Ọgbakọ Zuru ọha
Inwe mmekọrịta anyị na Onyenwe anyị
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Inwe mmekọrịta anyị na Onyenwe anyị

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere na-ama ọkwa ụkpụrụ nke inwe mmekọrịta n’uju n’etiti nwanyị na nwoke, ma nime ndụ pụrụ ịnwụ anwụ na nime ebighị ebi niile.

Niime ọnwa ole ma ole mbụ nke alụmdi na nwunye anyị, ezigbo nwunye m kwupụtara na ya chọrọ ịmụ egwú. Na nzube ime ya obi ụtọ, E kpebiri m ịhazi nnukwu, ihe ịtụnanya sitere n’obi maka ọdị m n’obi. A gara m nebe a na-ere ngwá egwú ma zụtara ya ube ka ọ bụrụ onyinye. E ji m obi ụtọ tinye mpempe akwụkwọ ejiri zụọ ya niime igbe nwere ọmarịcha une wee nye ya ya, na-atụ anya mmeghachi omume nke ekele maka di ya na-ahụ ya n’anya ma na-elezi ya anya nke ukwuu.

Mgbe o mepere obere igbe ahụ ma hụ ihe dị nime ya, o jiri ịhụnanya lee m anya wee sị, “Oo, ezigbo m, ị dị egwu! Mana ka m jụọ gị otu ajụjụ: nke a ọ bụ onyinye ka ọ bụ ụgwọ?” Mgbe anyị tụnyekọtachara uche maka ihe ijuanya ahụ, anyị kpebiri ịkagbu ihe ahụ a zụtara. Anyị nọọrọ na-ebi n’elu mmefu ego nke nwa akwụkwọ, di ka ọ dị n’ebe ọtụtu ndị na-eto eto lụrụ ọhụrụ. Nhụmiihe nke a nyeere m aka ịmata ịdị mkpa nke ụkpụrụ ahụ dị n’inwe mmekọrịta n’uju dị na mmekọrịta alụm di na nwunye na otu itinye ya na omume nwere ike isi nyere mụ na nwunye m aka inwe otu obi na otu uche.1

Ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere na-ama ọkwa ụkpụrụ nke inwe mmekọrịta n’uju n’etiti nwanyị na nwoke ma nime ndụ pụrụ ịnwụ anwụ na nime ebighị ebi niile. Na-agbanyeghị na onye ọbụla nwere agwa na ọrụ nile dị iche iche eji mara ha, nwanyị na nwoke na-emejupụta oke mkpa na ọrụ dị mkpa nime atụmatụ obi ụtọ nke Chineke maka ụmụ Ya.2 Nke a pụtara ihe site na mmalite mgbe Onyenwe anyị mara ọkwa “na ọ dịghị mma ka nwoke ahụ nọdụ naanị ya; ya mere [Ọ ga] emere ya onye otu na-enye aka.”3

Nime atụmatụ nke Onyenwe anyị, “onye otu na-enye aka” bụ otu onye nsiso ga-eje ije ubu na ubu ya na Adam n’uju inwe mmekọrịta.4 N’ezie Iv bụ ngọzi si n’eluigwe na ndụ Adam. Site na ọdịdị ya si na chi na agwa nke ime mmụọ, ọ kpaliri Adam ka ya na ya rụkọọ ọrụ iji mezuo atụmatụ obi ụtọ nke Chineke maka ụmụ mmadụ nile.5

Ka anyị tụlee ụkpụrụ abụọ dị oke mkpa ndị na-ewusi mmekọrịta dị n’etiti nwoke na nwanyị ike. Ụkpụrụ nke mbụ bụ anyị nile bụ otu n’anya Chineke.6 Dị ka otu ozizi ozi ọma siri dị, ọdịiche dị n’etiti nwanyị na nwoke adịghị emebi nkwa ebigh ebi nile nke Chineke kwere ụmụ Ya ndị nwoke na ndị nwanyị. Otu onye enweghị ohere dị ukwuu maka ebube selestịal karịa onye nke ọzọ nime ebighị ebi nile.7 Onye Nzọpụta n’Onwe Ya na-akpọ anyị nile, ụmụ Chineke, “ịbịakwute Ya ma kere oke n’ịdị mma Ya; ma ọ dịghị kwa onye ọbụla bịakwutere Ya Ọ na-ajụ.”8 Ya mere, niime ọnọdụ nke a, a na-ewere anyị nile ka ndị ha otu n’ihu Ya.

