“Appendix: Egwuregwu niile nke Otù Mkparịta ụka,” EnglishConnect 1 maka Ndị Mmụta (2022)
“Egwuregwu niile nke Otù Mkparịta ụka,” EnglishConnect 1 maka Ndị Mmụta
Appendix
Conversation Group Games
Egwuregwu niile nke Otù Mkparịta ụka
Gụnyere niime akwụkwọ arụmarụ nke a bụ ndepụta egwuregwu ntọọchị iji mụọ Bekee. I nwere ike gwuo egwuregwu ndị a nʻoge nzukọ nke otu ọbụla. Jiri nsoro niile na akpaokwu sitere na ihe ọmụmụ ị nọ na ya ma ọ bụ ihe ọmụmụ nke gara aga. Ọtụtụ niime egwuregwu ndị a na-achọ ka gị na onye mmekọ ma ọ bụ obere otu rụkọta.
Questions (10–15 minutes)
Ajụjụ niile (nkeji 10 ruo 15)
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Họrọ otu ajụjụ sitere na ndepụta ahụ. Cheta na i nwere ike dochie mkpụrụokwu nwere ahịrị nʻokpuru jiri mkpụrụokwu na nkebiokwu ndị ọzọ.
-
Kesaa azịza gị nye ndị otù
-
Were oge otu otu nʻịhọrọ ajụjụ na ikesa azịza niile. I nwere ike kwuo banyere ka ha ra bụ ajụjụ ndị ị chọrọ.
Questions to Review Patterns:
Ajụjụ niile iji Nyochaa Nsoro niile:
-
What do you like to do?
-
Why do you like to study English?
-
Can you tell me about your family?
-
What are you wearing?
-
What do you do before you come to the conversation group?
-
What do you do in the morning?
-
When do you work?
-
What’s the weather in New York?
-
Where do you work?
-
What do you do for work?
-
Do you like to teach people?
-
What do you eat for dinner?
-
What foods do you like?
-
What do you want for lunch?
-
What is your favorite food? How do you make it?
-
How much do groceries cost?
-
Where do you live?
-
Tell me about your house.
-
Where is your favorite place to eat?
More Questions:
Ajụjụ ndị Ọzọ:
-
Tell me about your friends.
-
Tell me about your job.
-
Tell me about your city.
-
Tell me about your favorite place.
-
Tell me about your daily routine. What do you do every day?
-
What do you like to wear?
-
What do you do when you are sick?
-
What do you do when you are hurt?
-
What is expensive in your city?
-
What is cheap in your city?
Notes
Hụba ama
-
I nwere ike gwuo egwuregwu nke a gị na otù dum ma ọ bụ nʻobere otù nke mmadụ atọ ruo ise.
-
Asịghị na ị ga-ewe naanị ajụjụ ndị dị niime ndepụta nke a. I nwere ike depụtakwuo ajụjụ ọhụrụ. I nwekwara ike gbanwee mkpụrụokwu niile nwere ahịrị nʻokpuru iji depụta ajụjụ ndị ọzọ.
-
Ọ bụrụ na ị na-achọ ime egwuregwu nke a dịrị ịma aka karịa, were oge otu otu kesaa azịza niile i chetara site nʻaka onye otù ọbụla nke otù ahụ.
-
I nwere ike jiri ajụjụ ndị a ha na egwuregwu ndị ọzọ nọ nʻokpuru dị ka “Bicycle Chain” ma ọ bụ “Ịtụ Bọọlụ.”
Hot Seat (10–20 minutes)
Oche Na-ata ọkụ (nkeji 10 ruo 20)
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Kebie nʻotù abụọ.
-
Họrọ ndị mmụta abụọ (otu onye mmụta site na otù nke ọbụla). Ndị mmụta ndị a na anọdụ ọdọ chewe ihu nʻotù ahụ (nọ “nʻoche na-ata ọkụ”) gbanyere bọọdụ ahụ azụ.
-
Onye nkuzi gị edee akpaokwu ma ọ bụ nkebiokwu na bọọdụ. Ndị mmụta nọ “nʻoche na-ata ọkụ” enweghị ike ahụ mkpụrụokwu ahụ.
-
Otù ndị ahụ nwere nkeji abụọ iji nyere onye otù ha nọ na “oche na-ata ọkụ” aka kọta mkpụrụokwu ahụ dị na bọọdụ na-ekwughị mkpụrụokwu ahụ.
