Ọgbakọ Zuru ọha
Mmegide na-akpasu Iwe
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Mmegide na-akpasu Iwe

Jisọs Kraịst ghọtara mmegide ma nwee ike iweta ajụ ya.

Nime afọ 1994, enwere mgbukpọ mere nime obodo nọ na Ọwụwa Anyanwụ Afịrịka nke Rwanda nke esemokwu agbụrụ siri ike butere. Atụmatụ nile bụ na e gburu ihe karịrị ọkara nde mmadụ.1 Na ụzọ a maara amara, ndị Rwanda, na ebe ọdị ukwuu, emeziela,2 kama ihe omume ndịa ka na adapụta.

Afọ iri gara-aga, dịka m gara nleta na Rwanda, mụ na nwunye m na onye njem ọzọ malitere ịkpa nkata na ọdụ ụgbọ elu Kigali. O bere akwa gbasara mmegide nke mgbukpọ ahụ ma were nwute na-egbu mmụọ jụọ, “Ọbụrụ na Chineke nọ, ọbụ na Ọ gaghị eme ihe ọbụla gbasara ya?” Maka nwoke nke a—na ọtụtụ nime anyị—ịta ahụhụ na mmegide ọjọọ nwere ike ịdị iche na eziokwu nke Nna nke Elu-igwe nwere obiọma. Ma Ọ dị ire, Ọ dị obiọma, ma Ọ hụrụ nwa Ya ọbụla naanya nke ọma. Nkewa nke a bidoro kemgbe ụwa ma enweghị ike ịkọwa ya na ịda ụda dị mfe ma-ọbụ ihennyapade bọmpa.

Ibido na enwe uche banyere ya, ka anyị nyocha ụzọ mmegide dị iche iche. Tulee ezinaụlọ ebe nwata ọbụla na enweta ego izu-ụka ọbụla maka ịrụ ụmụ obere ọrụ ụlọ. Otu nwa-nwoke, Jọn, zụtara kandi; otu nwa-nwanyị, Anna, chekwara ego ya. Nikpeazụ, Anna zụrụ onwe ya igwe. John chere na ọbụ mmegide na Anna nwetara igwe mgbe ya nwa enweghị. Kama ọbụ nhọrọ ndị nke Jọn butere ahaghị otu ahụ, ọbụghị omume nke nne na nna. Mkpebi nke Anna ịhapụ mbịaju akpịrị nke mgbe ahụ na ịta kandi abụghị mmegide ọbụla nye Jọn nihi na o nwere otu ohere ahụ dịka nwanne ya nwanyị.

Mkpebi anyị nwere ike na otu aka ahụ mepụta uru ma-ọbụ ọghọm na ogologo oge. Dịka Onye-nwe anyị kpughere, “Ọbụrụ na onye ọbụla e nweta mmụta na akọn’uche na ndụ nke a karịa site na ịrụsi ọrụ ike na irube-isi ya karịa onye ọzọ, ọ ga-enwe nnukwu uru n’ụwa na-abịa.”3 Mgbe ndị ọzọ natara uru maka mkpebi ha dị uchu, anyị agaghị ekpebi ozugbo na emegidele anyị mgbe anyị nwekwararịị otu ohere ahụ.

Ịma-atụ nke mmegide ọzọ sitere na ọnọdụ nke nwunye m, Ruth, gabigara dịka nwata. Otu ụbọchị; Ruth matara na nne ya na akpọrọ nwanne ya nwanyị nta, Merla, ịzụta akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ. Ruth mere mkpesa, “Nne, ọ dịghị nma! Merla nwetara akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ ikpeazụ.”

Nne Ruth jụrụ, “Ruth, akpụkpọ ụkwụ gị ọ bara gị?”

Ruth zara, “ee, Nke ọma.”

Nne Ruth mgbe ahụ sịrị, “Akpụkpọ ụkwụ nke Merla anaghị kwa aba ya.”

Ruth kwenyere na nwatakịrị ọbụla nime ezinaụlọ kwesịrị inwe akpụkpụ ụkwụ bara aba. Agbanyeghị na Ruth gara achọ inwe akpụkpọ ụkwụ ọhụrụ, echiche ya nke mmegide pụrụ mgbe ọhụrụ ọnọdụ ndị a site na echiche nne ya.