Mgbe ndị di na nwunye ghọtara ma tinye ụkpụrụ nke a n’ọrụ, ha anaghị edebe onwe ha dị ka onyeisi ma ọ bụ osote onyeisi nke ezi na ụlọ ha. Ọ dịghị ịdị elu ma ọ bụ ịdị ala dị na mmekọrịta alụm di na nwunye, ma ọ dịghịkwa onye ọbụla niime ha na-ebu ụzọ aga ma ọ bụ na-eso onye nke ọzọ n’azụ. Ha na-eje ụkwụ na ụkwụ, dị ka ha hatara, ụmụ Chineke mụrụ n’eluigwe. Ha na-aghọ otu n’echiche, ọchịchọ, na ebumnobi ha na Nna anyị nke Eluigwe na Jizọs Kraịst,8 na-edu ma na-eduzikọta otu ezi na ụlọ ọnụ.

N’ịha otu n’inwe mmekọrịta, “ịhụnaanya abụghị ihe onwunwe, kama itinye aka … akụkụ nke isonye n’okike ahụ nke bụ ọkpụkpọ oku nke anyị bụ mmadụ.”10 “Site n’ezi nsonye, di na nwunye na-abụ otu nime ịdị n’otu nke ‘ọchịchị ebighị ebi’ nke ‘na-enweghị ụzọ nke nkwagide’ ga na-asọpụ site na ndụ nke ime mmụọ ruo ha na ụmụ ụmụ ha ‘site n’ebighị ebi ruo n’ebighị ebi.’”11

Ụkpụrụ nke abụọ dị mkpa bụ Iwu Ọlaedo, nke Onye Nzọpụta kụziri na Okwu Chukwu Ekwuru n’Elu Ugwu: “Ma dị ka ị chọọ ka ụmụ mmadụ meere gị, mekwaara ndị ọzọ otu ahụ.”12 Ụkpụrụ nke a na-egosi agwa ịdị na-emekọrịta, inyekọrịta ihe na nkwụghachi, ịdị notu, na ndabere ma ọ dabeere n’iwu nsọ nke abụọ dị ukwuu: “Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”13 Ọ dabara ya na ejiri mara Ndị nke Kraịst ndị ọzọ dị ka ogologo ntachi obi, ịdị nwayọ, ịdị nwayọọ n’obi, na obi ọma.

Iji ghọta nke ọma itinye ụkpụrụ nke a n’ọrụ, anyị nwere ike lee anya na njikọ dị nsọ ma dị ebighị ebi nke Chineke hiwere n’etiti nne na nna mbụ anyị, Adam na Iv. Ha ghọrọ otu anụ ahụ,14 na-ekewapụta ntụ nke ịdị notu nke nyere ha ohere iji na-emekọ ihe ọnụ site na nkwanye ugwu, obi ekele, na ịhụnanya, na-echefu onwe ha ma na-achọ ọdịmma onwe ha na njem ha ruo mgbe ebighị ebi.

Ụdịrị agwa ndị ahụ bụ ihe ndị anyị na-agbalịsi ike achọ n’alụm di na nwunye dị n’otu taa. Site na nrachi nke tempụl nwoke na nwanyị na-abanye n’usoro alụm di na nwunye dị nsọ n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ dị ebighị ebi. Site n’usoro nke ọkwa nchụaja nke a, a na-enye ha ngọzi nile dị ebighị ebi na ike si na chi iji duzie ihe omume nke ezi na ụlọ ha dị ka ọgbụgba ndụ nile ha meworo. Site n’oge ahụ gawa, ha na-aganiihu na-enyere onwe ha aka ma n’inwe mmekọrịta zuru oke ha na Onyenwe anyị, karịsịa ni’he gbasara onye ọbụla nime ọrụ ha Chineke họpụtara nke inye ọzụzụ na nlekọta niime ezi na ụlọ ha.15 Ịzụlite na nlekọta bụ ọrụ ndị jikọrọ ọnụ na nke jikọtara ọnụ, nke pụtara na ndị nne na ndị nna “kwesịrị inyere ibe ha aka dị ka ndị mmekọ nha anya”16 ma na-ekeri nduzi ziri ezi nime ebe obibi ha.

