Ọgbakọ Zuru ọha
Njem Nke Onwe nke Nwa Chineke
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Njem Nke Onwe nke Nwa Chineke

Dị ka ụmụ ọgbụgba ndụ Chineke, anyị na-egosi ịhụnaanya, kwanye ugwu, lekọta, chekwaa ma nabata mmụọ ndị ahụ na-abịa site na ụwa tupu anụ ahụ.

Onye ọbụla n’ime anyị ka ọrịa mkpochapụ gburugburu ụwa metụtara, dị ka ezinaụlọ na ndị enyi na-atụghị anya gafeworo ndụ anụ ahụ. Ka m nakwere ndị atọ anyị anyị na-atụ uche ha nke ukwuu, na-anọchite anya ndị ahụ niile anyị hụrụ naanya nke ukwuu.

Foto, oyiyi
Nwanne nwoke na Nwanne nwanyị Nsondi

Nke a bụ Nwanne nwoke Philippe na Nwanne nwanyị Germaine Nsondi. Nwanne nwoke Nsondi, onye naara eje ozi dị ka petrak nke Stek Brazzaville Republic of Congo mgbe ọ nwụrụ. Ọ bụụrụ dibia ọgwụ onye kesaara ndị ọzọ ihe ọ maara n’eleghị anya na-azụ.1

Foto, oyiyi
Clara Ruano de Villareal

Nke a bụ Nwanne nwanyị Clara Elisa Ruano de Villareal sitere na Tulcán, Ecuador. Ọ nabatara ozi ọma eweghachitere mgbe ọ gbara afọ 34 ma bụrụ onye ndu ahụrụnanya. Ezinaụlọ ya siri laa n’udo site n’ịgụ abụ kacha masị ya, “A Ma M Na Onye Mgbapụta M Dị ndụ.”2

Foto, oyiyi
Ray Tuineau na ezinaụlọ ya

Nke a bụ Nwanne nwoke Ray Tuineau sitere na Utah, ya na ọmarịcha ezinaụlọ ya. Nwunye ya, Juliet, siri, “A chọrọ m [ụmụ m nwoke] ị [cheta nna ha ahụ] mgbe niile na-agbalị itinye Chineke mbụ.”3

Onyenwe anyị e kwuwo, “Unu ga-ebikọta ọnụ nihụnanya, nke mere na unu ga-akwa akwa maka nfunarị nke ndị nwụrụ anwụ.”4

Mgbe anyị na-ebe akwa, anyị nakwa ańụrị ọńụ na Mbilite n’ọnwụ dị ebube nke Onye Nzọpụta anyị. Nihi Ya, ndị anyị hụrụnanya na ndị enyi gaaniihu na njem ebighị ebi ha. Dịka Onyeisi Josef F. Smith kọwara: “Anyị enweghị ike echefu ha; anyị agaghị akwụsị ịhụ ha n’anya. … Ha agawo n’ihu; anyị na-aga n’ihu; anyị na-etolite dị ka ha toliteworo.”5 Onyeisi Russell M. Nelson kwuru, “Anya mmiri nke iru uju anyị … na-atụgharị bụrụ anya mmiri nke nchekube.”6

Anyị Maara banyere Ndụ tupu Ọmụmụ

Echiche ebighị ebi anyị anaghị nanị abawanye nghọta anyị nke ndị ahụ na-aganiihu njem ha gafee ndụ anụ ahụ kama nakwa emepe nghọta anyị nke ndị ahụ bidoro ngwa ngwa na njem ha ma nanị ugbua na-abanye ndụ anụ ahụ.

Onye ọbụla nke bịara elu ụwa bụ nwa nwoke ma ọbụ nwa nwanyị pụrụ iche nke Chineke.7 Njem nke onwe anyị ebidoghị na ọmụmụ. Tupu amụọ anyị, anyị nọkọtara ọnụ n’ụwa nke nkwado n’ebe anyị “natara ihe nkuzi nke mbụ [anyị] n’ụwa nke mmụọ.”8 Jehova gwara Jeremaya, “Tupu mụ akpụọ gị nime afọ a maara m gị; ma tupu gị apụta site n’ime akpa nwa a sachara m gị.”9

Ụfọdụ nwere ike jụọ ma ndụ o bidoro, site na ọkpụkpụ nke embrayo, ma ọbụ mgbe mkpụrụ obi bidoro ịkụ, ma ọbụ mgbe nwa ntakịrị nwere ike ibi ndụ ma ọ pụta na akpa nwa, mana maka anyị, enweghị ajụjụ nke ụmụ ndị nwanyị na ndị nwoke mmụọ Chineke nọ na njem nke onwe ha na-abịa n’elu ụwa ịnata anụ ahụ na nhumiihe nke ndụ anụ ahụ.