Ụfọdụ mmegide anaghị ekwe nkọwa; mmegide na enweghị nkọwa na-akpasu iwe. Mmegide na-abia site na inwe ahụ ndị na-ezughị oké, merụrụ ahụ, ma-ọbụ ọrịa. Ndụ nke anụ ahụ bụ ihe mmegide nezie. Amụrụ ụfọdụ na ụba; ndị ọzọ abụghị. Ụfọdụ nwere nne na nna hụrụ ha nanya; ndị ọzọ enweghị. Ụfọdụ na ebi ọtụtụ afọ; ndị ọzọ ole na ole. Ma ọnaga. Ụfọdụ mmadụ na eme mmejọ na-emerụ ahụ ọbụna mgbe ha na-anwa ime ihe ọma. Ụfọdụ na-ahọrọ ịghara ibelata mmegide mgbe ha nwere ike. Nụzọ nsogbu, ụfọdụ mmadụ na-eji ohere nhọrọ Chineke nyere ha emegbu ndị ọzọ mgbe ha ekwesịghị.

Mmegide dị iche iche nwere ike pụta, ịmepụta sunami nke mmegide karịrị akarị. Dịka ọmụmaatụ, ọrịa mkpochapụ ụwa COVID-19 ahụ nụzọ dị iche iche metụtara ndị ahụ nwerela ọrịa dị iche iche, nọ ọnọdụ inweta ọghọm dị iche iche. Obi na-egbu m mgbu maka ndị na-ahụ na-ezute ụdị mmegide ndị a, kama a na m ama ọkwa na obi mgbu m na Jizọs Kraịst ghọtara ma mmegide ma nwekwara ike inye ajụ ya. Onweghị ihe dị ka mmegide O diri. Ọ dịghị nma na Ọ buru mgbu na mkpagbu nile nke ụmụ mmadụ. Ọ dịghị nma na Ọ tara ahụhụ maka mmehie na emetaghị nile nke m na nke unu. Kama Ọ họrọ ime otu ahụ maka ịhụnanya O nwere ebe anyị nọ na maka Nna nke Elu-igwe Ọ ghọtara nke ọma ihe anyị na agabiga.4

Akwụkwọ-nsọ dere na ndị Izrel mgbe ochie mere mkpesa na Chineke anaghị emeta ha mma. Na nzaghachi, Jehova jụrụ, “Nwanyị o nwere ike chefuo nwa ya na-ańụ ara, nke na ọ gaghị enwe ọmịiko narụ nwa nwoke nke akpa-nwa ya?” Dịka ihe na-agaghị ekwe omume na nne nwere ịhụnaanya ga-echefu nwa o ku na-aka, Jehova kwupụtara na nnukwu ịhụnanya Ya guzosiri ike karịa. Ọ kwadoro: “Ee, ha nwere ike ichefu, mana a gaghị M echefu gị. Lee, akanyewo m unu n’elu ọba aka m; mgbidi unu ha nọ n’iru m oge nile.”5 Nihi na Jizọs Kraịst diri aja mgbaghara mmehie, na enweghị ọgwụgwụ, O nwere ezigbo ọmịiko nebe anyị nọ.6 Ọ maara anyị mgbe nile na ọnọdụ anyị nile.

Na ndụ anụ ahụ, anyị nwere ike “bia na-atụghị egwu” na ebe Onye-nzọpụta nọ ma nata ọmịiko,ọgwụgwọ, na enyemaka.7 Ọbụna ka anyị na-ata ahụhụ enweghị nkọwa, Chineke nwere ike gọzie anyị nụzọ dị mfe, nụzọ na-enweghị ihe ọbụ, na ụzọ ndị dị mkpa. Dịka anyị na-amụta ịnabata ngọzi nile ndị a, ntụkwasị obi anyị na Chineke ga-abawanye. Na mgbe ebighị ebi, Nna nke Elu-igwe na Jizọs Kraịst ga-edozi mmegide nile. O doro anya na anyị chọrọ ịma; olee na mgbe Olee otu Ha ga eji eme ya? Ole mgbe Ha ga eji eme ya? Na mmụta nke m, Ha ekpughebeghị olee ma-ọbụ olee mgbe.8 Ihe m mara bụ na Ha ga-eme.

Nime ọnọdụ mmegide nile, otu nime ọrụ anyị nwere bụ ịtụkwasị obi na “mmegide nile gbasara ndụ nwere ike dị nma site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.”9 Jizọs Kraịst meriri ụwa ma “buru” mmegide nile. Nihi Ya, anyị nwere ike nwee udo nime ụwa nke a ma nwee obi ike10 Ọbụrụ na anyị nye Ya ohere, Jizọs Kraịst ga-edo mmegide ahụ nsọ ka ọbụrụ maka uru anyị.11 Ọ bụghị naanị na Ọ ga-akasi anyị obi ma weghachite ihe furu efu;12 Ọ ga-eji mmegide ahụ maka uru anyị. Mgbe o ruru na olee na olee mgbe, anyị kwesịrị ịmata ma nabata, dịka Alma mere, “ọdịghị ihe o mere; nihi na Chineke matara ihe nile ndị a; ma o zuworo m ịmata na otu a ka ọ dị”13

