Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
NAJS, Ọpụpụ 33


NAJS, Ọpụpụ 33:20, 23 (tụlee ihe dị iche na Ọpụpụ 33:20, 23)

(Ọ dịghị mmadụ ọbụla juputara na mmehie pụrụ ịhụ iru Chineke ma dị ndụ.)

20 O wee sị kwa Moses, Ị pughị ihụ iru m n’oge nke a, ka iwe m ghara ịdị oku megide kwa gị, na ndị gị, n’ihi na o nweghị mmadụ ọbụla n’etiti ha ga-ahụ m n’oge nke a ma dị ndụ, n’ihi na ha juputara na mmehie karịa. Ọ dịghị kwa mmadụ ọbụla juputara na mmehie n’oge ọbụla, ma-ọdịghị mgbe mmadụ ọbụla juputara na mmehie n’oge ọbụla gaje ịhụ iru m ma dị ndụ.

23 Na aga m ewezuga aka m, ị ga-ahụ akụkụ nile nke azụ m anya, kama a gaghị ahụ iru m, dịka n’oge ndị ọzọ; n’ihi na ana m ewere ndị m Israel iwe.