Ọgbakọ Zuru ọha
Nkwado nke Ndị Ji Ikike Zuru ọha, Ndị Mpaghara Iri Asaa, na Ndị Ọrụ Zuru ọha
Ọgbakọ zuruọha Ọktoba 2022


Nkwado nke Ndị Ji Ikike Zuru ọha, Ndị Mpaghara Iri Asaa, na Ndị Ọrụ Zuru ọha

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, ọ bụ ohere dị iche iwete Ndị Ji Ikike Zuruọha, Ndị Mpaghara Iri Asaa, na Ndị Ọrụ Zuruọha nke Nzukọ ahụ maka ntuli aka nkwado unu.

Biko gosịpụta nkwado unu n’ụzọ ahụ esi eme ya n’ebe ọbụla unu nọ. Ọ bụrụ na-enwere ndị na-akwadoghị ntụpụta ọbụla, anyị na-arịọ ka ị kpọtụrụ onyeisi stek gị.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo Russell Marion Nelson dị ka onye amụma, onye ọhụụ, na onye mkpughe na Onyeisi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị Nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a; Dallin Harris Oaks dị ka Onye Ndumọdụ nke Mbụ n’ime Otu Ndịisi Mbụ; na Henry Bennion Eyring dị ka Onye Ndumọdụ nke Abụọ n’ime Otu Ndịisi Mbụ.

Ndị ahụ ọ masịrị nwere ike gosipụta ya.

Ndị ahụ megidere, ọ bụrụ n’enwere onye ọbụla, nwere ike gosipụta ya.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo Dallin H. Oaks dị ka Onyeisi nke Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ na M. Russell Ballard dị ka Onyeisi Nnọchi anya nke Kworum Ndị Ozi Iri na Abụọ.

Ndị ahụ ọ masịrị, biko gosipụta.

Onye ọbụla megidere nwere ike gosipụta ya.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo ndị a na-esote dị ka ndị otu nke Kworum Ndị ozi Iri na Abụọ: M. Russell Ballard, Jeffrey R. Holland, Dieter F. Uchtdorf, David A. Bednar, Quentin L. Cook, D. Todd Christofferson, Neil L. Andersen, Ronald A. Rasband, Gary E. Stevenson, Dale G. Renlund, Gerrit W. Gong, na Ulisses Soares.

Ndị ahụ ọ masịrị, biko gosipụta ya.

Onye megidere nwere ike si otua gosipụta.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo Ndị ndụmọdụ n’ime Otu Ndịisi Mbụ na Ndị Kworum nke Ndị Ozi Iri na Abụọ dị ka Ndị amụma, Ndị ọhụụ, na Ndị mkpughe.

Ndị niile ọ masịrị, biko gosipụta ya.

Onye ọ masịghị, ọ bụrụ n’enwere onye ọbụla, soro otu ụdị akara ahụ.

Anyị atọhapụwo n’ọrụ Ndị Okenye J. Weatherford T. Clayton, LeGrand R. Curtis Jr., Randy D. Funk, Christoffel Golden, Walter F. González, Larry S. Kacher, Lynn G. Robbins, na Josef W. Sitati dịka Ndị Iri Asaa Ji Ikike Zuruọha ma chie ha ọkwa emeritus.

Ndị niile ọ masịrị igosipụta obi ekele nye Ụmụnne Ndị nwoke Ndịa na ndị nwunye ha na ndị ezi na ụlọ ha maka afọ ije ozi ha niile n’ụzọ pụrụ iche, nwere ike mee otu a site n’iweli aka.

Anyị jikwa obi ekele echeta ndị Mpaghara Iri Asaa ndị rụzuworo ọrụ ije ozi ha n’oge afọ nke a gara aga na ndị e nwere ike ịhụ aha ha na newsroom.ChurchofJesusChrist.org.

Ndị ahụ ọ masịrị isoro n’igosipụta obi ekele nye ụmụnne ndị nwoke ndịa maka ije ozi ha bụ ịgba nwere ike gosipụta ya.

A na-atụpụta ka anyị kwadoo ndị ọzọ Ji Ikike Zuruọha na Ndị Mpaghara Iri Asaa, tinyekwara ndị Mpaghara Iri Asaa isii e mere ọhụrụ a mara ọkwa ha na mbido izu ụka nke a nime newsroom.ChurchofJesusChrist.org, na Ndị Ọrụ Zuruọha dịka otu ha siri dị n’oge ugbua.

Ndị niile ọ masịrị nwere ike mee otua site na-iweli aka elu.

Ndị megịdere, ọbụrụ n’enwere onye ọbụla.

Unu emela, ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, maka okwukwe unu nogidere na ekpere niile n’isi ndị ndu nke Nzukọ nsọ ahụ.

Mgbanwe nke ndị Iri Asaa Mpaghara

Ndị Iri Asaa ndịa sotere ka akwadoro n’oge ọgbakọ nke ndị ndu nke emere dị ka otu akụkụ nke ọgbakọ zuru ọha:

Ricardo J. Battista, Willy Binene, Bernhard Cziesla, Nathan R. Emery, Sione Tuione, Yves S. Weidmann.

Ndị Mpaghara Iri asaa ndị a na-esote ka atọghapụrụ na Ọgọst 1, 2022:

Luis R. Arbizú, Michael V. Beheshti, David A. Benalcázar, Berne S. Broadbent, Kevin E. Calderwood, Luciano Cascardi, Ting Tsung Chang, Ariel E. Chaparro, Pablo H. Chavez, Raymond A. Cutler, José L. Del Guerso, Alessandro Dini Ciacci, Carlos R. Fusco Jr., Jorge A. García, Gary F. Gessel, Karl D. Hirst, Ren S. Johnson, Jay B. Jones, Paul N. Lekias, Artur J. Miranda, Elie K. Monga, A. Fabio Moscoso, Yutaka Nagatomo, Juan C. Pozo, Anthony Quaisie, Martin C. Rios, Sandino Roman, Johnny F. Ruiz, Rosendo Santos, Gordon H. Smith, K. Roy Tunnicliffe.

Okenye Levi W. Heath na Okenye ‘Inoke F. Kupu, ndị naara eje ozi dị ka Ndị Mpaghara Iri Asaa, nwụrụ na 2022.