Ọgbakọ Zuru ọha
Ọ Bụ N’enweghị Balm na Gilead?
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2021


Ọ Bụ N’enweghị Balm na Gilead?

Ike ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta abụghị nnọọ naanị ike Ya ịgwọ ahụ anyị, kama elemanya ọbụna dị mkpa karịa, ike Ya ịgwọ obi anyị.

Obere oge mgbe mishọn mụ gasịrị, mgbe m bụụrụ nwa akwụkwọ na Mahadum Brigham Young, a natara m oku ekwe ntị site n’aka nna m. Ọ gwara m na achọpụtara na ya nwere ọrịa kansa ụkpụfụrụ ma na n’agbanyeghị ohere ya ịlanarịnyandụ adịghị mma, o kpebiri inwete ọgwụgwọ ma laghachi na ihe omume niile nke ndụ kwesịịrị ya. Oku ekwe ntị ahụ bụụrụ oge echiche nye m. Nna m abụworịị bishọp m, enyi m, na onye ndụmọdụ m. Dịka nne m, ụmụnne m, na mụ onwe m tugharịrị uche banyere ọdịniihu, ọ dị ka olileanya adịghị. Nwanne m nwoke nke nta, Dave, na-eje ozi mgbasa ozi ọma na New York ma soro n’ebe dị anya n’ime ihe niile ndịa na-eme na ezi na ụlọ siri ike.

Ndị n’ewete ọgwụgwọ ahụike nke oge tụrụ ero ịwa ahụ iji nwaa ibelata mgbasa ọrịa kansa ahụ. Ezi na ụlọ anyị kpesịrị ekpere ike ma bụọ ọnụ maka ọrụ ebube. Echere m na anyị nwere okwukwe zuru ezu na nna m nwere ike nwete ọgwụgwọ. Naanị tupu ịwa ahụ ahụ, nwanne m nwoke nke okenye, Norm, na mụ onwe m nyere nna m ngọzi. Na okwukwe niile anyị nwere ike ikpokọta, anyị kpere ekpere na a ga-agwọ ya.

Ịwa ahụ ahụ ka e yiri iwe ọtụtụ awa, mana naanị obere oge gasịrị, dọkịta ahụ bịara n’ime ụlọ nchere oge izute ezi na ụlọ anyị. Ọ gwara anyị na dịka ha bidoro ịwa ahụ ahụ, ha hụrụ na ọrịa kansa ahụ agbasasịwo niime ahụ niile nke nna m. Site n’ihe ha chọpụtara, nna m nwere naanị ọnwa ole ma ole ibi ndụ. Obi gbawara anyị.

Dịka nna m tetara ụra ụwa ọwụwa ahụ ahụ, ọ chọsịrị ike ịmata ma ihe emere ọ gara nke ọma. Anyị gwara ya ihe banyere ozi obi ọjọọ ahụ.

Anyị gara n’ihu ikpe ekpere ma buo ọnụ maka ọrụ ebube. Dịka ahụike nna m gbadara n’egbughị oge, anyị malitere ikpe ekpere ka o nwee ike gbanarịa mgbu. N’ikpeazụ, dịka ọnọdụ ya dịkasịrị njọ, anyị rịọrọ Onyenwe anyị ka o kwe ya gafee n’egbughị oge. Naanị ọnwa ole ma ole ịwa ahụ ahụ gasịrị, dịka ọwaa ahụ buru amụma, nna m nwụrụ.

Ịhụnaanya na nlekọta karịrị akarị wụkwasịrị ezi na ụlọ anyị site n’aka ndị otu ngalaba ukwu na ndị enyi ezi na ụlọ. Anyị mere ọmarịcha akwam ozu nke nyere nkwanye ugwu na ndụ nke nna m. Dịka oge gara, kosiladị, ma anyị gabigara mgbu nke enweghị nna m, a malitere m iche ihe mere nna m enweteghị ọgwụgwọ. E chere m ma ọbụ na okwukwe m esighị ike nke ọma. Kedụ ihe mere ụfọdụ ezi na ụlọ si na anata ọrụ ebube, mana ezi na ụlọ anyị anataghị? A mụtawo m na mishọn m ịga na akwụkwọ nsọ maka aziza, ya mere a malitere m ịchọ na-akwụkwọ nsọ.

Agba Ochie na-akuzi maka otu spice ma ọbụ mmanụ otite nwere ezigbo isi a na-eji maka ọgwụgwọ ọnya, nke emere site na ọhịa toro n’ime Gilead. N’oge ndị Agba Ochie, mmanụ otite ahụ ka abịara mara dịka “balm nke Gilead.”1 Onye amụma Jeremiah tiri mkpu maka ọdachi niile nke ọ hụtara n’etiti ndị ya ma nwee olileanya maka ọgwụgwọ. Jeremiah jụrụ ajụjụ, “Ọ bụ n’enweghị balm na Gilead; ọ bụ n’enweghị dibịa n’ebe ahụ?”2 Site na agụmagụ, egwu, na nka, Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst ka ahụtara ọtụtụ mgbe dịka Balm nke Gilead n’ihi ike ọgwụgwọ Ya pụrụiche Dịka Jeremiah, a nọ m na-eche, “Ọ bụ n’enweghị balm na Gilead maka ezi na ụlọ Nielson?”