Anyị nwere ike ijide ajụjụ anyị gbasara olee na olee mgbe maka emecha ma lekwasị anya na ịzụlite okwukwe niime Jizọs Kraịst, na O nwere ma ike imezi ihe nile ma na-enwe agụụ ime otú ahụ.14 Maka anyị isi ọnwụ ịmata olee ma-ọbụ olee mgbe bụ ihe enweghị isi ma, emesịa, mmachi.15

Dịka anyị na-azụlite okwukwe nime Jizọs Kraịst, anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike ịdị ka Ya. Mgbe ahụ anyị ewere ọmịiko leta ndị ọzọ ma gbalia ibelata mmegide ebe anyị hụrụ ya;16 anyị nwere ike gbalia mezie ihe nile anyị nwere ike ime. N’ezie, Onye-nzọpụta tụziri aka na anyị “kwesịrị ịnọ noke agụụ nichụso ihe ọma, ma mee ọtụtụ ihe site nọchịchọ nke [onwe] anyị, ma na-eweta na mmezu nnukwu ezi-omume.”17

Otu onye nọ na oke agụụ ibuso mmegide agha bụ ọka iwu Bryan Stevenson. Ọrụ ọka iwu ya nime United States ka araara nye ịgbachitere ndị eboro ebubo na-ezighị ezi, iweta na mmechi ntaramahụhụ gabigara óké, na ichebe oke a maara amara ruuru mmadụ. Afọ ole na ole gara aga, Mz. Stevenson gbachiteere otu nwoke eboro ebubo ụgha nke igbu mmadụ ma a maa ya ikpe ọnwụ. Mr.Stevenson rịịọrọ ndị ụka nke nwoke ahụ nọ nogige ha maka nkwado, ọbụlaghị na nwoke ahụ anaghị aga nzukọ-nsọ ya nke ọma ma bụrụ onye a na-eleda anya nime obodo maka a maara ya nke ọma ka onye na-akwa iko.

Na ịkọwara ndị ọgbakọ ihe kacha dị mkpa, Mz.Stevenson kọrọ ha akụkọ ihe gbasara otu nwanyị e boro ebubo ịkwa iko onye nke a kpọtara niihu Jizọs. Ndị ebubo chọrọ ka atụgbuo ya na-okwute, kama Jizọs sịrị, “Onye emehiebeghị, ya buru ụzọ tụọ ya okwute.”18 Ndị na-ebo nwanyị ahụ ebubo lara azụ. Jizọs amaghị nwanyị ahụ ikpe kama gwa ya ka omehiekwala ọzọ.19

Mgbe ọ kọchara akụkọ a, Mz.Stevenson hụrụ na ezi omume nke onwe, ụjọ, na iwe emeela ọbụna ndị okpukperechi ka ha tuọ ndị na-asụ ngọngọ okwute. O wee kwuo, “Anyị ekwesịghị ikwe ka nke ahụ mee,” ma ọ gbara ndị ọgbakọ ahụ ume ka ha bụrụ “ndị na-aghọta okwute.”20 Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, atụghị nkume bụ nzọụkwụ mbụ na iji ọmịiko emeso ndị ọzọ. Nzọụkwụ nke abụọ bụ ịgbali ịghọta okwute nke ndị ọzọ tụrụ.

Otu anyị si eme uru na ọghọm nile bụ akụkụ nnwale nke dị na ndụ. A ga-ekpe anyị ikpe ọ bụghị site na ihe anyị kwuru kama site na otu anyị jiri meso ndị adịghị ike na ndị na-enweghị mmadụ21 Dịka Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, anyị na-achọ isoro ọmụmaatụ nke Onye Nzọpụta, ịdị na-eme ihe ọma mgbe niile.22 Anyị na-egosipụta ịhụnanya anyị nwere maka onye agbataobi anyị site na ịhụ na ụmụ nke Nna nke Elu-igwe nwere ugwu.

Anyị buru nuche uru na ọghọm nke onwe anyị, ntụgharị uche dị mma. Maka Jọn ịghọta ihe mere Anna jiri nweta igwe ahụ gosiri ihe. Maka Ruth ịhụta mkpa akpụkpọ ụkwụ dịịrị Merla site na anya nne ya bụ nkuzi ihe. Ịgbali iji anya ebigh-ebi lee ihe nile nwere ike idoanya. Dịka anyị na-adịkarị ka Onye-nzọpụta, anyị na-azụlitekwu ọmịiko, nghọta, na afọ-ọma.

