2023
Jizọs Kraịst Na-eme ka Oké ifufe daa Jụụ
Maachị 2023


“Jizọs Kraịst Na-eme ka Oké ifufe daa Jụụ,” Friend, Mar. 2023, 46–47.

Ozi Friend Kwa Ọnwa, Maachi 2023

Jizọs Kraịst Na-eme ka Oké ifufe daa Jụụ

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst na-arahụ ụra nime ụgbọmmiri ebe ndị na-eso ụzọ Ya n’ele osimiri ahụ anya.

Ngosipụta niile site n’aka Apryl Stott

Otu abalị Jizọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ Ya kụfere osimiri ahụ nime otu ụgbọmmiri. Ike gwụrụ Jizọs ma ọ dara n’ụra.

Foto, oyiyi
Oké ifufe n’achọ ikpu ụgbọmmiri ahụ nke Jizọs na ndị n’eso ụzọ Ya nọ nime.

Oké ifufe bịara. Ebili mmiri ahụ na-abawanye abawanye! Egwu tụrụ ndị na-eso ụzọ. Ha kpọtere Jizọs ma rịọ Ya ka ọ zọpụta ha.

Foto, oyiyi
Jizọs Kraịst dị ka ọ na-eme ka oké ifufe ahụ daa Jụụ

Jizọs bilitere ma kwuo, “Udo, dere duu.” Ikuku ahụ kwụsịrị. Mmiri ahụ dara jụụ.

Foto, oyiyi
Nwata nwoke nke jikọtara aka ya ma mechie anya ya.

Okwukwe m nime Jizọs Kraịst nwere ike ịwetere m udo. Mgbe egwu n’atụ m, Jizọs nwere ike inyere m aka nwete mmetụta udo.

Ihuakwụkwọ A Na-Ete Agba

Ọ Na-amasị m Ịmụ ihe gbasara Jizọs

Foto, oyiyi
ihuakwụkwọ a na-ete agba nke nwata nwanyị n’ele anya n’otu akwụkwọ banyere Jizọs

Ngosipụta si n’aka Patricia Geis

Gịnị ka ịmara banyere Jizọs?