Emume nsọ niile na Ịma ọkwa niile
Ezi-na-ụlọ: Nkwupụta nye Ụwa


Ezi na ụlọ

Nkwupụta nye Ụwa

Otu Ndi-isi Ọchịchị na otu ndi Ọchịchị nke Ndi-ozi-Iri-na-abụọ nke Nzụkọ-nsọ nke Jisus Kraist nke Ndi-nsọ Ụbọchị Ikpeazu a.

Anyị, Otu Ndi-isi-Ọchịchị na Otu ndi Ọchịchị nke Ndi-ozi Iri-na-abụọ nke Nzụkọ-nsọ nke Jisus Kraist nke Ndi nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, na-ekwụpụta n’olu nwayọ na ọlụlụ di na nwunye di n’etiti nwoke na nwanyị bụ ihe Chineke hiwere ma na ezi-na-ụlọ dị n’etiti atụmatụ nke ọnye okike maka ebe nketa ebigh-ebi nke ụmụ Ya.

Ndi mmadụ nile. nwoke na nwanyi ka e kere n’oyiyi nke Chineke Nke ọbụla bụ nwa nwoke ma-ọbụ nwa nwanyị mụọ a hụrụn’anya nke nne na nna nke eluigwe, ma n’ụdị ahụ, nke ọbụla nwere ụdị okike dị nsọ na ebe nketa. ḷbụ nwoke ma-ọbụ nwanyi bụ ejirimara dị mkpa nke ndụ tutu abịa n’ụwa, ndụ ụwa, ihe nhụba-ama na ebumn’obi ebigh-ebi nke onwe.

N’ebe obibi ndụ tutu abịa n’ụwa ụmụ mụọ nwoke na nwanyi matara ma fere Chineke ofufe dịka Nna ha nke mgbe ebigh-ebi ma nabata atụmatụ Ya site na nke ụmụ Ya nwere ike iji nweta ahụ anụ ahụ ma rite mmetụta nke ụwa ịgan’ihu chee ihu n’izu oke ma n’ikpe-azụ chọpụta ebe nketa nsọ dịka ndi nketa nke ndụ ebigh-ebi. Atụmatụ nsọ nke obi-ụtọ ahụ na-enye mmekọrịta ezi-na-ụlọ ike ịdịgide gafee ili. Emume nile na ọgbụgba-ndụ nile dị nsọ dị na temple nsọ nile mere ka o kwe omume maka otu onye nile laghachi n’ihu nke Chineke na maka ezi-na-ụlọ nile ka ejikọta ha ọnụ ebigh-ebi.

Iwu mbụ nke Chineke nyere Adam na Iv gbasara nkwadobe ha maka ịbụ nne na nna dịka di na nwunye. Anyị na-ama ọkwa na iwu Chineke maka ụmụ Ya ịmụba na imejupụta ụwa ka dị ire. Anyi na-aga n’ihu na-ama ọkwa na Chineke enyewo iwu na ike nsọ nile nke ịmụta ụmụ ka a ga-eji rụọ ọrụ nani n’etiti nwoke na nwanyi, ejikọtara n’okpụrụ iwu dịka di na nwunye.

Anyị na-ama ọkwa si na ụzọ esi na- ekepụta ndu ibu ihe akwadoro n’ịdị nsọ. Anyị na-ekwusike ịdị-ọcha nke ndụ na nke ịdị mkpa ya n’atụmatụ ebigh-ebi nke Chineke.

Di na nwunye nwere ọrụ nsọ dịrị ha ịhụrita onwe ha n’anya ma na-elekọrịta onye na ibe ya na ụmụ ha. “Ụmụ bụ onyinye nke Onye-nwe-anyị” (Abụọma 127:3). Ndi nne na nna nwere ọrụ dị nsọ ịzụlite ụmụ ha n’ihun’anya na eziomume. Inwetara ha ihe dị mkpa nile nke anụ ahụ, na nke mụọ, na ịtuziri ha ka ha na-ahụrịta n,anya ma na-ejeritara ozi otu onye na ibe ya, na-edebe iwu-nsọ nile nke Chineke, ma bụrụ ndi na-edebe iwu obodo n’ebe ọbụla ha bi. Ndi di na ndi nwunye ndi nne na ndi nna ka a ga-ejide ịza-ajụjụ n’ihu Chineke maka ịrụ ọrụ ndi a dịrị ha.

Ezi-na-ụlọ bụ ihe Chineke hiwere. Ọlụlụ dị na nwunye dị n’etiti nwoke na nwanyị dị mkpa n’atụmatụ ebigh-ebi Ya. O ruuru ụmụaka ka amụọ ha n’ime nkwekọrịta nke ọlụlụ di na nwunye, na kwa a zulite ha n’aka nne na nna ndi na-akwanyere nkwekọrịta nkwa ọlụlụ di na nwunye nile ugwu n’kwesị ntụkwasị obi zuru ezu. Obi-ụtọ n’ezi-na-ụlọ kara bụrụ ihe a ga-enweta mgbe e wukwasịrị ya na nkuzi nile nke Onye-nwe-anyị Jisus Kraist. Ọlụlụ di na nwunye nile gara nke ọma ka e hiwere ma na-elekọta n’ụkpụrụ nile nke okwukwe, ekpere, nchegharị, mgbaghara, nsọpụrụ, ihun’anya, ọmiko, ọrụ na ihe omume mmeghariahụ nile kwesịrị ekwesị. Site na nchepụta dị nsọ, ndi nna ga-achị isi n’ezi-na-ụlọ ha nile n’ihun’anya na ezi-omume ma ọ dịịrị ha inweta ihe nile dị mkpa na ndụ na nchekwa maka ezi-na-ụlọ ha nile. Ndi nne nwere ọrụ mbụ dịrị ha maka nzulite nke ụmụ ha. N’ime ọrụ nile ndia dịrị ha dị nsọ nne na nna nwere ọrụ inyeritara aka otu onye na ibe ya dịka ndi mmekọta ihe dị ahata aha. Enweghi ike ime ihe, ọnwụ, ma-ọbụ ọnọdụ nile ndi ọzọ nwere ike ime ka e nwee mkpa nnọzigharị nke onwe. Ndi ezi-na-ụlọ nne ma-ọbụ nna kwesịrị inye-aka mgbe e nwere mkpa ya.

Anyị na-adọ aka na nti na otu ndi nile nke na-ejehie ọgbụgba-ndụ nile nke ịdị-ọcha mmekọrịta, nke na-akparị di ma-ọbụ nwunye, ma ma-ọbụ nwa, ma-ọbụ na-anaghi emezu ọrụ nile dịịri ya n’ezi-na.ụlọ ga-eguzoro otu ụbọchi ịza ajụjụ n’ihu Chineke. N’igan’ihu, anyi na-adọ aka na ntị na mgbasasị nke ezi-na-ụlọ ga-ewetara onye ọbụla nile, obodo nile, na mba nile oke ọdachi nile e kwuworo site n’ọnụ ndi amụma mgbe ochie na oge ọhụrụ.

Anyị na-akpọkụ ṅdi nwe obodo na ndi isi-ọrụ nke govụmentị n’ebe nile ka ha kwalite atụmatụ nile ndi ahụ a tụputara iji kwado ma gbaa ezi-na-ụlọ ume dịka ntọ-ala nke otu ndi bikọta ọnụ.