“Appendix: Okwunkọwa Ụkpụrụ niile nke Mmụta,” EnglishConnect 1 maka Ndị Mmụta (2022)
“Okwunkọwa,” , EnglishConnect 1 maka Ndị Mmụta
Appendix
Principles of Learning Glossary
Ndepụta ikpeazụ Ụkpụrụ niile nke Mmụta
Agency
Ohere nhọrọ: Dị ka ụmụ Chineke, anyị nwere ohere nhọrọ, ma ọ bụ ike, iji mee mkpebi nke onwe anyị. Anyị nwere ike họrọ ihe anyị ga-ekwere, ihe anyị na-eme, na onye anyị na-aghọ.
“Ohere nhọrọ bụ ikike na ohere ọma Chineke nyere na-enye anyị iji họrọ ma mee ihe maka onwe anyị” (Isiokwu niile nke Ozi ọma, “Ohere nhọrọ na Inye nkọwa,” ChurchofJesusChrist.org).
“Niihi na Ọ hụrụ gị naanya, Chineke nyere gị ohere nhọrọ, ma ọ bụ mnwere onwe ime mkpebi niile. Ohere nhọrọ na-enye gị ike ime nhọrọ ndị dị mma na-eduba nʻobi ụtọ; ọ nakwa eme gị inye nkọwa maka nhọrọ ọjọọ niile, nke na-eduba na enweghị obi ụtọ ozugbo ma ọ bụ nʻikpeazụ. Chineke agaghị etinye aka na nhọrọ gị niile; Ọ na-ekwe gị ikpebi nʻonwe gị ma mụta site na nsonazụ niile. Otu ọ dị Ọ na-enye enyemaka kachasị elu iji merie njehie na mmehie niile—ike nzọpụta nke Jizọs Kraịst. Na-agbanyeghị otu ọnọdụ si jọọ njọ ma ọ bụ nhọrọ ọjọọ ole i meworo, i nwekwara ike họrọ ịgbanwe ma chọta udo site na Jizọs Kraịst” (“Chineke Nọ Ebe ahụ maka Gị,” ComeuntoChrist.org).
Agent
Onye nnọchite anya: Onye nnọchite anya bụ onye nwere ikike ma ọ bụ ike ime ihe nʻonwe ha. Dị ka ụmụ Chineke, anyị bụ ndị nnọchite anya; anyị nwere ohere nhọrọ, ma ọ bụ ike, iji mee mkpebi nke onwe anyị. Anyị nwere ike họrọ ihe anyị ga-ekwere, ihe anyị na-eme, na onye anyị na-aghọ.
Bible
Baịbụlụ: “Baịbụlụ bụ akwụkwọ dị nsọ nke nwere niime ya okwu Chineke. Gburugburu ihuakwụkwọ ya niile, Baịbụlụ Nsọ na-akuzi na Chineke anaghị akwụsị ịhụ ụmụ Ya naanya ma ọlị. …Isoro nkuzi niile achọtara niime Baịbụlụ na-enyere anyị aka mata onye Chineke bụ … ma ghọtazie otu O siri na-achọ ka anyị bie ndụ. …”
“Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke onye bịara nʻelu ụwa ịzọpụta anyị site na njọ, obi ọjọọ, owu ọmụma, mgbu, na ndị ozọ. Jizọs kuziri ọmarịcha ihe ọmụmụ banyere ije ozi na ịhụnaanya ma rụọ ọtụtụ ọrụ ebube mgbe Ọ nọ nʻelu ụwa. Niime Baịbụlụ, anyị nwere ike ịgụ akụkọ ndị a ma malite ịmara otu anyị nwere ike isi merie ihe niile siri ike jiri enyemaka sitere nʻaka Jizọs” (“Gịnị Bụ Baịbụlụ Nsọ?,” ComeuntoChrist.org).
Book of Mormon
Akwụkwọ nke Mọmọn: “Akwụkwọ nke Mọmọn nwere niime ya edereede niile dị nsọ sitere nʻaka ndị nsiso Jizọs. Dị nnọọ ka Chineke gwara Mosis na Noa okwu niime Baịbụlụ, Ọ gwakwara ndị Emerịka okwu. Ndịikom ndị a, a na-akpọ ndị amụma, dedatara okwu nke Chineke. Edereede ha niile nʻikpeazụ ka achịkọtara niime otu akwụkwọ site nʻaka onye amụma a na-akpọ Mọmọn. …
“Akwụkwọ nke Mọmọn bụ aka ebe na Chineke hụrụ ụmụ Ya niile naanya ma nọ niime ndụ ha. Ọ na-arụ dị ka aka ebe nye eziokwu niile dị niime Baịbụlụ nakwa ịdị nsọ na nkuzi niile nke Jizọs Kraịst” (“Gịnị bụ Akwụkwọ nke Mọmọn?,” ComeuntoChrist.org).