Dị ka ụmụ ọgbụgba ndụ Chineke, anyị na-egosi ịhụnaanya, kwanye ugwu, lekọta, chekwaa ma nabata mmụọ ndị ahụ na-abịa site na ụwa tupu anụ ahụ.

Onyinye Dị ịtụnaanya nke Ụmụnwanyị

Maka onye inyom, ịmụ nwa nwere ike bụrụ otu aja dị ukwuu nke ahụrụ anya, nke na-emetụ n’obi, na nke ego. Anyị hụrụ naanya ma nwee nkwanye ugwu nye ndịinyom nke Nzukọ nsọ a. Na ọgụgụisi na amamihe, ị na-ebu ibu arọ nke ezinaụlọ gị. I na-ahụ naanya. I na-eje ozi. I na-achụ aja. I na-agba okwukwe ume, lekọta ndị ahụ nọ na mkpa, na i na-enye aka n’obodo.

Ọrụ Dị nsọ nke Nchekwa nke Ndụ

Afọ ndị gara aga, inwe mmetụta dị omimi n’ihi ọnụọgụgụ nke ite ime n’ụwa, Onyeisi Gordon B. Hinckley gwara ndịinyom Nzukọ nsọ okwu jiri mkpụrụ okwu nke dabaara anyị taa. O siri: “Unu ndị bụ ndị nwunye na ndị nne bụ ihe jidere ezinaụlọ. Unu na-amụ ụmụ ndị ahụ. Ụdị ọrụ dị ukwuu na nke dị nsọ nke ahụ bụ. … Kedụ ihe mere anyị enweghi nsọpụrụ maka ịdị ọcha nke ndụ mmadụ? Ite ime bụ ihe ọjọọ, jọgburu onwe na-asọ oyi, nke na-ekpochapụ ụwa. A na m arịọ ndịinyom Nzukọ nsọ izere ya, iguzogide ya, izere ọnọdụ ikwenye ndị ahụ na-eme ya a dịka ọ bụrụ nwere mmasị. Enwere ike nwee ọnọdụ ole ma ole nke nwere ike ime, kama ha pere mpe nke ukwuu.10 … Unu bụ ndị nne nke ụmụ ndị nwoke na nwanyị Chineke, ndị ndụ ha dị nsọ. Ichekwa ha bụ ọrụ enyere dị nsọ nke a na-enweghị ike idebe na-akụkụ.”11

Okenye Marcus B. Nash kọọrọ m akụkọ otu nwanyị ọma gbara afọ 84 onye, mgbe a na-eme ajụjụ ọnụ nke baptizim ya, “nakweere ite ime [ọtụtụ afọ gara aga].” Na mmetụta si n’obi, o kwuru: “E buruwo m ibu arọ ahụ nke ite ime otu nwa ụbọchị niile nke ndụ m ruo afọ iri anọ na isii. … Enweghị ihe m mere ga-ewepụ mgbu na ikpe ọmụma ahụ. E nweghị m olileanya ruo mgbe a kuziiri m oziọma nke Jizọs Kraịst. A mụrụ m otu esi echegharị … ma na ntabi anya ejupụtara m na olileanya. N’ikpezaụ a bịara m mata na enwere ike ịgbaghara m ma ọbụrụ na m chegharịa site na njọ m n’ezie.”12

Ụdị obi ekele anyị nwere maka onyinye dị nsọ ndị nke nchegharị na mgbaghara.

Gịnị ka Anyị Nwere ike Ime?