N’ime Mak isi nke 2 nke Agba Ọhụrụ, anyị na-achọta Onye Nzọpụta nime Capernaum. Okwu nke ike ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta gbasasịworo gburugburu ala ahụ, ma ọtụtụ mmadụ gara njem ruo Capernaum ịga nwete ọgwụgwọ site n’aka Onye Nzọpụta. E nwere imerime mmadụ gbakọrọ n’akụkụ ụlọ ahụ ebe a hụrụ Onye Nzọpụta nke na enweghị ọnụ ụlọ maka Ya ịnabata ha niile. Ndịikom anọ buuru otu nwoke nwere nrịa nrịa nkwarụ ka Onye Nzọpụta gwọọ ya. Ha enweteghị ohere ịgafe n’etiti igwe mmadụ ahụ, ma ya mere ha meghere elu ụlọ ahụ ma budata nwoke ahụ n’ala izute Onye Nzọpụta.

Dịka m na-agụ nkọwapụta nke a, ọ tụrụ m n’anya ihe Onye Nzọpụta kwuru dịka O zutere nwoke nkea: “Nwaọkpara, agbagharawo gị njọ gị niile.”3 E chere m na ọ bụrụ na m bụụrụ otu nime ndịikom anọ ndị ahụ bu nwoke nkea, e nwere m ike gwa Onye Nzọpụta ahụ, “Anyị n’ezie kpọtara ya n’ebe a maka ọgwụgwọ.” E chere na Onye Nzọpụta nwere ike zaghachị, “A gwọrọ m ya.” O kwere omume na aghọtabeghị m n’uju—na ike ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta abụghị nnọọ naanị ike Ya ịgwọ ahụ anyị kama, elemanya ọbụna dị mkpa karịa, ike Ya ịgwọ obi anyị na obi ndị tiwara etiwa nke ezi na ụlọ m?

Onye Nzọpụta kuziri otu ihe ọmụmụ dị mkpa site na nhumihe nkea dịka n’ikpeazụ Ọ gwọrọ ahụ nwoke nke ahụ. Ọ bịara doo m anya na ozi Ya bụ na O nwere ike metụ anya ndị ahụ kpuru isi aka ma ha enwe ike hụ ụzọ. O nwere ike metụ ntị nke ndị ahụ ntị chiri aka, ma ha enwe ike nụ ntị. O nwere ike metụ ụkwụ nke ndị ahụ n’enweghị ike ịga ije aka, ma ha enwe ike gaa ije. O nwere ike gwọọ anya anyị na ntị anyị na ụkwụ anyị, mana kachasị mkpa n’ihe niile, O nwere ike gwọọ obi anyị dịka Ọ na-asacha anyị site na njọ ma bulie anyị site na mnwale anyị siri ike.

Mgbe Onye Nzọpụta pụtakwutere ndị ahụ dị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn mgbe Mbilite n’Ọnwụ Ya gasịrị, ọzọkwa Ọ na-ekwu maka ike ọgwụgwọ Ya. Ndị Nefi na-anụ olu Ya si neluigwe na-asị,Ọ bụ na unu agaghị alaghachikwute m ugbu a, ma chegharịa na mmehie unu, ma gbanwee, na m nwee ike gwọọ unu?”4 Emesịa, Onye Nzọpụta na-akuzi, “N’ihi na unu amataghị ma ha ga-alaghachi ma chegharịa, ma jiri nzube juru eju nke obi bịakwute m, ma aga m agwọ ha.”5 Onye Nzọpụta anaghị ekwu maka ọgwụgwọ nke anụ ahụ mana kama ọgwụgwọ ime mmụọ nke mkpụrụ obi ha.

Moroni na-ewete nghọta agbakwunyere dịka ọ na-ekwusa okwu niile nke nna ya, Mọmọn. Mgbe o kwusịrị maka ọrụ ebube, Mọmọn kọwara, “Ma Kraịst asịwo: Ọbụrụ na unu ga-enwe okwukwe na m unu ga-enwe ike ime ihe ọbụla nke m chere dị mkpa.”6 A mụtara m na isi ihe dị na okwukwe m ga-abụrịrị Jizọs Kraịst ma na m kwesịrị ịnabata ihe dị mkpa nye Ya dịka m n’etinye okwukwe n’ime Ya. A ghọtara m ugbua na ọnwụ nna m dịịrị mkpa na-atụmatụ nke Chineke. Ugbua, dịka m na-atụkwasị aka m n’elu isi ndị ọzọ ịgọzi ya nwoke ma ọbụ nwanyị, okwukwe m dị n’ime Jizọs Kraịst, ma na m ghọtara na mmadụ nwere ike ma ga-enwete ọgwụgwọ anụ ahụ ma ọbụrụ na ọ dị Kraịst mkpa.

Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta, nke na-ewete ma ike mgbapụta Ya ma ike mgbam ume Ya, bụ ngọzi kachasị elu nke Jizọs Kraịst na-enye ndị niile. Dịka anyị na-echegharị n’ezi nzube nke obi, Onye Nzọpụta na-asacha anyị site na mmehie. Dịka anyị ji ihu ọchị enyefe uche anyị naka Nna, ọbụna n’ọnọdụ ndị ihe kachasị sie ike, Onye Nzọpụta ga-ebuli ibu anyị ma mee ha adị mfe.7

Mana ebe a bụ ihe ọmụmụ kacha nke m mụtara. Na-amaghị ama e kwere na ike ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta enweghị isi maka ezi na ụlọ m. Dịka m ji anya kara aka na nhumihe eleghachi anya azụ, a na m ahụta na ike ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta pụtara ihé na ndụ nke onye ọbụla n’ime ndị otu ezi na ụlọ m. Atụkwasịrị m uche nnọọ n’ọgwụgwọ nke anụ ahụ nke mere m ji daa nịhụta ọrụ ebube ndị meworonụ. Onye Nzọpụta gbara nne m ume ma bulie ya karịa ike ya n’oge mnwale nke nke a siri ike, ma o biri ogologo ndụ dị mma. O nwere mmetụta dị mma n’enweghị atụ n’ebe ụmụ na ụmụ ụmụ ya nọ. Onyenwe anyị jiri ịhụnaanya, ịdị n’otu, okwukwe, na ike nnagide gọzie mụ na ụmụnne m na-abụrụzi otu niime ihe ndị dị mkpa na ndụ anyị ma gaanihu taa.

Mana kedụ maka nna m? Dị ka ọ dị ndị niile chegharịrị, a gwọrọ ya niime mmụọ dịka ọ chọrọ ma nata ngọzi niile dị adị n’ihi Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta. Ọ natara mgbaghara nke njọ ya niile ma ugbua n’echere ọrụ ebube nke Mbilite N’ọnwụ. Onyeozi Pọl kuziri, “N’ihi dịka na Adam onye niile nwụrụ, ọbụna otu a na Kraịst ka onye niile ga-esi dị ndụ.”8 Ị hụrụ, a naara m agwa Onye Nzọpụta, “Anyị kpọtaara Gị nna m ịgwọ ya,” ma ugbua o doro m anya na Onye Nzọpụta gwọrọ ya. Balm nke Gilead rụrụ ọrụ na ezi na ụlọ Nielson—ọbụghị n’ụzọ nke anyị chekubere, kama nnọọ n’ụzọ bara uru karịa nke gọziworo ma na-aga n’ihu ịgọzi ndụ anyị.

N’ime Jọn isi nke 6 nke Agba Ọhụrụ, Onye Nzọpụta rụrụ ọrụ ebube kachasị akpali mmasị. Naanị jiri azụ ole ma ole na ogbe achịcha ole ma ole, Onye Nzọpụta nyere mmadụ 5,000 nri. Agụwo m nkọwapụta nkea ọtụtụ mgbe, mana e nwere akụkụ nhumihe ahụ m n’enweteghị nke ugbua pụtara nnukwu ihe nye m. Mgbe Onye Nzọpụta nyesịrị mmadụ 5,000 nri, Ọ gwara ndị n’eso ụzọ Ya ikpokọta iberibe ndị fọdụrụ ọnụ, ndị ahapụrụ, nke juru nkata 12. E chewo m ihe kpatara Onye Nzọpụta si gbuo oge ime nke ahụ. O dowo m anya na otu ihe ọmụmụ anyị nwere ike ịmụta site na mmemme ahụ bụ nkea: O nwere ike inye mmadụ 5,000 nri ma enwee ndị fọdụrụ. “Amara m zuru ezu nye mmadụ niile.”9 Ike mgbapụta na ọgwụgwọ nke Onye Nzọpụta nwere ike ikpuchi mmehie ọbụla, ọnya ọbụla, ma ọbụ mnwale ọbụla—n’agbanyeghị otu o ji dị nnukwu ma ọbụ otu o si sie ike—ma enwee ndị fọdụrụ. Amara Ya zuru ezu.

Site na mmata ihe ahụ, anyị nwere ike gaa n’ihu n’okwukwe, mara na mgbe oge ihe ndị siri ike bịara—ma n’ezie ha ga-abịarịrị—ma ọbụ mgbe mmehie kpugidere ndụ anyị, Onye Nzọpụta na-eguzo “jiri ọgwụgwọ na nku ya,”10 na-akpọku anyị ịbakwute Ya.

A na m agba akaebe m nye unu maka Balm nke Gilead, Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst, Onye Mgbapụta anyị, na ike ọgwụgwọ Ya dị ebube. A na m agba akaebe m maka ọchịchọ Ya ịgwọ unu. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen