“Traka Ọmụmụ ihe nke Onwe,” EnglishConnect 1 maka Ndị Mmụta (2022)
“Traka,” , EnglishConnect 1 maka Ndị Mmụta
Personal Study Tracker
Traka Ọmụmụ ihe nke Onwe
Dee ebumnuuche gị maka ịmụ Bekee.
Ebumnuuche: Ana m achọ ịmụ Bekee niihi na:
I nwere ike melite ike gị ịmụ ihe site na-isoro mgbalị gị ma hiwe ebumnuuche iji melite. Jiri “Traka Ọmụmụ ihe nke Onwe” ji soro mgbalị gị niile. Mgbe ihe mmụta nke ọbụla gasịrị, hiwe ebumnuche dị mfe. N̄ụrịa na ọganiihu gị; mgbalị niile na-akpọta gị nsọ nʻebumnuuche gị.
Mgbalị Kacha Nta
Mgbalị Buturu Ibu
Mgbalị Pụtara Ihe
“Traka Ọmụmụ ihe nke Onwe” enwere ike ibipụta
Example
Ọmụmaatụ
|
Lesson |
Study the Principle of Learning |
Memorize Vocabulary |
Practice the Patterns |
Practice Daily |
My Goal |
|---|---|---|---|---|---|
Lesson 1 | Study the Principle of Learning | Memorize Vocabulary | Practice the Patterns | Practice Daily | My Goal Gụpụta Ndubata ahụ. Mezuo nkeji “Ọmụmụ ihe nke Onwe” maka ihe mmụta 2. |
Lesson 2 | Study the Principle of Learning | Memorize Vocabulary | Practice the Patterns | Practice Daily | My Goal Mụọ ụkpụrụ nke mmụta tupu ihe mmụta ahụ. |
Lesson 3 | Study the Principle of Learning | Memorize Vocabulary | Practice the Patterns | Practice Daily | My Goal Mgbe m na-ekpe ekpere, aga m eji mkpụrụokwu akpaokwu Bekee. |
Study Suggestions
Ntụnyeuche Ọmụmụ ihe
Tulee iji ntụnyeuche nʻokpuru iji melite ọmụmụ ihe gị.
Study the Principle of Learning
Mụọ Ụkpụrụ nke Mmụta
-
Kpee ekpere. Jiri ekpere bido ma mechie ọmụmụ ihe gị. Rịọ Chineke inyere gị aka ghọta ma tinye nʻọrụ ụkpụrụ ahụ.
-
Gee Mmụọ ahụ ntị. Gee ntị na echiche gị niile na mmetụta gị niile, ọbụrụgodi na ọ dị ka ha emetụtaghị ihe ị na-agụ. Dekọta echiche na metụta gị niile. Mee ihe Mmụọ na-akpọku gị ime.
-
Dedata okwu na nkebiokwu mkpatemmụọ niile. I nwere ike chọta ụfọdụ okwu na nkebiokwu nke bara uru nʻonwe ma na-akpate ma na-akwalite gị Dee ha nʻebe ị ga na-ahụ ha. Tinye ha nʻenyo gị ma ọ bụ nʻekwe ntị gị.
-
Tinye nʻọrụ ụkpụrụ nke mmụta. Tulee otu i nwere ike i si tinye nʻọrụ ụkpụrụ nke mmụta, nn̄ọmị niile, na akwụkwọ nsọ nye ndụ gị. Dekọọ ihe ị mụrụ dị ka i na-etinye ụkpụrụ nke mmụta nʻọrụ.
-
Gụkwuo. Gụọ akwụkwọ nsọ ma ọ bụ okwu ọgbakọ niile metụtara ụkpụrụ nke mmụta.
-
Mụọ okwu ọhụrụ. Họrọ ụfọdụ mkpụrụokwu sitere na ụkpụrụ nke mmụta nke ị chọrọ ịmụ na Bekee. Chọgharịa mkpụrụokwu ndị ahụ. Gwa ndị mmụta ndị ọzọ banyere ihe mkpụrụokwu na nkebiokwu ndị ahụ pụtara nye ha.
Memorize Vocabulary
Buru Akpaokwu nʻisi
-
Lekwasị anya na mpụtara na mkpọpụta. Mụọ ikwugharị okwu ahụ nʻolu dara ụda ma chee maka mpụtara nke okwu ahụ. Mụọ mkpọpụta nke okwu nke ọbụla ma mụọ ya tutu ruo gị akpọpụta ya nke ọma. Gaaniihu tutu ruo mgbe i nwere ike ikwu okwu ahụ nʻobisike ma mara ihe ọ pụtara.
-
Jiri flashkaadị mụọ. Jiri kaadị nootu (ma ọ bụ app) ji mepụta flashkaadị. Dee mkpụrụokwu nʻotu akụkụ na nkọwa, ntụgharị asụsụ, ma ọ bụ esemese nʻakụkụ nke ọzọ. Nkwugharị bụ ntụghe nye iburu akpaokwu nʻisi.
-
Mụọ mkpụrụokwu niile dị niime ahịrịokwu. Mụọ ikwu mkpụrụokwu ị na-amụ niime ahịrịokwu. I nwere ike jiri nsoro ahịrịokwu niile ji mụọ mkpụrụokwu niile ị na-amụ.
-
Tinye mkpụrụokwu nʻọrụ. Chee maka ọnọdụ niile mgbe ị ga-eji mkpụrụokwu ahụ na ndụ gị kwa ụbọchị. Mụọ ọnọdụ ahụ tutu ruo mgbe ọ dị gị ka ihe eke iji mkpụrụokwu ahụ. Dị ka ị na-aga ọrụ, ụlọakwụkwọ, ụlọahịa, ma ọ bụ ebe ndị ọzọ, jiri mkpụrụokwu ndị ahụ niime obi gị iji kọwaa ụmụ ihe.
-
Mata mkpụrụokwu niile. Lee ma gee ntị maka mkpụrụokwu ọhụrụ dị ka ị na-aga nʻụbọchị gị. I nwere ike mụọ site nʻihe onyonyo, nlekiri TV, akwụkwọ, podcasts, ma ọ bụ egwu. Dedata mkpụrụokwu ọhụrụ niile.
-
Mụtakwuo. Jiri ọkọwa okwu ji mụtakwuo banyere mkpụrụokwu ọhụrụ. Mụọ nkọwasị niile, nkejiasụsụ, nkeji mkpụrụokwu, mkpọpụta, na ahịrịokwu ịma atụ.
-
Nyochaa. Wepụta oge na-enyochagharị ugboro ugboro mkpụrụokwu niile ị mụtaworo oge gara aga. Nke a ga-enyere gị aka hụta ole ị mụtaworo ma ghara ichefu okwu ọbụla.
Practice the Patterns
Mụta nsoro ahụ niile
-
Lekwasị anya na mpụtara na mkpọpụtazi. Mụọ ikwugharị ahịrịokwu ahụ nʻolu dara ụda site na nsọrọ ahụ ma chee maka mpụtara nke ahịrịokwu ahụ. Gaaniihu tutu ruo mgbe i nwere ike ikwu ahịrịokwu ahụ nke ọma nʻobisike ma mara ihe ọ pụtara.
-
Rekọọdụọ onwe gị. Rekọọdụọ onwe gị mgbe ị na-ajụ ajụjụ ma na-aza ajụjụ niile nʻekwe ntị gị. Gee rekọọdụ ahụ ma n̄aa ntị nye mkpọpụtazi na mkpọpụta gị.
-
Soro otu onye mmekọ mụọ. Mụọ iji nsọrọ niile ji jụọ ajụjụ ma zaa ajụjụ gị na otu enyi. I nwere ike mụọ nʻonwe ma ọ bụ nʻekwe ntị. Mụọ iji nsọrọ niile dị ka i na-ede ozi nye otu enyi.
-
Chee ma kwuo banyere nsoro niile. Kedụ ihe ị matara banyere otu Bekee si arụ ọrụ. Kedụ otu Bekee si yie asụsụ gị? Kedụ otu Bekee si dị iche site nʻasụsụ gị? Kedụ otu i nwere ike iji nsoro ahụ sitere na ihe mmụta nʻọnọdụ dị iche iche?
-
Jiri akụrụngwa ndị ọzọ. Akwụkwọ ụtọasụsụ niile, apps, websites, na ndị mmụta ndị ọzọ nwere ike nyere gị aka mụtakwuo banyere nsọrọ ụtọasụsụ Bekee.
-
Mata nsoro niile. Lee anya ma gee ntị maka nsọrọ niile ị na-amụ mgbe ị na-agụ ma ọ bụ na-ege ntị na Bekee.
Practice Daily
Mụọ Kwa ụbọchị
-
Hiwe usoro. Tụọ atụmatụ mgbe na ebe ị ga-anọ amụ ihe ụbọchị ọbụla ma mee ya. Inyere gị aka cheta, dee ebumnuuche gị niime nkwupụta nke “mgbe”. Ịma atụ, “Mgbe m , mụ .” Ebe a bụ ọmụmaatụ: “Mgbe m na-agba ụgbọala bọọsụ, ana m enyocha akpaokwu.”; “Mgbe m na-esi nri anyasị, ana m akọwa ihe na-eme na Bekee.”; na “Mgbe m na-ekpe ekpere, ana m ekwu ka ha ra otu m nwere ike na Bekee.”
-
Mee ihe omume kwa ụbọchị na Bekee. Chọta ụzọ ndị eji edochi asụsụ ala gị jiri Bekee nʻihe omume gị kwa ụbọchị. Ịma atụ, mgbe ị na-ege ntị nʻegwu, gee na Bekee. Nchepụta ndị ọzọ: lelee ihe nkịrị na Bekee ma ọ bụ ndepụta asụsụ Bekee, gbanwee nhazi ekwe ntị gị na Bekee, ma gụọ akwụkwọ nsọ na Bekee.
-
Guo. Gụọ ka ha ra otu i nwere ike na Bekee. Gụọ akwụkwọ nsọ, okwu ọgbakọ zuru ọha, magazin niile, blog niile, ọkwa niile, na ozi ndị ọzọ na Bekee.
-
Gee ntị. Gee ntị nke ọma ka ha ra otu i nwere ike. Gee podcast niile, akwụkwọ nsọ, okwu niile, ngosịpụta niile, vidiyo niile, ngosị TV niile, ma ọ bụ ihe nkiri niile.
-
Kwuo okwu. Chọta ndị enyi, ezi na ụlọ, na ndị otù ọrụ ma mụọ ikwuru ha. Kesaa ihe ị mụtaworo ma na-eme iji mụọ Bekee. Kepụta chat otù ma ziga ozi ndị ekwuru ekwu.
-
Dee. Chọta ohere iji dee ihe na Bekee. Bido ide jonaalụ kwa ụbọchị ma ọ bụ kepụta chat otù. Jiri ahịrịokwu nile na akpaokwu ndị ị na-amụ.
-
Mezuo ihe omume niile. Mee ihe omume niile na mnwale niile nʻikuku na englishconnect.org ma ọ bụ niime Akwụkwọ Arụmarụ EnglishConnect.