Ma Anyị Na-ekwu maka Kraịst
Anyị bụ ndị nso nke Jizọs Kraịst, ma anyị na-achọ ịnata ma kesa ihè Ya.
Ime ka a mata
Na ngwụsị nke ogologo ọrụ e kenyere m na mba ọzọ, mụ na nwunye m Lesa, na mụ banyere nọdụ ụgbọ elu iji kwado maka naanị otu njem ụgbọ elu ọzọ—anya na-acha ọbara ọbara—iji laa ebe obibi. Ka anyị na ọtụtụ ndị ọzọ guzoro na-azọ ụkwụ nʻotu oge nʻahịrị ogologo, anyị nwere ike na-enwe mmetụta na-arịwanye elu nke ndị njem ibe anyị ndị ọzọ na-echegbu onwe ha maka ịfee ụgbọ elu ndị ahụ, ịmecha nyocha nke paspọtụ na visa, na ịgafe nche niile nke nchekwa.
Anyị mechara rute ebe otu onye ọrụ custom nọ bụ onye yiri ka ndọkasị na nchekasị dị elu dị nime ọnụ ụlọ ahụ anaghị emetụ ya nʻahụ. Ọ ji ngwa ngwa, na-aleghị m anya, were akwụkwọ m niile, lee foto m, tụgharịa otu peeji ka olechara ọzọ, ma nʻikpe azụ jiri ike sụọ paspọtụ m.
Mgbe ahụ ka owere akwụkwọ niile nke Lesa. Na-enweghị mmetụta nke uche, dobe isi ya ala ma lekwasị anya na ọrụ ya, o ji nwayọọ were anya ọkachamara lee peeji niile, lekwasị anya na nkọwa niile nke akwụkwọ niile nọ nihu ya. Ọ tụrụ anyị naanya mgbe ọ kwụsịrị na mberede, welie isi ya elu, ma lee Lesa anya nʻụzọ nke onye mara mmadụ. Jiri ịhuọchị dị nrọ, o jiri nwayọọ sụọ stamp nʻelu paspọtụ nke Lesa ma nye kwa ya akwụkwọ niile. Nwunye m wakwara ịhu ọchị, nabata akwụkwọ niile ndị ahụ, ma kwurịta okwu niile nke mgbasa.
“Ọbụ gịnị mere ugbua?” A jụru m na-ekwetaghị.
Lesa mgbe ahụ gosiri m ihe onye ọrụ ahụ hụụrụ—obere kaadị nwere onyinyo nke Onye Nzọpụta. O si na obere akpa nke Lesa dapụta na mberede banye nime ọpịpịa niile nke paspọtụ ya. Nke a bụ ihe onye ọrụ custom ahụ chọpụtara. Nke a bụ ihe gbanwere omume ya.
Amara na Eziokwu, site naka Simon Dewey, site nikike nkealtusfineart.com, © 2025, jiri ikike mee ihe
Obere foto nke a nke Onye Nzọpụta jikọtara obi abụọ nke ndị ọbịa abụọ na-enweghị ihe jikọrọ ha. Ọ tụgharịrị ihe na-abụghị nke onye ka ọ bụru nke onye, na-enweta ịma mma ahụ, ọrụ ebube ahụ, na eziokwu nke ihè nke Jizọs Kraịst. Maka ihe fọdụrụ na ụbọchị ahụ na ọtụtụ mgbe kemgbe, E cherewo m oge ahụ dị ụtọ, oge dị mfe ma jiri egwu ma nweela ọn̄ụ na mmetụta dị ebube nke Ihè nke Kraịst nʻisi ụmụ nke Chineke.
Anyị Na-ekwu maka Kraịst
Anyị bụ ndị nso nke Jizọs Kraịst, ma anyị na-achọ ịnata na ịkesa ihè Ya. Ihe doro anya nʻaha nke Nzukọ nsọ bụ mmụta okpukpe anyị nke “Jizọs Kraịst n’onwe ya bụ isi nkume nkunku.” Site nʻaka ndị amụma oge ochie na ndị dị ndụ, Nna anyị nke Eluigwe enyewo anyị iwu ka “Gee Ya ntị!” ma “bịakwute nụ Kraịst.” “Anyị na-ekwu maka Kraịst, anyị na-an̄ụrị ọn̄ụ nime Kraịst, anyị na-ekwusa maka Kraịst, [ma] anyị na-ebu amụma maka Kraịst.”
Anyị na-akuzi na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke, na oge ozi elu ụwa Ya, Jizọs kuziri ozi ọma Ya ma hiwe Nzukọ nsọ Ya.
Anyị na-agba ama na njedebe nke ndụ Ya, Jizọs tụrụ aja mgbaghara mmehie maka mmehie anyị niile mgbe Ọ tara ahụhụ nime Ubi nke Getsemane, akpọgide ya nʻobe, ma mgbe ahụ bilite nʻọnwụ.
