Ọgbakọ Zuru ọha
Ọ bụghị ka Ụwa Si Enye
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Ọ bụghị ka Ụwa Si Enye

Akọrọngwa ndị anyị nwere mkpa ha iji mepụta ụbọchị na-aka amụke karịa ma wulite mkpata akụ na ụba nke ezigbo ọdị mma bụ ihe ewepụtara nuju niime ozi ọma nke Jizọs Kraist.

Tupu Ista nke mbụ ahụ mgbe Jizọs mechara emume nsọ oriri nsọ ọhụrụ nke O nyere Ndị Iri na abụọ, Ọ malitere okwu ije ọma n’ụdị eze ma chuwa ihu na Getsemane, nranye, na mkpọgide n’obe. Kaosiladị, ịhụta mmetụta na ikekwa ọbụna ụjọ zuru ụfọdụ niime ndịikom ahụ ahụ pụtara ihe, Jizọs gwara ha nke a (ma anyị onwe anyị):

“Ekwela ka obi unu daa mba: unu kwere na Chineke, kwerekwanụ na m. …

“Agaghị m apụ na-enyeghị unu nkasi obi: a ga M abịakwute unu. …

“Udo ka M na-ahapụrụ unu, udo nke m ka m na-enye unu: ọ bụghị ka ụwa si enye, ka m ga-esi enye unu. Unu enyela obi unu nsogbu, nke unu ji atụ ụjọọ.”1

Oge ihe isi ike na-abịa na ụwa anụ ahụ nke a, tinyere ndị nwere okwukwe, mana ozi nke Kraịst na-enye mmasi obi ike bụ na na-agbanyeghị na Ya onwe ya, nwa atụrụ eji achụ aja, ga-aga dị ka “atụrụ nọ niihu ndị na-abọ [ya]”2 Ọ ga-ebili ka osila dị, dị ka ọbụ abụ si kwuo, ị bụ “ebe mgbaba anyị na ume anyị, ezi onye enyemaka [anyị] niime [oge niile nke] nsogbu.”3

Na-ịghọta awa ndị siri ike chere Kraịst niihu dị ka Ọ na-aganiihu ebe obe ahụ na maka ndị ndị na-eso ụzọ Ya dị ka ha ga-ewegara ndị bi nụwa ozi ọma Ya noge akacha nwee ọganiihu, soro m ugbu a na ozi yiri nke a maka ndị otu Nzukọ nsọ nke Onye Nzọpụta nụbọchị ikpeazụ ndị a. Ọ nọ nọtụtụ ọnụọgụgụ ndị nọ na ama okwu Akwụkwọ nke Mọmọn e dere banyere esemokwu nke otu ụdị ma ọbụ nke ọzọ, sitere na agwa na-akpasu iwe ebighị ebi nke Laman na Lemuel ruo na agha ndị nke ikpeazụ gụnyere narị puku kwuru narị puku nke ndị agha. Otu nime mbunuuche nke doro anya maka nkwusi ike nke a bụ na niihi na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ ihe e dere maka ndị ga-ańa ntị ụbọchị ikpeazụ, ndị ode ndị a (ndị nke hụtara ọtụtụ agha nonwe ha) sitere nibu amụma dọọ anyị aka na ntị na ime ihe ike na ndọkụrịta ga-abụ akara njirimara nke mmekọrịta ụbọchị ikpeazụ ndị a.

Na-ezie, atụtụ m gbasara esemokwu ụbọchị ikpeazụ abụghị nnọọ nsinambụ. Puku afọ abụọ gara aga, Onye Nzọpụta dọrọ aka na ntị na noge ụbọchị ikpeazụ ndị a aga-enwe “agha, na asịrị agha niile,”4 mesịa na-asị na “udo [ga] apụ nụwa.”5 Na-ezia Eze nke Udo nke a, onye kuziri hoohaa na esemokwu si naka ekwensu,6 ga-eberịrị akwa, ya na Nna Ya nke eluigwe, maka ndị ahụ bi nelu ụwa noge nke anyị ndị nke “na-anaghị enwe mmetụta” akwụkwọ nsọ sịrị, ma ndị na-enweghị ike achọpụta otu esi ebikọ ọnụ nịhụnaanya.7