-
Onye nke nọ “nʻoche na-ata ọkụ” bu ụzọ kwuo mkpụrụokwu ahụ ga-enwete otu mak maka otù ha. Ọ bụrụ otu otù kwuo mkpụrụokwu ahụ dị na bọọdụ mgbe ịnwa inyere onye otù ha aka kọta, ha agaghị enwete mak ọbụla.
-
Megharịa jiri mkpụrụokwu ọhụrụ.
Notes
Hụba ama
-
Hazie ofu otù ma ọbụ ruo atọ dịka otu nha ha si dị.
-
Ọ bụrụ na unu na-ezukọ nʻikuku, gwuo egwu dị ka otu nnukwu otù kama ikewa nʻobere otù. Otu onye nọ “nʻoche na-ata ọkụ.” Onye nke a amaghị mkpụrụokwu ahụ. Otu onye bụ “onye na-enye kepukepu.” “Onye na-enye kepukepu” ahọrọ mkpụrụokwu ma nye kepukepu niile ka onye ahụ nọ “nʻoche na-ata ọkụ” enwee ike kọta mkpụrụokwu ahụ.
Ball Toss (10–15 minutes)
Ịtụgharị Bọọlụ (nkeji 10 ruo 15)
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Chọta otu bọọlụ, ihe dị nro, ma ọ bụ mpempe akwụkwọ afụkọrọ afụkọ.
-
Họrọ otu ajụjụ. (Jiri otu site nʻihe ọmụmụ ma ọ bụ lee “Ajụjụ niile” niime appendix.)
-
Jụọ ajụjụ ma tụọ bọọlụ nye onye mmụta.
-
Onye mmụta ejide bọọlụ ahụ ma zaa ajụjụ ahụ.
-
Onye mmụta ajụọ ajụjụ ahụ ọzọ ma tụọ bọọlụ nye onye mmụta ọzọ.
-
Megharịa tutu ruo onye mmụta ọbụla niime otù gị azatawo ajụjụ ahụ. Emesịa malite ọzọ jiri ajụjụ ọhụrụ.
Notes
Hụba ama
-
Iji mee egwuregwu nke a adịkwuo ịma aka, gbanwee ajụjụ ahụ mgbe ọbụla ị tụrụ bọọlụ ahụ.
-
Ọ bụrụ na unu na-ezukọ nʻikuku, kpọọ aha kama ịtụ bọọlụ.
Dice Game (10–15 minutes)
Egwuregwu Dice (nkeji 10 ruo 15)
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Ihe ị ga-achọ bụ otu die (ma ọ bụ kaadị nọmba edere nọmba 1 ruo 6).
-
Họrọ ngwaa isii ma dee ha nʻelu bọọdụ nọmba 1 ruo 6.
-
Gị na onye mmekọ ma ọ bụ otu obere otù soro mee ihe. Tụgharịa die ahụ. Depụta ahịrịokwu nke na-eji ngwaa ahụ maka nọmba nke ị tụrụ. Were oge otu otu.
Example
Ọmụmaatụ
Onye nkuzi edee na bọọdụ:
-
cook
-
stir
-
bake
-
boil
-
cut
-
add
Onye mmụta 1 atụọ die ahụ ma nwete 6. Ya emee ahịrịokwu jiri add.
-
“I add sugar to my oatmeal.”
Onye mmụta 2 atụọ die ahụ ma nwete 4. Ya emee ahịrịokwu jiri boil.
-
“I boil eggs for lunch.”
Onye mmụta 3 atụọ die ahụ ma nwete 3. Ya emee ahịrịokwu jiri bake.
-
“I like to bake cookies.”
Notes
Hụba ama
-
Mkpụrụokwu ndị ọzọ ka enwere ike iji kama ngwaa.
-
Ọ bụrụ na unu na-ezukọ nʻikuku, gị na otù dum soro mee. Jiri dice ikuku ma were oge otu otu na-ịdepụta ahịrịokwu niile.
Give One, Get One (10–20 minutes)
Nye Otu, Nwete Otu (nkeji 10 ruo 20)
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Họrọ isiokwu maka otù (ịma atụ: ezi na ụlọ, egwuregwu, ma ọ bụ nri).
-
Dedata ka ha ra bụ mkpụrụokwu ị maara banyere isiokwu na nkeji otu ruo abụọ.
-
Bilie ma jegharịa niime ụlọ ahụ. Chọta onye mmekọ.