Anyị na-an̄ụrị na nihi aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, a ga-agbaghara anyị mmehie anyị niile dị ka anyị chegharịrị. Nke a na-ewetara anyị udo na olile anya ma na-eme ka o kwee anyị omume ịlaghachite nihu nke Chineke ma nata njupụta nke ọn̄ụ.
Anyị na-ebu amụma na nihi Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs, ọnwụ abụghị ọgwụgwụ kama ọ bụ nzọụkwụ dị mkpa ịganihu. “Anyị niile ga-ebilite nʻọnwụ mgbe anyị nwụchara. Nke a pụtara na mmụọ na ahụ nke onye ọbụla ga-abịakọ ọnụ ma biri mgbe ebighị ebi.”
Bịakwutenu Kraịst
Ndị amụma dị ndụ nʻoge anyị—bụ ndị na-anata mkpughe sitere nʻaka Chineke ka ha kuzie ma na-edu anyị—na-abawanye na ịkpọ anyị oku ka anyị bịakwuta Kraịst. Ha na-enyere anyị aka ilekwasị obi, ntị na anya anyị niile nke ọma na Ya. Anyị nwere ike ịkpọtụ ọtụtụ ihe ịmaatụ nke mgbanwe na nkwalite niile ndị otù Ndịisi Mbụ mara ọkwa nke e mere ka anyị lekwasị anya na Jizọs Kraịst. Ụfọdụ n’ime Ndị a gụnyere:
-
Mkpebi ahụ ịla ezumike nka aha ahụ “Nzukọ nsọ Mọmọn” ma jiri aha ziri ezi dochie ya, Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a.
-
Nnweta nke nka ọhụrụ, mkpake nke Kraịst maka ngosipụta nʻụlọ nzukọ niile.
-
Isi okwu niile na egwu nke ndị Inyom Nta na kworum Ọkwa nchụ aja nke Erọn lekwasịrị anya na Jizọs Kraịst., dịka “ Onye na-eso ụzọ nke Kraịst” ma “Lekwasị anya na Kraịst.”
-
Ngosipụta ka ukwuu na Aja mgbaghara mmehie na mbilite nʻọnwụ nke Jizọs Kraịst dịka ihe omume niile kachasị ebube nime agụgụala.
-
Emume nke Ista dịka oge na-abụghị naanị ezumike, na-ekwusi ike maka Jizọs Kraịst.
-
Ime ka amata nke ihe nkọta nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst na ọdịdị ihe atụ ya.
Ka anyị lebakwuo anya na mmetụta ụfọdụ nime nke ha nwere. Nke mbụ, akara nke Nzukọ nsọ.
Akara Nzukọ nsọ
Nʻafọ 2020, Ọnyeisi Nelson tụpụtara ịhe nkọta ọhụrụ nke Nzụkọ nsọ. Akara nke a na-egosipụta na Kraịst nọ nʻetiti Nzukọ nsọ Ya ma kwesịrị ịnọ nʻetiti ndụ anyị niile. Ugbu a anyị na-ahụ akara ngosi a amaara nke ọma na rekọmend tempụl niile, website Nzukọ nsọ na magazin niile, dịka akara ngosi maka app Ọba akwụkwọ Ozi ọma, ma ọbụna na tag ID maka ọtụtụ ndị otù na-eje ozi na ndị agha. Akara ahụ na-agụnye aha nke Nzukọ nsọ ahụ enwere nime nkume nkuku, ma bụrụ ihe ncheta na Jizọs Kraịst bụ isi nkume nkuku, e gosịrị ebe a nime Cambodia ma eji eme ihe nime asụsụ 145.
Etiti ahụ nke akara ahụ bụ ihe nnọchianya nke mabụl Albert Bertel Thorvaldsen a hụrụ naanya Kraịst akpụrụakpụ, nke jikọtara ya na Nzukọ nsọ ma dị na ebe ndị ọbịa niile ma na ogige niile tempụl gburugburu ụwa. Mpụta ihe ya nime akara Nzukọ nsọ na-egosi na Kraịst kwesịrị ịbụ ebe etiti ahụ nke ihe niile anyị na-eme. Nʻotu aka ahụ, ogwe aka esetịpụrụ nke Onye Nzọpụta nʻegosi nkwa Ya ịnabata ndị niile ga-abịakwute Ya. Akara a bụ ihe nlere anya nke ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst na ihe ncheta mgbe niile nke Kraịst dị ndụ.