“Ịzụlite pụtara inye nri, ịkuzi ihe, na ịkwado” ndị otu ezi na ụlọ, nke a na-eme site n’inyere ha aka ị “mụta eziokwu nile nke oziọma ma wulite okwukwe nime Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst” na-agbata ebe ịhụnaanya dị. Ị bụ onyeisi pụtara inyere ndị ezi na ụlọ aka ịlaghachi ibi n’ebe Chineke nọ. A na-eme nke a site na ije ozi na inye nkuzi jiri nwayọ, ịdị nwayọọ n’obi, na ezi ịhụnaanya.” Ọ gụnyekwara “iduzi ndị otu ezi na ụlọ n’ekpere mgbe nile, ọmụmụ ihe nke ozi ọma, na akụkụ ndị ọzọ esi efe ofufe. Ndị nne na nna na-arụkọ ọrụ n’ịdị n’otu,” na-agbaso ọmụmaatụ nke Jizọs Kraịst, “iji rụzuo [nnukwu ọrụ abụọ] ndị a.”17

Ọ dị mkpa ịhụ na ọchịchị dị nime ezi na ụlọ na-agbaso ụkpụrụ nke onye petrak, dị iche n’akụkụ ụfọdụ site n’aka ndị isi ndu n’ọkwa nchụaja nime Nzukọ nsọ.18 Ụkpụrụ nke onye petrak ochie gunyere na ndị nwunye na ndị di ga-aza ajụjụ ozugbo n’ihu Chineke maka nrụzu ọrụ ha dị nsọ nime ezi na ụlọ. Ọ chọrọ inwe mmekọrịta zuru oke—ịdị njikere na nrube isi na ụkpụrụ ọ bụla nke ezi omume na ịza ajụjụ—ma na-enye ohere dị iche iche maka mmepe nime gburugburu ebe ịhụnaanya na mmekọrịta inye aka dị.19 Ọrụ ndị a pụrụ iche anaghị egosi ịnwe ọkwa ma na-ewepụ kpamkpam ụdị mmetọ ọ bụla ma ọ bụ iji ikike eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.

Nhụmiihe nke Adam na Iv, mgbe ha hapụrụ Ubi nke Iden, na-egosi n’ụzọ magburu onwe ya echiche nke ndabere dị n’etiti nne na nna n’ịzụlite na ilekọta ezi na ụlọ ha. Dị ka a kuziri nime akwukwọ nke Moses, ha rụkọrọ ọrụ ọnụ iji ọsụsọ nke iku anya ha kọọ ala iji na-egbo mkpa ọdịmma anụ ahụ nke ezi na ụlọ ha;20 ha mụtara ụmụ nime ụwa;21 ha kpọkukatara aha Onyenwe anyị ọnụ ma nụ olu Ya “site n’ụzọ ahụ chuwere ihu n’ebe Ubi nke Iden”;22 ha nabatara iwu nsọ nile Onyenwe anyị nyere ha ma gbakọta mbọ nke ukwuu irube isi na ha.23 Ha wee “mee ka ụmụ ha ndị nwoke na ndị nwanyị mata ihe[ndị a]”24 ma “ha akwụsịghị ịkpọkukata Chineke” ọnụ dị ka otu mkpa ha siri dị.25

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, inye ọzụzụ na nlekọta bụ ohere dị iche iche, ọ bụghị usoro mgbochi ịkpa oke. Otu onye nwere ike inwe ọrụ maka ihe mana nwere ike ọ bụghị naanị ya na-eme ya. Mgbe ndị nne na nna hụrụ onwe ha n’anya ghọtara nke ọma ọrụ abụọ ndị a bụ isi, ha ga-etikọta aka gbalịsie ike ichebe na ịhụ maka ọdịmma nke anụ ahụ na nke mmetụta uche nke ụmụ ha. Ha na-enyekwara ha aka izute ihe egwu nke ime mmụọ dị n’oge anyị taa site na iji okwu dị mma nke Onyenwe anyị zulite ha dị ka e kpugheere ndị amụma Ya.