-
Kesaa mkpụrụokwu sitere na ndepụta gị gị na onye mmekọ gị. Onye mmekọ gị ekesaara gị otu mkpụrụokwu. Ọ bụrụ na ọ bụ mkpụrụokwu ọhụrụ, gbakwunye mkpụrụokwu ahụ na ndepụta gị.
-
Jegharịa ije niime ụlọ ahụ ọzọ. Chọta onye mmekọ ọhụrụ. Megharịa ọzọ.
Example
Ọmụmaatụ
Isiokwu: ezi na ụlọ
Onye mmekọ A edee:
-
mom
-
dad
-
sister
-
brother
Onye mmekọ B edee:
-
grandfather
-
grandmother
-
mother
-
father
-
aunt
-
uncle
-
A: What’s one word from your list?
-
B: Grandmother.
-
A: I don’t have that word. I’ll add it to my list.
-
B: What’s a word from your list?
-
A: Mom.
-
B: I have mother. I will write mom next to mother.
Ndị mmụta abụọ ahụ agbakwunye mkpụrụokwu ọhụrụ ahụ na ndepụta ha.
Ndepụta nke Onye mmekọ A:
-
mom
-
dad
-
sister
-
brother
-
grandmother
Ndepụta nke Onye mmekọ B:
-
grandfather
-
grandmother
-
mother, mom
-
father
-
aunt
-
uncle
Notes
Hụba ama
-
Nke a bụ ụzọ dị ukwuu iji mụta ma ọ bụ mụọ akpaokwu ọhụrụ nke na-adịghị na ihe ọmụmụ ahụ.
-
Ọ bụrụ na unu na-ezukọ n’ikuku, kwe ka onye ọbụla kesaa otu mkpụrụokwu sitere na ndepụta ha nye onye dum kama ime ya na mkpị na mkpị.
Speculation (15–20 minutes)
Ntule (nkeji 15 ruo 20)
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Chee maka otu ngwaa.
-
Kwupụta ngwaa ahụ nʻolu dara ụda.
-
Ijiri ngwaa, depụta ezigbo ahịrịokwu banyere onye mmụta ọzọ. Kwuo, “I think that you …” iji malite ahịrịokwu gị.
-
Onye mmụta nke ọzọ na-ekwu ọ bụrụ ma nkwupụta gị bụ eziokwu ma ọ bụghị.
-
Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu, gị enwete otu mak. Ọ bụrụ na ọ bụghị eziokwu, ị gaghị enwete mak.
-
Onye mmụta nke buụzọ ruo mak ise emerie!
-
Mezuo ugboro 10 ruo 20. Gbanwee ngwaa ahụ maka mkpụrụokwu nke ọbụla.
Example
Ọmụmaatụ
Onye mmụta A (nye onye mmụta B): The verb is like. I think that you like chocolate.
Onye mmụta B: That’s true! (Onye mmụta A enwete mak.)
Onye mmụta B (nye onye mmụta C): I think that you like to play basketball.
Onye mmụta C: That’s not true! (Onye mmụta B enweteghị mak.)
Notes
Hụba ama
-
Kepụta otù mmadụ atọ ruo mmadụ ise.
-
Egwuregwu nke a ga-agụnye ugboro 10 ruo 20. Ị ga-eji otu ngwaa maka ugboro nke ọbụla. Were oge otu otu na-ikwu otu ngwaa ọhụrụ oge ọbụla ị malitere nke ọbụla.
Two Truths and One Lie (10–15 minutes)
Eziokwu Abụọ na Otu ọkwu asị (nkeji 10 ruo 15)
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Chee maka ihe abụọ nke bụ eziokwu banyere onwe gị. Rụrụọ otu ihe na-abụghị eziokwu. Nwaa iji akpaokwu na nkebiokwu ndị sitere na ihe ọmụmụ.
-
Gụọ nkwupụta gị nʻolu dara ụda nye otù gị.
-
Ndị otù gị ajụọ ajụjụ niile iji nwee ike kọta nkwupụta nke bụ eziokwu. Zaa ajụjụ ha niile.
Example
Ọmụmaatụ
Onye otù nke 1: “I like pizza. I like French fries. I like chocolate. Which is not true?”
Ndị otù fọrọ ajụọ ajụjụ:
-
Q: What is your favorite kind of pizza?A: I like cheese pizza.Q: What is your favorite candy bar?A: I like chocolate and caramel.Q: Where do you like to get French fries?A: I don’t have a favorite place.