Kedụ ihe bụ ọrụ anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst jupụtara n’udo? Ka anyị debe iwu nsọ nke Chineke, kuziere ha ụmụ anyị, ma kesaa ha n’etiti ndị ọzọ ndị dị njikere ige ntị.13 Ka anyị kesaa oke mmetụta anyị banyere nsacha nke ndụ anyị na ndị ahụ na-eme mkpebi n’obodo. Ha nwere ike ha agaghị anabata n’uju ihe anyị kwere, mana anyị na-ekpe ekpere na ha ga-aghọta n’uju karịa ihe kpatara, maka anyị, mkpebi ndị ahụ gafere nnọọ ihe otu onye chọrọ maka ndụ ya onwe ya.

Ọ bụrụ na nwa a na-echeghị eche na-abịa, ka anyị jiri ịhụnaanya, mgbam ume, na, mgbe achọrọ, enyem aka ego, inye onye nne mgbam ume n’ikwere ka amụọ nwa ya ma gaa nihu na njem ya na ndụ anụ ahụ.14

Ịma mma nke Ịkpọrọ nwa

N’ezinaụlọ anyị, agọziwo anyị n’ụzọ n’enweghị atụ dịka iri afọ abụọ gara aga, otu nwa agbọghọ nta gbara afọ 16 matara na ya dị ime. Ya na nna nwa ya alụbeghị, na ha enweghị ihe ha hụrụ ga-eme ha agakọta n’ihu ọnụ. Onyeinyom nta ahụ kwere na ndụ ya bu na-afọ dị oke ọnụ. Ọ mụrụ nwa nwanyị ma kwere ka ezinaụlọ nwere ezi omume kpọrọ ya dị ka nke onwe ha. Nye Bryce na Jolinne, ọ bụụrụ aziza nye ekpere ha. Ha gụrụ ya Emily ma kuziere ya ịtụkwasị obi na Nna ya nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst.

Foto, oyiyi
Emily na Christian

Emily tolitere. Ụdị ekele anyị nwere na Emily na nwa nwa nwoke anyị, Christian, hụrụ onwe ha naanya ma lụọ n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Emily na Christian ugbua nwere nwa nwanyị nke ha.

Foto, oyiyi
Emily na nwa ya nwanyị

Emily na nso nso a dere: “N’ime ọnwa itolu niile ndịa nke afọ ime, enwetara m oge ịtụgharị uche na ihe ndị mere [nke] ọmụmụ nke m. E chere m maka nne mụrụ m, onye gbara nanị afọ 16. Dị ka m gabigara ihe ụfụ na mgbanwe ndị afọ ime wetere, e nweghị ike ịghara iche otu o sị sie ike na afọ nta nke 16. … Anya mmiri na-agba ọbụna ugbua dị ka m na-eche maka nne mụrụ m, onye maara na ya enweghị ike inye m ndụ [ọ chọrọ maka m ma n’echeghị maka onwe ya tinyere] m maka ndị ga-akpọrọ m. E nweghị m ike iche ihe ọ gabigara n’ọnwa itolu ndị ahụ—ebe elere ya anya ịma ya ikpe dị ka ahụ ya gbanwere, nhumiihe ndị gbanahụrụ ya, mara na n’ikpeazụ nke ọrụ nke ịhụnaanya nke onye nne a, ọ ga etinye nwa ya n’aka onye ọzọ. Obi jupụtara m n’ekele maka nhọrọ ya na-abụghị maka ọdịmma onwe ya nanị, na ọ họrọghị iji ohere nhọrọ ya n’ụzọ nke ga-ewezuga nke m. Emily mechiri okwu, “Obi dị m nnọọ ekele maka atụmatụ dị nsọ nke Nna nke Eluigwe, maka nne na nna m dị ịtụnaanya ndị [hụrụ m n’anya ma na-elekọta] m, na maka tempụl ebe anyị nwere ike dị ka ezinaụlọ rachikọta onwe anyị maka ndụ ebighị ebi.”15

Foto, oyiyi
Kolaaji Foto

Onye nzọpụta “kpọọrọ otu nwa ntakịrị, ma tinye ya n’etiti ha: ma mgbe ọ jideworo ya n’aka ya, ọ gwara ha, Onye ọbụla nke ga-anabata otu nime ụmụaka [ndịa] n’aha m, anabatawo m.”16