Site na ọchịchọ ịmata ihe, ajụwo m ọtụtụ ezinaụlọ na ndị enyi gbasara otu ihe dị mkpa nke akara Nzukọ nsọ. Nʻitụnaanya, ọtụtụ ndị amaghị ihe dị nsọ nke ọ gụnyere. Jizọs Kraịst guzoro n’okpuru arch ahụ. Nke a na-anọchi anya Onye Nzọpụta a kpọlitere nʻọnwụ na-apụta nili ahụ. Anyị na-eziokwu na-eme mmemme Kraịst dị ndụ bilitere nʻọnwụ, ọbụna na-iji akara nke Nzukọ nsọ.
Ista dị Elu ma dị Nsọ
Ugbu a ka anyị tụgharịa uche na ihe Ista pụtara. Nime ozi niile Ndị isi Nduzi Mbụ banyere Ista nke nso nso a, anyị nwetara aka mgba “ime emume Mbilite nʻọnwụ nke Onye Nzọpụta anyị dị ndụ site na ịmụ nkuzi Ya niile na inye aka guzobe omenala niile Ista nime obodo anyị nʻozuzu ya, karịsịa nime ezinaụlọ anyị niile.” Na nkenke, a na-agba anyị ume ị ga na mmemme dị elu ma dị nsọ nke Ista.
E nwere m mmasị mkpughe na-aga nihu gbasara Ista ma enwere m obi ụtọ maka ọtụtụ mbọ unu na-agba ime ka Ista bụrụ emume dị nsọ na nke dị nsọ. Na mgbakwunye na ime nzukọ oriri nsọ otu elekere na Sọnde Ista, ihe ịmaatụ ndị ọzọ nke ihe omume ndị ọzọ tozuru oke gụnyere ofufe niile nke ngalaba ukwu na stek na mmemme niile na Sọnde Igunkwụ yana nʻoge Izuụka Dị nsọ. Ncheta ndị a gụnyere mmemme niile ụmụaka, ndị ntoroọbịa, ma na-etinyekarị otu ukwe niile okpukperechi ndị ọzọ. Ndị ọzọ emela mmepe ụlọ niile nke “Kraịst Dị ndụ” maka ndị otù na ndị enyi niile ma sonyekwa na mmemme niile Ista nke okpukperechi dị iche iche nke obodo.
Ihe omume ndị a dị otu ahụ na-egosi igwe mmadụ nọ nʻobodo nke Jerusalem ndị olu ha jikọtara ọn̄ụ iji too Onye Nzọpụta nʻoge mbata mmeri Ya. Nʻotu aka ahụ repọtụ niile gbasara nzaghachi unu maka oku nke Otù Ndịisi Mbụ kpọrọ ife ofufe nʻụlọ dịka ndị ezinaụlọ niile ka ha wee mee ncheta ezumike kachasị mkpa.
E kwere m na ofufe ezinaụlọ nke gbara Ista gburu gburu amụbala nke ukwuu. Afọ abụọ gara aga, E kwuru m banyere mkpebi nke ezinaụlọ anyị mere iji meziwanye otu anyị si asọpụrụ Ista. Nʻezie, nke a bụ ọrụ na-aga niihu. Anyị mgbe ọbụla na-anụ ụtọ nri Sọnde Ista pụrụ iche, nkata niile Ista na ịchụ nta akwa Ista, ma anyị ka na-eme ya. Ka o sila dị, ịgbakwunye akụkụ nke ime mmụọ a kpachapụrụ anya nke lekwasịrị anya na ebe Jizọs Kraịst nọ na aja mgbaghara mmehie Ya na mmemme anyị ewetawo nguzozi dị ụtọ nye emume ncheta ndị a nke kasị nsọ nime ihe niile.
Afọ nke a ga-abụ mbọ anyị nke atọ ime ka Ista karịa ịgbakwasara na Kraịst. Dịka emume Ekeresimesi, egwuregwu ụbọchị Ista nke ezinaụlọ anyị gụnyere uwe mwụda niile, ịgụ akwụkwọ nsọ niile site na Agba Ọhụrụ na Akwụkwọ nke Mọmọn, egwu, foto niile Ista, igu nkwụ niile—na ntakịrị ọgba aghara, ọ bụrụ na m na-eme ihe nʻeziokwu. Ụmụntakịrị na ụmụ ụmụ na-agụ ma na-agụkwa otuto niile nke Sọnde Igunkwụ nke “Hosana … Ngọzi na-adịrị onye ahụ nke na-abịa nʻaha nke Onyenwe anyị; Hosana kachasị elu” ma “Nke a bụ Jizọs … nke Galili” dị mkpa ka “Udo dị nʻụwa, ihe ọma mere mmadụ” bụ nʻoge Ekeresimesị.
