“Rut na Naomi,” Friend, Sept. 2026, 46–48.
Ozi nke Friend Kwa ọnwa, Septemba 2026
Rut na Naomi
Ezi na ụlọ nke Naomi biiri na Juda. Ha enweghị nri zuru ezu niihi ụnwụ, ya mere ha kwagara na Moab.
Na Moab, di Naomi nwụrụ ma ụmụ ya ndị nwoke lụrụ ndịinyom akpọrọ Ọpa na Rut. Ha lokọtara Naomi ruo afọ 10. Mana emesịa ndị di Ọpa na Rut nwụrụ. Ugbu a ndịinyom ahụ nọọrọ naanị ha.
Ọpa laghachiri ebe ya. Mana Rut chọrọ ịnọ ma lekọta Naomi. Rut na Naomi nụrụ na ala Juda enwewo akụkụ ubi ọzọ, ya mere ha jere ebe ahụ
Ha bịarutere nʻoge owuwe ihe ubi. Nwanna Naomi Boaz nwere ọtụtụ ubi ama. O kwere ka Rut were urughuru mkpụrụ akụkụ maka nri. Ọ bụ ọrụ ike.
Boaz kwanyeere Rut ugwu niihi na ọ rụsiri ọrụ ike ma guzosiri ike nye Naomi na Onyenwe anyị.
Rut rịọrọ Boaz ịlụ ya. Boaz maara na Rut bụ nwanyị guzosiri ike ma nwee ezigbo omume. O kweere.
Rut na Boaz lụrụ ma mụọ nwa nwoke. Ọtụtụ afọ gasịrị, a mụrụ Jizọs Kraịst site nʻezi na ụlọ nke a.
Ihu akwụkwọ a na-ete agba
Niihi Jizọs Kraịst, E nwere M ike Ichegharị ma Dịrị Ọcha
Ngosịpụta niile site nʻaka Audrey Day. Enwere ike ịkọpị ya maka naanị iji eme ihe na Nzukọ nsọ.
Kedụ ihe na-enyere gị aka mee nhọrọ ndị dị mma?
© 2026 site nʻaka Intellectual Reserve, Inc. Ikike niile ka edokwara. Ebipụtara na USA. Nkwado n’asụsụ Bekee: 6/19. Nkwado ntụgharị asụsụ: 6/19. Ntụgharị asụsụ nke Ozi Friend Kwa ọnwa, Septemba 2026. Igbo. 20073 593