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, anyị na-ahụta oke ndọkụrịta, oke iwe, na agwa ọjọọ zuru ọha dị na gburugburu anyị. Ebe ọ kacha mma, ndudugandu nke ugbua enwebeghị Agha Ụwa nke Ugboro atọ ha ga-alụ ma ọbụla anyị enwetụbeghị nhụmiihe atụmatụ mkpata ego mba ụwa tisara etisa dị ka nke mere na1929 dubara na Oke Ịda mba. Ka osila dị, anyị na, ezute ihe dị ka Agha Ụwa nke Ugboro atọ nke na-abụghị ọgụ nke ịkụpịa ndị iro anyị kama nnwude nke na-akwado ụmụ Chineke ka ha na-adịkarị na njikere ịma ihe gbasara onye ọbụla niime ha na inye aka gwụọ nkụpịasị ndị ahụ anyị na-ahụta niime ụwa jupụtara na ndọkụrịta. Oke Ịda Mba anyị na-ezute ugbua enweghị ihe o nwere ime na nfunahụ nke nchekwa anyị ana ahụ anya ma o nwere karịa niihe gbasara enweghị ntụkwasị obi nke dị niime onwe anyị, ya na ezigbo ọnyụpaa nke enweghị okwukwe, olileanya, na afọ ọma niile gbara anyị gburugburu. Mana akọrọngwa ndị anyị nwere mkpa ha iji mepụta ụbọchị na-aka amụke karịa ma wulite mkpata akụ na ụba nke ezigbo ọdị mma na ebe anyị bi bụ ihe ndị ewepụtara nuju niime ozi ọma nke Jizọs Kraist. Anyị enweghị ike ekwe—ma ụwa nke a enweghị ike ekwe—ọdịda anyị itinye echiche nke ozi ọma ndị a na-mmesi ọgbụgba ndụ niile ike iji rụọ ọrụ nuju nonwe anyị na na mbara ọha.

Ya mere niime ụwa “nke ebili mmiri na-ebugharị, na- enweghị nkasi obi,” dị ka jehova kwuru na ọ ga-adị, kedụ ka anyị ga-esi chọta ihe Ọ kpọrọ “ọgbụgba ndụ nke … udopeace”? Anyị na-achọta ya site na ilekwasị Ya anya onye nke sịrị na Ya ga emere anyị ebere ma “site na obi ọma na-adịgide ruo ebighi ebi” ga-enye ụmụntakiri anyị udo.8 Na-agbanyeghị amụma ndị e buru na-eyi egwu na akwụkwọ nsọ ndị na-ebute obi nkoneelu na-ama ọkwa na udo ga-apụ nelu ụwa niile, ndị amụma, tinyere Russell M. Nelson nke anyị onwe anyị hụrụ naanya, akụziwo na nke ahụ apụtaghị na-aga anapụ anyị ya na-otu na-otu!9 Ya mere,na Ista nke a ka anyị gbalịa ime udo nụzọ nke onwe anyị, na-etinye amara ahụ na ọgwụ na-agwọ ọrịa nke Aja mgbaghara mmehie nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na onwe anyị na ndị ezi na ụlọ anyị na ndị niile anyị nwere ike irute nọ anyị gburugburu. Ebe ọkacha mma, ọbụna atụkarịcha naanya, kelabọ nke a na-agụgụ obi ka enyere anyị “na-ejighị ego na na-akwụghị ụgwọ.”10

Ụdịrị enyemaka ahụ na ụdịrị olileanya ahụ ka enwere oke mkpa ha niihi na niime ọgbakọ nke a zuru ụwa ọnụ taa ka enwere ọtụtụ ndị nwere ihe aka mgba na-esogbu ha—nke anụ ahụ, ma ọbụ nke mmetụta obi, nke mmekọrịta onye na ibe ya, ma ọbụ nke ego, ma ọbụ ọtụtụ ụdịrị nsogbu ndị ọzọ. Mana ọtụtụ niime ihe ndị a anyị esichaghị ike nke ọma ileba anya niime ha na nonwe anyị, maka enyemaka na udo ahụ anyị chọrọ abụghị ụdịrị nke “ụwa na-enye.”11 Mba, maka nsogbu ndị ahụ siri ike na-ezia anyị chọrọ ihe akwụkwọ nsọ kpọrọ “ike niile nke eluigwe,” ma ninweta ike ndịa anyị garịrị ebi ndụ nusoro ihe otu ụdịrị akwụkwọ nsọ ndị a kpọrọ “ụkpụrụ niile nke eziomume.”12 Ugbua, ịghọta njikọ ahụ dị netiti ụkpụrụ na ike bụ otu ihe ọmụmụ ndị bi nụwa na-enwetụbeghị ike ịmụta, otu ahụ ka Chineke nke eluigwe na ụwa siri kwuo!13

