Friend
Nchekwa niime Ọkụ
Ọktoba 2026


“Nchekwa niime Ọkụ,” Friend, Oct. 2026, 46–48.

Kwa Ọnwa FriendOzi, Ọktoba 2026

Nchekwa niime Ọkụ

Ngosipụta nke Eze Nebuchadnezzar

Eze Nebuchadnezzar wuru nnukwu ihe oyiyi ọlaedo ma manye ndị ya ife ya ofufe. Ọ bụrụ na ha jụ, a ga-etinye ha niime ụlọ ọkụ.

Ngosipụta nke Shadrak, Meshach, na Abed-nego na otu onye agha

Shadrak, Meshach, and Abed-nego hụrụ Chineke naanya ma ha agaghị efe ofufe nye chi ụgha nke eze ahụ.

Ngosipụta nke ndị enyi na-ekwuru eze ahụ okwu

Ndị enyi atọ gwara eze ahụ na ha ga-efe naanị Chineke ofufe. Ha kwere na Chineke ga-echekwa ha. Mana ọbụrụgodị na Ọ zọpụtaghị ha, ha ga-eguzoro ọtọ maka ihe ha kwenyere.

Ngosipụta nke Shadrak, Meshach, na Abed-nego niime ụlọ ọkụ.

Eze ahụ were iwe. O nyere iwu ka atụ ndị enyi ahụ niile ụlọ nke ọkụ ahụ. Mana mgbe eze ahụ lebara anya niime ụlọ ọkụ ahụ, ọ tụrụ ya nanya ịhụ otu mmadụ eluigwe niime ọkụ ahụ ya na ụmụnwoke atọ ahụ.

Ngosipụta nke eze ahụ ka ọ na-ele Shadrak, Meshach, na Abed-nego dịka ha si nʻụlọ ọkụ ahụ na-apụta

Eze ahụ kpọrọ Shadrak, Meshach, na Abed-nego, dịka ha na-esi nʻụlọ ọkụ ahụ na-apụta. Ọkụ ahụ emerụghị ha ahụ ma ọbụ ma rere uwe ha ọkụ.

Ngosipụta nke Shadrak, Meshach, na Abed-nego ka ha na-eje ije ma na-ekwuru eze ahụ okwu.

Shadrak, Meshach, na Abed-nego rube isi nye iwu nso Chineke, ọbụnadị mgbe ndụ ha nọ nʻihe egwu. Ọmụmaatụ ha nyere eze ahụ aka ịkwere na Chineke.

Ihu akwụkwọ a na-ete agba

Ndị amụma ka Akpọrọ Ikwu Okwu nke Onyenwe anyị

Ihu akwụkwọ a na-ete agba nke ndị amụma Baịbụlụ

Ngosịpụta niile site nʻaka Audrey Day. Enwere ike ịkọpị ya maka naanị iji eme ihe na Nzukọ nsọ.

Kedụ otu isi esoro onye amụma ahụ?