Doctrine and Covenants
Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile: “Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile bụ akwụkwọ nsọ nwere niime ya mkpughe niile sitere nʻaka Onyenwe anyị nye Onye amụma Josef Smit na ndị amụma ụbọchị ikpeazụ ole ma ole ndị ọzọ. Ọ bụ akwụkwọ nsọ pụrụ iche niihi na ọ bụghị ntụgharị asụsụ nke dọkumentị gboo.
“Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile bụ otu niime akwụkwọ nsọ anọ ana eji niime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a (atọ ndị ọzọ bụ Baịbụlụ, Akwụkwọ nke Mọmọn, na Pel dị Oke Ọnụ Ahịa)” (Isiokwu niile nke Ozi ọma, “Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile,” ChurchofJesusChrist.org).
Faith
Okwukwe: “Okwukwe bụ ụkpụrụ nke ime ihe na ike. Mgbe ọbụla anyị rụrụ ọrụ ruo na ebumnuuche tozuru etozu, anyị na-enwe okwukwe. Anyị egosị olile anya anyị maka ihe anyị enweghị ike ahụ. …”
“Inwe okwukwe na Jizọs Kraist pụtara ịdabere na Ya kpamkpam—tụkwasị obi n’ike Ya na-enweghị nsọtụ, isiakwụkwọ, na ịhụnaanya. Ọ gụnyekwara ikwenye na nkuzi Ya niile. Ọ pụtara na-ikwere na ọbụladị na anyị aghọtachaghị ihe niile, Ọ ghọtara. N’ihi na O nwetaworịị ihe mgbu anyị niile, mkpagbu nakwa adịghị ike anyị, Ọ maara ka esi enyere anyị aka merie ihe ndị na-ara anyị ahụ kwa ụbọchị. … (lee Alma 7:11–12; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 122:8).”
“Okwukwe karịrị naanị nkwenye. Anyị na-egosị okwukwe anyị site na-ime ihe—site n’ụzọ anyị si ebi ndụ. …”
“Okwukwe bụ onyinye sitere n’aka Chineke, mana anyị garịrị azụlite okwukwe anyị iji mee ka ọ dị ike. Okwukwe dị ka akwara. Ọ bụrụ ma anyị tinye ya nʻọrụ, ọ na-eto sie ike. Ọ bụrụ ma anyị debe ya emegharịghị ahụ, ọ na-ada mba” (Isiokwu niile nke Ozi ọma, “Okwukwe niime Jizọs Kraịst,” ChurchofJesusChrist.org).
God/Heavenly Father
Chineke/Nna nke Eluigwe: “Chineke Nna bụ Onye Kachasị elu niime onye anyị kweere na ya, onye anyị na-efe, na onye anyị na-ekpe ekpere nye. Ọ bụ Onye Okike kachasị elu, Onye ọchịchị, na Onye Nchekwa nke ihe niile. O zuru okè, nwee ike niile, ma mara ihe niile” (Isiokwu niile nke Ozi ọma, “Chineke Nna,” ChurchofJesusChrist.org).
“Chineke bụ Nna anyị nke Eluigwe dị ịhụnaanya. … Ọ bụ Nna nke mmụọ [anyị]. …. [Nna nke Eluigwe] hụrụ ụmụ Ya niile naanya nʻụzọ zuru okè, gụnyekwara gị. … Ọ na-achọ gị na ya inwe mmekọrịta” (“Ịhụnaanya nke Chineke,” ComeuntoChrist.org).
Niime akwụkwọ nsọ, mkpụrụokwu ahụ Chineke ka a na-akpọkarị Nna nke Eluigwe ma ọ bụ Jizọs Kraịst niihi ha nọkọtara ọnụ nʻebumnuuche. Anyị na-ekpe ekpere nye Nna anyị nke Eluigwe.
Holy Spirit
Mmụọ Nsọ: “Mmụọ Nsọ bụ onye aka ebe nke Chineke na Jizọs Kraịst. … Mmụọ Nsọ na-enye anyị nkasi obi, na-enyere anyị aka mata eziokwu, ma na-agba ama nke Jizọs. … Otu niime ụzọ ndị Chineke si agwa anyị okwu bụ site na Mmụọ Nsọ. Mmụọ Nsọ na-agwa anyị okwu nʻuche anyị na nʻobi anyị site na echiche na mmetụta niile” (“Mmụọ Nsọ,” ComeuntoChrist.org).