Anyị ugbu a na-erita ngwakọta nke ịchọmma niile. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ naanị buni niile na akwa niile Ista ugbu a na-adaba na Kraịst ahụ na ihe oyiyi nke ili efu ahụ, Onye Nzọpụta ahụ bilitere nʻọnwụ pụtara nʻogige dị nʻezi ili ahụ, na ọdịdị nke Onye Nzọpụta nihu ndị Nifaị. Anyị na-agbalịkwa ime Ista ka ọ bụrụ oge na-abụghị naanị otu ụbọchị. Anyị na-agbalị ka anyị ghọtakwuo, na-eche echiche, na ime emume nke Sọnde Igunkwụ na Ezi Fraịde na ihe omume niile dị nsọ nke mere nime Izuụka Dị nsọ.
Ista na-enye anyị ohere ịsọpụrụ ma aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst na Mbilite n’ọnwụ Ya nʻụzọ nkiti na ọn̄ụ. Obi anyị dị arọ ka anyị na-atụgharị uche ntaram ahụhụ nke Onye Nzọpụta nʻogige ahụ na nʻelu Kalvarị, mana obi anyị na-an̄ụrị ọn̄ụ ka anyị na-ahụ ili tọgbọrọ chakoo na iwu nke eluigwe “O bilitewo!”
Mbilite n’ọnwụ Nkiti
Okwu agbamume na nso nso a nke Otù Ndịisi Mbụ ka “anyị tụọ anya Ista na Mbilite n’ọnwụ nke Jizọs Kraịst—bụ nke kachasị ebube nime ozi niile e nyere mmadụ” na-egosi oke oge nke a. Ka ọ na-adị ka a na-enwe uche na-aga nihu nʻetiti Ndị ọka mmụta okpukperechi dị iche iche ị lee Mbilite n’ọnwụ ahụ nʻụzọ ihe atụ na ihe ngosi, anyị na-akwado ozizi anyị na “Mbilite n’ọnwụ ahụ pụtara na a ga-akpọlite ndị niile dịworo ndụ nʻọnwụ, na mbilite n’ọnwụ ahụ bụ ihe mere eme.” “N’ihi na dịka na Adam onye niile na-anwụ, ọbụna otu a niime Kraịst ka onye niile ga-esi dị ndụ.” Jizọs Kraịst merịrị ike niile nke ọnwụ maka mkpụrụ obi ọ bụla dị ndụ.
Anyị nʻezie guzoro na ịtụnanya na amara Jizọs na-enye anyị. Anyị na-anabata okwu Ya niile na “ịhụnaanya dị elu karịa ka mmadụ enweghị karịa nke a, na mmadụ ga-atọgbọ ndụ ya maka ndị enyi ya.”
C.S. Lewis kwuru na “ị kwusaa ozi ọma Kristian pụtara na [nye Ndị ozi niile] ikwusaa Mbilite nʻọnwụ ahụ. Mbilite n’ọnwụ ahụ bụ isi okwu nozizi Ndị Kristian ọ bụla a kọrọ nime Ọrụ Ndịozi. Mbilite n’ọnwụ ahụ, na ihe ndị nsonazụ ya niile, bụ ʻozi ọmaʻ ma ọ bụ ozi ọma nke ndị Kristian wetere.”
A na m ekwusaa na “ e nwere mbilite n’ọnwụ, … ya mere ili enweghị mmeri, ma ihe ọgbụgba nke ọnwụ ka e loro n’ime Kraịst.”
Mmechi na Akaebe
Na mmechi, A na m agba ama na ndị niile nabatara ọkpụkpọ oku sitere nʻaka onye amụma anyị dị ndụ na ndị ndụmọdụ ya niile ka ha kpachapụrụ anya na-echeta mmemme niile dị nsọ nke Ista na-anọchi anya ya ga-achọpụta na njikọ ha na Jizọs Kraịst na-esiwanye ike.
Naanị ụbọchị ole na ole gara aga, a mụtara m banyere otu nne nne ya na nwa nwa ya dị afọ anọ gụgharịrị akụkọ Ista site na-iji ihe atụ dị mfe nke ili, nkume nke kpuchiri ili ahụ, Jizọs, Meri, ndị na-eso ụzọ niile, na mmụọ ozi ahụ. Nwantakịrị nwoke ahụ lere anya ma gee ntị nke ọma ka nnenne ya na-ekerịta olili ahụ, mmechi na mmeghe nke ili, na ogige ahụ nke Mbilite n’ọnwụ. O jiri nlezianya kwughachi akụkọ ahụ nʻụzọ zuru ezu ka ọ na-emegharị ihe ndị ahụ nʻonwe ya. Mgbe oge a dị ụtọ gasịrị, a jụrụ ya ma ọ maara ihe kpatara anyị ji enwe Ista. Nwatakịrị ahụ lelitere anya elu wee were echiche dị ka nwata zaa, “Nihi Ọ dị ndụ.”
A na m atụkwasị ọgbụgba ama m na nke ya—na nke unu, na nke ndị mmụọ ozi na ndị amụma niile, na Ọ bilitere ma na Ọ dị ndụ, nke m na-agba ama ya n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.