Ka m laghachi na ajụjụ nke onye njem ibe anyị jụrụ na Kigali onye bere akwá maka mmegide nke mgbukpọ ndị Rwanda ma jụọ, “Ọbụrụ na Chineke nọ, ọbụ na Ọ gaghị eme ihe ọbụla gbasara ya?”

Na ebelataghị ahụhụ ahụ sitere na mgbukpọ, ma ka anyị kwetachara na aghọtaghị ụdị ahụhụ ahụ, anyị zara na Jizọs Kraịst emewo ihe gbasara mmegide nke mbibi ahụ.23 Anyị kọwara ọtụtụ iwu ozioma gbasara Jizọs Kraịst na Mweghachi nke Nzukọ nsọ Ya.24

Mgbe emechara, onye anyị matara jụrụ, na anya mmiri, “Ọ pụtara na o nwere ihe m nwere ike imere nne na nna m nwụrụ anwụ na nwanne nna m nke nwoke?”

Anyị sịrị, “ee, wo!” Anyị gbara-ama mgbe ahụ na mmegide nile gbasara ndụ nwere ike dị mma site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst ma na site na ikike Ya enwere ike jikọta ezi na ụlọ nile ọnụ ruo mgbe ebighị ebi.

Mgbe e zutere mmegide, anyị nwere ike wezuga onwe anyị na Chineke ma-ọbụ gaa Ya nso maka enyem aka na nkwado. Ọmụmaatụ, ogologo agha ndị Nifaị na ndị Laman lụrụ mmetụtara ndị mmadụ nụzọ dị iche iche. Mọmọn kọwara na “ọtụtụ enwekwaghị mmetụta” dịka ndị ọzọ “adịwo nrọ nihi mkpagbu ha, nke mere na ha nwere umeala nonwe ha niru Chineke.”25

Ekwela ka mmegide mee gị enwekwaghị mmetụta; maọbụ sachapụ okwukwe gị nime Chineke. Kama, rịọ Chineke maka enyemaka. Mụbawanye ekele gị maka na ịdabere na Onye Nzọpụta. Kama inwe obi ọjọ, ka O nyere unu aka ịdị mma karịa.26 Kwere Ya ka o nyere gị aka ịkachi obi, ikwe ka mkpagbu gị nile bụrụ ihe “elobara niime ọńụ nke Kraịst.”27 Soro Ya na ozi Ya “ịgwọ ndị obi ha tiwara etiwa,”28 gbalịa ịmeghaị mmegide, ma bụrụ ọghọ okwute.29

A na m agba akaebe na Onye Nzọpụta dị ndụ. Ọ ghọtara mmegide. Akara ndị dị nọba aka Ya na echetara Ya mgbe ọbụla maka unu na ọnọdụ unu. Ọ na-ezi gị ozi nime nsogbu gị nile. Maka unu bụ ndị biakwutere Ya, okpueze nke dị mma ga anọchi ntụ nke iri uju; ọńụ na obi ụtọ ga anọchi nwute na iru uju; ekele na mmeme ga anọchi obi ịda mba na obi nkoropụ.30 Okwukwe gị nebe Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nọ ga-anata ụgwọ ọrụ karịa ihe ịtụrụ anya ya. Mmegide nile—karịsịa mmegide na-akpasu iwe—ka aga edo nsọ maka uru gị. Otu a ka m si gbaa ama n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Lee John Reader, Africa; A Biography of the Continent (1999), 635–36, 673–79.

  2. Na inwe olile anya, imeudo nke nd] Rwanda dị mgbagwoju anya. Ụfọdụ najụ maka ịdị omimi na nnọgide ya. Lee, maka ịmaatụ, “The Great Rwanda Debate: Paragon or Prison?,” Economist, Mar. 27, 2021, 41–43.

  3. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 130:19; nkwusiike ka agbakwunyere.

  4. Lee Ndị Hiburu 4:15

  5. 1 Nifaị 21:15–16

  6. Lee Alma 7:11–13

  7. Lee Ndị Hiburu 4:16lee kwa Aịzaya 41:10; 43:2; 46:4; 61:1–3

  8. Okwu nke ịkpachara anya: Anyị kwesịrị igbanar[ ọnwụnwa iji mepụta atụtụ nke onwe anyị banyere olee na olee mgbe, na-agbanyeghị echiche ọma ma ọbụ dịtụ mma. Anyị enweghị ike kpachara anya kwuo ihe Chineke ekpughebeghị.

