2023
Jizọs Gosiri Anyị Ụzọ ahụ
Ọgọst 2023


“Jizọs Gosiri Anyị Ụzọ ahụ,” Friend, Ọgọst 2023, 4–5.

Ozi niile nke Friend Kwa Ọnwa, Ọgọst 2023

Jizọs Gosiri Anyị Ụzọ ahụ

Foto, oyiyi
Alt text

Ngosipụta niile sitere n’aka Dan Burr

Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Nna nke Eluigwe. Ọ bịara n’ụwa igosi anyị otu anyị nwere ike isi alaghachikwuru Nna nke Eluigwe otu ụbọchị. Emere Jizọs baptizim. Ọ kuziri na anyị ka ekwesịrị imekwa baptizim.

Foto, oyiyi
alt text

Jizọs gosiri anyị otu esi ebi. Ọ hụrụ onye niile naanya ma nyeere onye ọbụla aka. Ọ chọrọ ka anyị soro Ya.

Foto, oyiyi
alt text

Jizọs Kraịst nwere mmetụta mgbu anyị niile ma taa ahụhụ maka mmehie anyị. Emesịa Ọ nwụrụ maka anyị. Nke a ka a na-akpọ Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. Ọ bilitere site n’ọnwụ. Nke a pụtara na Ọ dị ndụ taa! Niihi Jizọs Kraist, anyị ga-adịkwa ndụ ọzọ mgbe anyị nwụsiworo.

Foto, oyiyi
alt text

Jizọs mere ihe niile ndị a maka anyị n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya. Niihi Ya, anyị nwere ike ibinyere Nna anyị nke Eluigwe na ndị ezi na ụlọ anyị niile otu ụbọchị.

Foto, oyiyi
alt text

Anyị nwere ike isoro Jizọs site na-ime baptizim. Anyị nwekwara ike isoro Ya ụbọchị niile mgbe anyị na-ahụ ndị ọzọ naanya ma na-enyere ha aka ma debe iwu nsọ Ya niile.