Jesus Christ
Jizọs Kraịst: “Jizọs bụ Onye Nzọpụta nke ụwa na ọmụmaatụ anyị zuru okè. Dị ka anyị na-esoro Ya, anyị na-achọta udo karịrị akarị na obi ụtọ niime ndụ. …”
“Jizọs bụ Ọkpara nke Chineke. Nna nke Eluigwe anyị zitere Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, iwekwasị onwe Ya mmehie niile nke onye ọbụla ga-ebi nʻụwa ka ewee gbaghara anyị. …”
“Jizọs biri ndụ zuru okè iji gosị anyị ụzọ laghachikwuru Nna nke Eluigwe anyị. …”
“Jizọs tara ahụhụ ma nwụọ niihi mmehie anyị. Ozi nke Jizọs na-ịbịa nʻụwa bụ ịzọpụta anyị site na mmehie anyị. Ọ dị njikere ịta ahụhụ ma ji Onwe Ya chụọ aja iji kwụọ ụgwọ maka mmehie anyị niile ka anyị nwee ike chegharịa ma nwete mgbaghara. …”
“Jizọs bilitere nʻọnwụ ka anyị nwee ike bie ndụ ọzọ. Mkpụrụ ụbọchị atọ ọnwụ Ya gasịrị, Jizọs bilitere site nʻili ma bịakwute ọtụtụ ndị enyi na ndị nsiso Ya. Ọ bụ onye mbụ ibilite nʻọnwụ, nke pụtara na mmụọ Ya jikọtara nʻanụ ahụ Ya zuru okè mgbe ọnwụ gasịrị. Niihi Jizọs meriri ọnwụ, anyị niile ga-enwe ike ebilite nʻọnwụ otu ụbọchị” (“Isoro Jizọs Kraịst, Ọmụmaatụ Anyị Zuru okè,” ComeuntoChrist.org).
Prayer
Ekpere: Ekpere bụ “nzikọrịta ozi dị nsọpụrụ anyị na Chineke oge mgbe onye ahụ na-enye ekele ma rịọ maka ngọzi. Ekpere niile ka a na-ekpe nye Nna nke Eluigwe anyị nʻaha nke Jizọs Kraịst” (Odudu ruo Akwụkwọ nsọ, “Ekpere,” ChurchofJesusChrist.org).
“Chineke bụ Nna gị bi Nʻeluigwe dị ịhụnaanya, ma Ọ na-achọ ịnụ site nʻaka gị” (“Otu esi Ekpe ekpere,” ComeuntoChrist.org).
Prophet
Onye amụma: “Onye amụma bụ onye akpọworo site nʻaka Chineke inye ụwa niile ntuzi aka. Site na Ebreham na Mosis ruo ndị amụma dị ndụ taa, Chineke na-agbasoro nsoro nke iduzi ụmụ Ya site na ndị amụma” (“Chineke Na-agwa Anyị okwu site na Ndị Amụma,” ComeuntoChrist.org).
Savior
Onye Nzọpụta: “Onye na-azọpụta. … ʻOnye Nzọpụtaʻ bụ aha na etutu aha nke Jizọs Kraịst” (Odudu nye Akwụkwọ nsọ, “Onye Nzọpụta,” ChurchofJesusChrist.org).
Jizọs Kraịst bụ Onye Nzọpụta anyị niihi na O nyere ndụ Ya ma bilite nʻọnwụ ka anyị nwee ike merie mpụtara niile nke mmehie na ọnwụ ma binyere Chineke ọzọ.
“Jizọs tara ahụhụ ma nwụọ niihi mmehie anyị. Ozi nke Jizọs na-ịbịa nʻụwa bụ ịzọpụta anyị site na mmehie anyị. Ọ dị njikere ịta ahụhụ ma ji Onwe Ya chụọ aja iji kwụọ ụgwọ maka mmehie anyị niile ka anyị nwee ike chegharịa ma nwete mgbaghara. …”
“Jizọs bilitere nʻọnwụ ka anyị nwee ike bie ndụ ọzọ. Mkpụrụ ụbọchị atọ ọnwụ Ya gasịrị, Jizọs bilitere site nʻili ma bịakwute ọtụtụ ndị enyi na ndị nsiso Ya. Ọ bụ onye mbụ ibilite nʻọnwụ, nke pụtara na mmụọ Ya jikọtara nʻanụ ahụ Ya zuru okè mgbe ọnwụ gasịrị. Niihi Jizọs meriri ọnwụ, anyị niile ga-enwe ike ebilite nʻọnwụ otu ụbọchị” (“Isoro Jizọs Kraịst, Ọmụmaatụ Anyị Zuru okè,” ComeuntoChrist.org).
Scripture
Akwụkwọ nsọ: “Mgbe ndịikom dị nsọ nke Chineke dere ihe ma ọ bụ kwuo okwu site nʻike nke Mmụọ Nsọ, okwu ha ʻga-abụ akwụkwọ nsọ, ga-abụ uche nke Onyenwe anyị, ga-abụ echiche nke Onyenwe anyị, ga-abụ okwu nke Onyenwe anyị, ga-abụ olu Onyenwe anyị, na ike nke Chineke ruo na nzọpụta’ (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 68:4). …
“Isi ebumnuuche nke akwụkwọ nsọ bụ ịgba ama nke Kraịst na iduzi ụmụ nke Chineke ka ha wee bịakwute Ya ma nata ndụ ebighị ebi (lee Jọn 5:39; 20:31; 1 Nefi 6:4; Mozaya 13:33–35)” (Isiokwu niile nke Ozi ọma, “Akwụkwọ nsọ,” ChurchofJesusChrist.org).