Ma gịnị bụ ụkpụrụ ndị ahụ? Ọdị mma, edepụtawo ha ugboro ugboro niime akwụkwọ nsọ, a kụzikwara ha ugboro ugboro niime ọgbakọ ndị dị ka nke a, na n’ọgbọ anyị, Onye amụma Josef Smith ka akuziiri ya ha na-azịza nye nkọwa nke ya onwe ya banyere akwa ahụ “Chineke m, Chineke m, gịnị mere iji hapụ m?”14 Na-oyi ahụ, na mkpọchi nỤlọ nga Liberty na-enweghị onye nlekọta, a kuziiri ya na ụkpụrụ niile nke eziomume gụnyere ụdịrị omume ọma ndị dị ka ndidi, ogologo ntachi obi, ịdị nwayọọ, na ịhụnaanya na-abụghị nke ihu abụọ.15 Iwezuga ụkpụrụ niile ndị ahụ, o doro nnọọ anya na anyị ga-emecha zute adịghị notu na mkpọrọmasị.

Banyere nke ahụ, ka m kwuo okwu ntakịrị banyere ụkọ nke ụkpụrụ nke eziomume ndị a dị noge nke anyị na nụfọdụ ebe. Dị ka iwu sịrị dị, a bụ m ụdịrị onye ama ama, nwere ihu ọcha, ma enwere ọtụtụ ihe dị mma ma na-enye obi ụtọ niime ụwa anyị. Na-ezia anyị kacha nwee ngọzi ndị ana ahụ anya karịa ndudugandu ọbụla na agụgụala, mana na omenaala 21st-century niile na ọtụtụ mgbe niime Nzukọ nsọ, anyị ka na-ahụta ndụ ndị nọ na nsogbu, ọtụtụ mgbuda omume ọma na-ebute ọtụtụ mbibi ọgbụgba ndụ na ọtụtụ obi mgbawa. Tụlee nkịrịka okwu nke eji atụnyere njehie nke ịkwa iko, ha abụọ jupụtara ebe niile na movies ma ọbụ na televishọn, ma ọbụ hụta mmaja nke ịkwa iko na ụdịrị ụzọ ihe ndị ọzọ na-ekwesịghị ekwesị anyị na-ahụta ebe ọ dị ukwuu na-ebe ana arụ ọrụ. Na ihe ndị gbasara ịdị ụcha nke ọgbụgba ndụ, ihe dị nsọ ọtụtụ mgbe ka eji eme ihe efu ma onye dị nsọ ọtụtụ mgbe ka ana akatọ. Na-ebe onye ọbụla nke ana anwa ọnwụnwa ije ije ma ọbụ ikwu okwu ma ọbụ ịkpa agwa nụdịrị ụzọ ndị a— “dị ka ụwa si enye,” ka asị nnọọ—atụla anya ya iduba na nhụmiihe na-enye udo; ana m ekwe gị nkwa na aha Onyenwe anyị na ọ gaghị eme. Ajọ omume enweghị ike inye ọńụ,”16 onye amụma mgbe gboo kwuru otu mgbe. Mgbe agbachara egwu, ahaghị ịkwụ ogbu opi ụgwọ, ma ọtụtụ mgbe ego ahụ bụ anya mmiri na ịkwa mmakwaara17

