. Ọ maara ụzọ anyị nwere ike dị mma karịa ka anyị maara onwe anyị. Ọ maara ọ bụghị naanị ihe niile banyere ndụ anyị. Ọ maara ihe niile banyere ihe niile nke ihe niile dị na ndụ anyị.

Biko soronụ ezi ndụmọdụ nke onye amụma anyị dị ndụ, Onyeisi Nelson. Dị ka ededatara niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 21:5–6:

“N’ihi na okwu ya ka unu ga-anata, dịka o si na-ọnụ nke mụ onwe m, na ndidi nile na okwukwe.

N’ihi na site na-ime ihe ndị a ọnụ ụzọ ama nile nke ala-mụọ agaghị akakwa unu ike; ee, ma Onyenwe anyị Chineke ga-achụsasị ike niile nke ọchịchịrị site n’ihu unu, ma mee ka eluigwe nile ma jijiji n’ihi ọdịnma unu, na ebube nke aha ya.”

Niihi nke a, ha enweghị ike imeri, ma anyị enweghị ike ịda!

Ana m agba ama nye unu na Kraịst ga-abịa ọzọ nke ugboro abụọ dị ka O mere n’oge mbụ, kama n’oge nke a ọ ga-eji nnukwu otuto na n’ụdị eze. Ana m atụanya ma na-ekpe ekpere na m ga-adị na njikere ịnabata Ya, ma ọbụ n’akụkụ akwa mkpuchi nke a ma ma ọbụ n’akụkụ nke ọzọ. Dị ka anyị na-eme mmemme oge Mbilite n’ọnwụ nke a dị ịtụnaanya, ana m atụanya, site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na ike nke Mbilite n’ọnwụ Ya (lee Moronaị 7:41), aga m enwe ike ịgbago elu ma zute Onye mere m ma sị, “I meela.” Site na aha Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Kwee ka Chineke Merie,” Liahona, Nov. 2020, 95.

  2. “Onye Amamiihe na Onye Nzuzu,” Akwụkwọ ukwe nke Ụmụntakịrị, 281.