Jizọs Kraịst

Ekpere maka Orịrị nsọ

  • Ọdịnaya niile

  • Ngozi nye Achịcha

  • Ngozi nye Mmiri

Ekpere maka Orịrị nsọ


Ekpere maka Orịrị nsọ

  • Ngozi nye Achịcha

    O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, anyị na-arịọ gị n’aha nke Ọkpara gị, Jisus Kraịst, Ka ị gọzie ma doo achịcha nke a nsọ nye mkpụrụ obi nile nke ndị nile ga-eketa oke na ya; ka ha wee rie na ncheta nke arụ nke Ọkpara gị, na gbaara gị aka-ebe, O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, na ha nọ na njikere iwekwasị onwe ha aha nke Ọkpara gị, ma na-echeta ya oge nile, ma na-edebe iwu-nsọ ya nile nke o nyeworo ha, ka ha wee na-enwe Mụọ ya oge nile ịnọnyere ha. Amen.


  • Ngozi nye Mmiri

    O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, anyị na-arịọ gị n’aha nke Ọkpara gị, Jisus Kraịst, Ka ị gọzie ma doo mmiri nke a nsọ nye mkpụrụ obi nile nke ndị nile ga-ańụ site na ya, ka ha wee mee ya na ncheta nke ọbara nke Ọkpara gị, nke a kwafuru n’ihi ha; ka ha wee gbaara gị aka-ebe, O Chineke, Nna nke Ebighi-ebi, na ha na-echeta ya oge nile, Ka ha wee nwe Mụọ ya ịnọnyere ha. Amen.