Mgbe A Na-enwetebeghị Ọchịchọ ndị Ziri ezi

A na m ekwupụta ịhụnaanya na ọmịiko m maka di na nwunye ezi omume ndị lụrụ ma ha enweghị ike ịmụta ụmụ ndị ha chọsiri ike inwete na ụmụnwanyị na ụmụnwoke ndị ahụ ndị n’enwebeghị ohere ịlụ dị ka usoro iwu nke Chineke. Mbunobi nke ndụ ndị enwetebeghị siri ike nghọta ma ọbụrụ na-ele ya anya nanị site na anya nke ndụ anụ ahụ. Dịka onye odịbo nke Onyenwe anyị, a na m ekwe gị nkwa na dị ka ị na enwe okwukwe na Jizọs Kraịst na ọgbụgba ndụ gị, ị ga anata ngọzi dị mma na ndụ a ma ọchịchọ nke ezi omume gị n’oge ebighị ebi nke Onyenwe anyị.17 E nwere ike inwe ańụrị na njem nke ndụ anụ ahụ ọbụna mgbe anyị enweteghị olileanya nke ezi omume anyị.18

Mgbe amụchara, ụmụaka na-aganiihu ịchọ enyem aka anyị. Ụfọdụ chọsiri ya ike. Afọ ọbụla site n’aka bishọp ndị nwere obi ọma na onyinye mmepụ aka gị nke onyinye obubu ọnụ na ego enyem aka niile, ndụ nde kwuru nde na nde kwuru nde ụmụaka ka a gọziri. Otú Ndịisi Mbụ na nsonso a mara ọkwa nde dọla 20 agbakwunyere iji nyere UNICEF aka na mgbalị ha zuru ụwa iji nye ijeri vaccine abụọ.19 Chineke hụrụ Ụmụntakịrị n’anya.

Mkpebi ahụ Dị nsọ Ịmụ Nwa

Ọ bụ ihe mwute na ọbụna na ụfọdụ mba nke ụwa kachasị eme nke ọma, ụmụ ole ma ole ka a na amụ ebe ahụ.20 “Iwu nsọ nke Chineke maka ụmụ Ya ịmụba na imejupụta ụwa ka dị iré.”21 Mgbe a ga-amụ na ole a ga-amụ bụ mkpebi nke onwe a na-eme n’etiti di na nwunye na Onyenwe anyị. Na okwukwe na ekpere, mkpebi ndịa dị nsọ nwere ike bụrụ nhumiihe mara mma, ekpughere.22

A na m akọ akụkọ ezinaụlọ Laing nke Southern California. Nwanne nwanyị Rebecca Laing dere:

Foto, oyiyi
Ezinaụlọ Laing

“N’oge sọma nke 2011, ndụ nke ezinaụlọ anyị dịịrị ka o zuru oké. Anyị nwere ańụrị n’ọlụlụ anyị anyị na ụmụ anọ anyị—gbara afọ 9, 7, 5, and 3. …

Afọ ime m na ịmụ nwa m [abụrụworịị] nke oke egwu ma agọziri anyị [nke ọma] ịnwe ụmụ anọ, [na-eche] na ezinaụlọ anyị zuru ezu. Na Ọktoba ka anyị na-ege ọgbakọ zuru ọha, e nwetere m mmetụta doro anya na anyị ga-amụta nwa ọzọ. Dị ka LeGrand na mụ tụgharịrị ma kpee ekpere, … anyị maara na Chineke nwere atụmatụ dị iche maka anyị karịa ka anyị nwere maka onwe anyị.

Emesịa mgbe anyị gabigasịrị afọ ime na ọmụmụ rara ahụ, eji ọmarịcha nwa nwanyị gọzie anyị. Anyị gụrụ ya Brielle. Ọ bụụrụ ọrụ ebube. Nwa oge amụchara ya, ka m ka nọ nime [ọnụ ụlọ ọmụmụ], a nụtara m olu nke Mmụọ doro anya: ‘E nwere otu ọzọ.’

