Friend
Jekọb na Nefi Hụrụ Jizọs
Maachị 2024


“Jekọb na Nefi Hụrụ Jizọs,” Friend, Maachị 2024, 26–27.

Ozi Kwa Ọnwa Friend Maachị 2024

Jekọb na Nefi Hụrụ Jizọs

Foto, oyiyi
alt text

Ngosipụta niile sitere n’aka Andru Bosley

Jekọb bụ nwanne nwoke Nefi nke nta. A mụrụ ya mgbe ezi na ụlọ ha hapụrụ Jerusalem. Jekọb bịara n’ala ahụ e kwere na nkwa mgbe ọ bụ nwata.

Foto, oyiyi
alt text

Jekọb na Nefi ha abụọ hụrụ Jizọs Kraịst. Ha gbara ama ha nye ndị ezi na ụlọ ha iji nyere ha aka ịmụ ihe banyere Jizọs.

Foto, oyiyi
alt text

Ha kesara okwu niile nke onye amụma Aịzaya kwuru. Aịzaya ahụwokwa Jizọs ma dee banyere Ya niime akwụkwọ nsọ. Jekọb na Nefi jiri okwu niile nke Aịzaya sitere na akwụkwọ nsọ kuziere ndị ezi na ụlọ ha ihe banyere Jizọs.

Foto, oyiyi
alt text

Ha kuziri na Jizọs ga-abịa n’ụwa. Ọ ga-anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ. Ha gbara ama ha banyere Jizọs Kraịst ka ndị ezi na ụlọ ha wee na-atụ anya ọbịbịa Ya.

Ihuakwụkwọ A na-ete agba

Jizọs Bụ Onye Nzọpụta Anyị.

Foto, oyiyi
alt text ebe a

Ngosipụta site n’aka Adam Koford

Olee mgbe ị na-enweta mmetụta ịhụnaanya nke Jizọs?