Ndị otù fọrọ akọta: “I think you don’t like French fries.”
Onye otù nke 1: “That’s right! I don’t like French fries.”
Vocabulary Cards (10–15 minutes)
Kaadị niile nke Akpaokwu (nkeji 10 ruo 15)
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Dee akpaokwu 5 ruo 10 na mpempe akwụkwọ (akwụkwọ na-atapa atapa dị mma). Tinye mpempe akwụkwọ ndị ahụ nʻukwu.
-
Chọta onye mmekọ.
-
Chịgharịa ukwu mkpụrụokwu ihu nʻala ka ị ghara ịhụ mkpụrụokwu ndị ahụ. Gbanwee ukwu gị na onye mmekọ gị.
-
Họrọ otu akwụkwọ. Elekwala anya na mkpụrụokwu ahụ. Welie akwụkwọ ahụ elu nʻihu isi gị. Onye mmekọ gị akọwaa okwu ahụ (ma ọ bụ nye ntụgharị asụsụ), ka i nwee ike kọta okwu ahụ dị na mpempe akwụkwọ. Ọ bụrụ na gị kọtazie ya, gị enwete otu mak.
-
Were oge otu otu. Megharịa ya maka akwụkwọ nke ọbụla dị nʻukwu gị.
Notes
Hụba ama
-
Ọ bụrụ na unu na-ezukọ nʻikuku, mekọta ya ọnụ kama ikewa na mkpị. Onye ọbụla edepụta mkpụrụokwu dị iche iche. Egosịkwala ndị otù ndepụta nke gị. Were oge otu otu na-ahọrọ mkpụrụokwu site na ndepụta gị. Kọwaa ya nye otù ahụ na-ekwughị mkpụrụokwu ahụ. Ndị otù otù ahụ akọọ ihe mkpụrụokwu ahụ bụ.
Bicycle Chain (in person) (10–20 minutes)
Bicycle Chain (na mmadụ) (nkeji 10 ruo 20)
Ihe omume nke a na-arụ naanị maka otù na-ezukọ na mmadụ.
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Họrọ otu ajụjụ. (Jiri otu site nʻihe ọmụmụ ma ọ bụ lee “Ajụjụ niile” niime appendix.)
-
Guzoro nʻahịrị abụọ chee ihu na ihu.
-
Ndị chewere ibe ha ihu bụ ndị mmekọ.
-
Ndị mmekọ ajụọ ma zaa ajụjụ.
-
Gagharịa nʻokirikiri ka onye ọbụla nwete onye mmekọ ọhụrụ.
-
Ndị mmekọ ajụọ ma zaa ajụjụ.
-
Megharịa nke 5 na 6.
Notes
Hụba ama
-
Ọ bụrụ na gị nwee ọnụọgụgụ ndị mmadụ na-ezughị abụọ abụọ, kepụta otù nke bụ mmadụ atọ.
Mingle and Share (in person) (10–15 minutes)
Gwakọọ ma Kesaa (na mmadụ) (nkeji 10 ruo 15)
Ihe omume nke a na-arụ naanị maka otù na-ezukọ na mmadụ.
Steps
Nzọụkwụ niile
-
Họrọ otu ajụjụ. (Jiri otu site nʻihe ọmụmụ ma ọ bụ lee “Ajụjụ niile” niime appendix.)
-
Bilite ma chọta onye mmekọ.
-
Jụọ onye mmekọ gị ajụjụ ahụ. Cheta azịza nke onye mmekọ gị. Zaa ajụjụ nke onye mmekọ gị.
-
Jegharịa gburugburu ime ụlọ ahụ ma chọta onye mmekọ ọhụrụ. Jụọ ma zaa ajụjụ niile. Megharịa ugboro ugboro gị na ndị mmekọ ọhụrụ. Cheta azịza niile nke ndị mmekọ gị.
-
Gaghachi nʻoche gị. Kesaara otù ahụ ihe ị mụtara.
Example
Ọmụmaatụ
Question: How many people are in your family?
Ndị mmụta na-ejegharị na-ajụ ajụjụ ma na-aza ajụjụ niile ahụ ha na ndị mmekọ dị iche iche.
-
Maria: How many people are in your family?
Luna: There are four people in my family. How many people are in your family?
Maria: Three.
Ndị mmụta ekesaa ihe ha mụtara.
-
Teacher: How many people are in Maria’s family?
Luna: There are three people in Maria’s family.