“Afọ atọ gasịrị, ọrụ ebube ọzọ, Mia. Brielle na Mia bụ ọńụ dị egwu nye ezinaụlọ anyị.” O mechiri, “Inwe obi gheoghe maka ntụzi aka nke Onyenwe anyị na isoro atụmatụ Ya maka anyị mgbe niile ga-ewetere anyị ańụrị kacha karịa … ịdabere na nghọta nke onwe anyị.”23

Foto, oyiyi
Brielle na Mia Laing

Onye nzọpụta hụrụ ọmarịcha nwa ọbụla naanya.

“Ma ọ kpọọrọ ụmụaka ha, n’otu n’otu, ma gọzie ha. …

“Ma … ha chewere anya ha nihu eluigwe, … ma ha hụrụ ndị mmụọ ozi na-agbadata site neluigwe … n’etiti ọkụ; ma [ndị mmụọ ozi ahụ] … gbara ụmụntakịrị ndị ahụ okirikiri, … ma ndị mmụọ ozi lekọtara ha.”24

A na m agba ama na njem nke onwe gị dịka nwa Chineke ebidoghịrị gị dị ka ikuku ụwa nke mbụ kwobatara n’ime akpa ume gị, ma ọ gaghị akwụsị mgbe ị ga-eku ume ikpeazụ nke ndụ anụ ahụ gị.

Ka anyị mgbe niile cheta na nwa mmụọ ọbụla nke Chineke na-abịa n’ụwa maka njem nke onwe ya.25 Ka anyị nabata ha, chekwaa ha, ma mgbe niile hụ ha n’anya. Dị ka unu na anabata ọmarịcha ụmụ ndịa n’aha nke Onye nzọpụta ma nyere ha aka na njem ebighị ebi ha, a na m ekwe unu nkwa na Onyenwe anyị ga-agọzi unu ma wụkwasị ịhụnaanya na nnabata Ya n’elu unu. Na aha Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Nzikọrịta-ozi nke onwe

  2. Nzikọrịta-ozi nke onwe Lee “A maara Na Onye-Mgbapụta M Dị Ndụ,” Abụ, no. 136.

  3. Nzikọrịta-ozi nke onwe

  4. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 42:45.

  5. Joseph F. Smith, in Conference Report, Apr. 1916, 3.

  6. In Trent Toone, “‘A Fulness of Joy’: President Nelson Shares Message of Eternal Life at His Daughter’s Funeral,” Church News, Jan. 19, 2019, thechurchnews.com.

  7. Lee “Ezị-na-ụlọ: Ọkwa amara nye ỤwaChurchofJesusChrist.org.

  8. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 138:56

  9. Jeremaịa 1:5. The New Testament tells of the unborn John the Baptist leaping in the womb as Elisabeth encountered Mary, who was expecting the baby Jesus (lee Luk 1:41).

  10. Ọnọdụ iwu kwadoro nke Nzukọ nke Jisọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a

    nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a kwere na ịdị ọcha nke ndụ mmadụ. Therefore, the Church opposes elective abortion for personal or social convenience, and counsels its members not to submit to, perform, encourage, pay for, or arrange for such abortions.

    “The Church allows for possible exceptions for its members when:

    “Pregnancy results from rape or incest, or

    “A competent physician determines that the life or health of the mother is in serious jeopardy, or

    “A competent physician determines that the fetus has severe defects that will not allow the baby to survive beyond birth.

    “The Church teaches its members that even these rare exceptions do not justify abortion automatically. Abortion is a most serious matter and should be considered only after the persons involved have consulted with their local church leaders and feel through personal prayer that their decision is correct.

    “The Church has not favored or opposed legislative proposals or public demonstrations concerning abortion” (“Abortion,” Newsroom, newsroom.ChurchofJesusChrist.org; see also General Handbook: Serving in The Church of Jesus Christ of Latter-day Saints, 38.6.1, ChurchofJesusChrist.org).

  11. Gordon B. Hinckley, “Walking in the Light of the Lord,” Ensign, Nov. 1998, 99; Liahona, Jan. 1999, 117.

    Onyeisi Gordon B.Hincley kwuru:

    “Abortion is an ugly thing, a debasing thing, a thing which inevitably brings remorse and sorrow and regret.