Ma ọbụ ikekwe anyị na-ahụta ụdịrị mmetọ na ihe na-anaghị enye ugwu ndị ọzọ. Ma na anyị ga-enwe ezi mkpachapụ anya dị ka ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị Jizọs Kraist ka anyị hapụ itinye aka nụdịrị agwa ọbụla dị otu ahụ. Onweghị otu anyị nwere ike iji nwee ikpe ọmụma nke ụdịrị mmetọ ọbụla ma ọbụ ụdịrị ụzọ ọchịchị aka ike ọbụla ma ọbụ mmanye ime ihe rụrụ arụ—na-abụghị nke ana ahụ anya ma ọbụ nke echiche ma ọbụ nke ikwu okwu Chukwu ma ọbụ ụdịrị ọbụla ọzọ. Echetara m inwe mmetụta ọnụnụ ọkụ nke Onyeisi Gordon B. Hinckley afọ ole na ole gara aga mgbe o kwuru okwu nye ndịikom Nzukọ nsọ banyere ndị ahụ ọ kpọrọ “ndị ọchịchị aka ike nebe obibi ha”:18

“Lee ka omume jọgburu onwe ya dị egwu na-eme eme ugbu a nke ịmetọ nwunye,” ọ sịrị. Nwoke ọbụla nọ niime Nzukọ nsọ nke a nke na-emetọ nwunye ya, onye nke na-eweda ya ala, nke na-akparị ya, nke na-achị ya naka ike etozughị oke ijide ọkwa nchụaja. … [Nwoke ahụ] etozughị oke ijide akwụkwọ nkwado nke ịba tempụl.”19 Nke ọzọ jọgbukwara onwe ya, ọ sịrị, bụ mmetọ ụmụaka nụdị ọbụla—ma ọbụ ụdịrị ụzọ mmetọ ọzọ.20

Nọtụtụ ụzọ, ma-akpachaghị anya, ndịikom, ndịinyom nwere okwukwe, ma ọbụna ụmụntakịrị nwere ike nwee amamikpe nke ikwu okwu na-adịghị mma, ọbụna okwu mbibi, nye ndị ahụ bụ ndị arachiri ọnụ nye ha site na-emume nsọ dị nsọ niime tempụl nke Onyenwe anyị. Onye ọbụla nwere oke inweta ịhụnaanya, inwe mmetụta udo, na inweta nchekwa na-ebe obibi. Biko, ka anyị gbaa mbọ ime ka gburugburu ogige ahụ dịrị otu ahụ. Nkwa nke ịbụ onye ome udo bụ na ịga enwe Mmụọ nsọ maka onye nsiso gị mgbe niile ma ngọzi niile ga-eso gị “na-enweghị ụzọ mmanye” si na-ebighị ebi ruo ebighị ebi.21 Onweghị onye chọrọ ire na-efe wara wara ma ọbụ okwu na-adịghị mma ma gaaniihu “kwee ukwe nke ịhụnaanya na-enye mgbapụta.”22

Ka m mechie ebe m si bido. Echi bụ Ista, oge maka ụkpụrụ niile nke eziomume nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya iji “gafee”—gafee ndọkụrịta na esemokwu, gafee ịda mba na njehie, ma na-ikpe azụ gafee ọnwụ. Ọ bụ oge ikwe nkwa nrube isi kpamkpam nokwu na omume nye Nwa atụrụ nke Chineke, onye “[buuru] nrịanrịa anyị, ma burukwa iru uju anyị,”23 na mkpebi Ya ịrụcha ọrụ nke mgbapụta maka anyị.

Na-agbanyeghị ngọnari na mgbu, na-agbanyeghị mmejọ na obi ịta mmiri, na ibu mmehie na iru uju nke ndị bi nụwa gbakọjuru, Ọkpara nke Chineke Dị ndụ ledatara anya nogologo ụzọ nke anụ ahụ, hụ anyị na ngwụcha izu ụka nke a, ma sị: “Udo ka M na-ahapụrụ unu, udo nke m ka m na-enye unu: ọbụghị dị ka ụwa si enye, ka m si enye unu. Unu enyela obi unu nsogbu, nke unu ji atụ ụjọ.”24 Nwee nụ Ista agọziri agọzi, jupụtara n’ọńụ, na udo. Ikwe omume ya na-ekwubeghị mbụ ka a na-akwụgo ụgwọ ya site naka Eze nke Udo, onye nke m ji obi m niile hụnaanya, onye nke Nzukọ nsọ nke a bụ nke ya, na onye nke m na-agba ama ya nobi m niile, ọbụna Onyenwe anyị Jizọs Kraịst, amen.