Na-agbanyeghị na di na nwunye na-akwado onwe ha n’ọrụ niile Chineke họpụtaara ha, “nkwarụ, ọnwụ, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ pụrụ ime ka onye ọbụla nwee ndaba.”26 Mgbe ụfọdụ otu di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ nke ọzọ ga-enwe ọrụ nke ịrụ ọrụ abụọ n’otu oge, ma ọ bụ nke nwa oge ma ọ bụ nke na-adịgide.

Na oge na-adịghị anya ezutere m otu nwanne nwanyị na otu nwanne nwoke nke onye ọbụla niime ha bi n’ọnọdụ a. Dị ka ndị nne na nna nanị ha na-azụ ụmụ,onye ọ bụla n’ime ha n’ime ezi na ụlọ ha nakwa na n’inwe mmekọrịta ha na Onyenwe anyị, ekpebiwo itinye ndụ ha na nlekọta ihe nke ime mmụọ na nke anụ ahụ nke ụmụ ha. Ha echefubeghị ọgbụgba ndụ nke tempụl ha na Onyenwe anyị mere na nkwa ebighị ebi Ya niile na-agbanyeghị ịgba alụkwaghim ha niile. Ha abụọ achọwo enyem aka nke Onyenwe anyị n’ihe nile ka ha na-agba mbọ esepụghị aka na-edi ihe ịma aka ha nile ma na-eje ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ. Ha tụkwasịrị obi na Onyenwe anyị ga-egbo mkpa ha nile, ọ bụghị nanị na ndụ nke a kama ruo mgbe ebighị ebi. Ha abụọ azụlitewo ụmụ ha site n’iji nwayọọ, ịdị nwayọọ n’obi, na ezi ịhụnaanya, kụziere ha ihe ọbụna mgbe ha na-enwe ọnọdụ ndị tara akpụ na ndụ. Site na ihe m maara, nne na nna abụọ a nanị ha na-azụ ụmụ adịghị ata Chineke ụta maka ihe ndabara ha. Kama, ha na-atụ anya ya site na inwe ihé nke olile anya na ntụkwasị obi zuru oke maka ngozi nile nke Onyenwe anyị dobeere ha.27

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, Onye Nzọpụta setịpụrụ ihe atụ zuru oke nke ịdị n’otu na nkwekọ nke ebumnobi na ozizi ya na Nna anyị nke Eluigwe. O kpere ekpere maka ndị na-eso ụzọ Ya, sị “Ka ha niile wee bụrụ otu; dị ka gị onwe gị, Nna, nọ nime m, ma Mụ nọ nime gị, ka ha n’otu aka ahụ nọrọ nime anyị: … ka ha wee bụrụ otu, dịka anyị bụ otu. ”28

A na m agbara unu ama na dị ka anyị—ndị nwanyị na ndị nwoke—na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ezigbo inwe mmekọ ha otu, anyị ga-enweta ọńụ na ịdị n’otu nke Onye Nzọpụta kuziri dị ka anyị na-emejupụta ọrụ si na chi dị na mmekọrịta nile alụm di na nwunye anyị. Ana m ekwe unu nkwa, n’aha nke Kraịst, na a “ga-ejikọta obi nile ọnụ n’ịdị n’otu na n’ịhụnanya n’ebe onye na ibe ya nọ,”29 anyị ga-enweta ọńụ karịa na njem anyị ruo na ndụ ebighị ebi, ma ike anyị n’ijere ibe anyị ozi ma iso ibe anyị ga-amụba nke ukwuu.30 Ana m agba aka ebe nye eziokwu ndị a n’aha dị nsọ nke Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst, amen.