    “While we denounce it, we make allowance in such circumstances as when pregnancy is the result of incest or rape, when the life or health of the mother is judged by competent medical authority to be in serious jeopardy, or when the fetus is known by competent medical authority to have serious defects that will not allow the baby to survive beyond birth.

    “But such instances are rare, and there is only a negligible probability of their occurring. In these circumstances those who face the question are asked to consult with their local ecclesiastical leaders and to pray in great earnestness, receiving a confirmation through prayer before proceeding” (“What Are People Asking about Us?,” Ensign, Nov. 1998, 71; Liahona, Jan. 1999, 83–84).

  12. Lee Neil L. Andersen, The Divine Gift of Forgiveness (2019), 25.

    On one occasion in France, during a baptismal interview, a woman spoke to me of her abortion of many years before. Obi juru m n’ekele maka ịdị mma ya. E mere ya baptizim. Ihe ruru otu afọ gasịrị, a natara m oku ekwe ntị. This wonderful woman in the year since her baptism had been taught by the Holy Ghost. Ọ naara ebe akwa: “I chetara … m gwara gị maka ime m tere afọ ole ma ole gara aga? E nwere m mwute maka ihe m meworo. Mana afọ ndịa gara aga agbanwewo m. … Obi m atụgharịwo chewe ihu na Onye nzọpụta. … I am so pained by the seriousness of my sin that I have no way to restore.”

    I felt the Lord’s immense love for this woman. Onyeisi Boyd K. Packer kwuru: “Restoring what you cannot restore, healing the wound you cannot heal, fixing that which you broke and you cannot fix is the very purpose of the atonement of Christ. When your desire is firm and you are willing to pay the ‘uttermost farthing’ [lee Matiu 5:25–26], the law of restitution is suspended. Your obligation is transferred to the Lord. He will settle your accounts” (“The Brilliant Morning of Forgiveness,” Ensign, Nov. 1995, 19–20). I assured her of the Savior’s love. The Lord not only lifted the sin from her; He strengthened and refined her spirit. (Lee Neil L. Andersen, The Divine Gift of Forgiveness, 154–56.)

  13. Lee Dallin H. Oaks, “Protect the Children,” Liahona, Nov. 2012, 43–46.

  14. Safeguarding the lives of a daughter or son of God is also the responsibility of the father. Every father has an emotional, spiritual, and financial responsibility to welcome, love, and care for the child coming to earth.

  15. Nzikọrịta-ozi nke onwe

  16. Mak 9:36–37

  17. Lee Neil L. Andersen, “A Compensatory Spiritual Power for the Righteous” (Brigham Young University devotional, Aug. 18, 2015), speeches.byu.edu.

  18. Lee Dallin H. Oaks, “The Great Plan of Happiness,” Ensign, Nov. 1993, 75; see also Russell M. Nelson, “Choices,” Ensign, Nov. 1990, 75.

  19. Lee “Bishop Caussé Thanks UNICEF and Church Members for COVID-19 Relief,” Newsroom, Mar. 5, 2021, newsroom.ChurchofJesusChrist.org.

  20. For example, if the United States had maintained its fertility rate of 2008, just 13 years ago, there would be 5.8 million more children alive today (see Lyman Stone, “5.8 Million Fewer Babies: America’s Lost Decade in Fertility,” Institute for Family Studies, Feb. 3, 2021, ifstudies.org/blog).

  21. Ezị-na-ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” ChurchofJesusChrist.org. Akwụkwọ nsọ dere na “ụmụ bụ onyinye nke Onyenwe anyị” (Abụ ọma 127:3 Lee Russell M. Nelson, “How Firm Our Foundation,” Liahona, July 2002, 83–84; see also Dallin H. Oaks, “Truth and the Plan,” Liahona, Nov. 2018, 27.

  22. Lee Neil L. Andersen, “Children,” Liahona, Nov. 2011, 28.

  23. Nzikọrịta ozi nke onwe, Mar. 10, 2021.

  24. 3 Nifaị 17:21, 24

  25. “In reality, we are all travelers—even explorers of mortality. We do not have the benefit of previous personal experience. We must pass over steep precipices and turbulent waters in our own journey here on earth” (Thomas S. Monson, “The Bridge Builder,” Liahona, Nov. 2003, 67).