  9. Preach My Gospel; A Guide to Missionary Service (2018), 52; lee kwa Aịzaya 61:2–3; Mkpughe 21:4 “Ihe nile bụ mmegide gbasara ndụ nwere ike dị mma” pụtara na ihe nile si na mmegide nye anyị pụta ka a ga-emezi, megharịa, ma-ọbụ bupụ. Nime okwu ọgbakọ zuruọha nke ikpeazụ ya, “Come What May, and Love It,,” Okenye Joseph B. Wirthlin kwuru: “Anya mmiri ọbụla taa ga-abịaghachi otu narị ugboro na anya mmiri nke ọńụ na ekele. … A principle of compensation prevails” (LihonaNov. 2008, 28).

  10. Lee Jọn 16:33

  11. Lee 2 Nifaị 2:2

  12. Lee Job 42:10, 12–13; Jekọb 3:1

  13. Alma 40:5

  14. Lee Mosaịa 4:9

  15. Lee Russell M. Nelson, ““Ka Chineke nwee Mmeri,” Laịhona, Nov. 2020, 93. Myopic pụtara ịdị nso na anya.

  16. Na ịma atụ, Captain Moronaị kwenysiri ike na ọdịghị mma ka ndị mmadụ kwụrụ ma “emeghị ihe ọbụla” mgbe ha nwere ike nyere ndị ọzọ aka (lee Alma 60:9–11; lee kwa 2 Ndị Kọrịnt 1:3).

  17. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 58:27; lee kwa ama okwu 26, 28–29

  18. Jọn 8:7

  19. Lee Jọn 8:10–11; Ntụgharị asụsụ Joseph Smith nke amaokwu 11 tinyere, “Ma nwanyị ahụ nyere Chineke otuto site na awa ahụ, ma kwere na aha ya,” gosiri na amaghị ikpe nke Onye Nzọpụta na iwu Ya nke “emehiela ọzọ” megharịrị ndụ nke nwanyị ahụ.

  20. Bryan Steveson, Just Mercy: A Story of Justice nad Redemption (2015), 308–9.

  21. Lee Matiu 25:31-46

  22. Lee Ọrụ 10:38; lee kwa Russell M. Nelson, “Iwu nsọ Nke Abụọ Dị Ukwuu,” Laịhona, Nov. 2019, 96–100.

  23. Lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 1:17, 22–23

  24. Iwu ndị a ka ewepụtara nke ọma nime “Mweghachi nke Uju nke Ozi ọma nke Jizọs Kraịst: Ịma Ọkwa Narị Afọ Abụọ nye Ụwa,”ChurchofJesusChrist.org.

  25. Alma 62:41

  26. Lee Amos C. Brown, in Boyd Matheson, “‘It Can Be Well with This Nation’ If We Lock Arms as Children of God,” Church News, July 25, 2019, thechurchnews.com.

  27. Alma 31:38

  28. Lee Luk 4:16–19 Ịgwọ obi tiwara etiwa bụ iweghachite ndị ahụ ndị obi ha, mmụọ ha, amamihe ha, ma-ọbụ ime onwe nke etiwara ma ọbụ azọpịara (lee James Strong, The New Strong’s Expanded Exhaustive Concordance of the Bible [2010], Hebrew dictionary section, 139 and 271).

  29. Lee, ịma atụ, Russell M. Nelson, “Ka Chineke nwe Mmeri,” Laịhona, Nov. 2020, 94; Dallin H.Oaks, “Hụ Ndị Iro Gị Nanya,” Laịhona,Nov. 2020, 26–29. Onye isi Nelson gbara ume: “Taa a na m akpọku ndị otu anyị ebe niile ibute ụzọ n’ịhapụ akparam agwa na omume ndị nke obi ọjọọ. A na m arịọ unu bulie elu nsọpụrụ maka ụmụ Chineke niile. Nke a bụ ihe karịrị ịhapụ akparam agwa na omume ndị nke obi ọjọọ. Onye-isi Oaks kwuru ihe Reverend Theresa A. Dear: “Ịkpa oke agbụrụ na-eto nke ọma na ịkpọasị, mmegbu, nchikọta, emeghị ihe ọbụla, enweghị mmasị na ịgbachi nkịtị.” Mgbe ahụ ya sị, “Dị ka ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, anyị ga-eme karịa inye aka kpochapụ ịkpa oke agbụrụ.”

  30. Lee Aịzaịa 61:3. Ịnata okpu eze nke mara mma pụtara na anyị ga-abụ ndị ha na Jizọs Kraịst ga-eketakọ oke nime alaeze nke Chineke. Lee kwa Donald W. Parry, Jay A. Parry, na Tina M. Peterson, Understanding Isaiah (1998), 541–43.