Anabatara onye niile. Gaa otu nzukọ nsọ dị gị nso.

Anyị bụ obodo tụkwasịrị obi na Kraịst, na-eme oke ike kwere anyị igosị ịhụnaanya ma jeere ndị ọzọ ozi. I nwere ọnọdụ ebe a.
Chọta nzukọ nsọ dị gị nso.
People in Lima, Peru: Attending Church

Ajụjụ Ndị A na-ajụkarị

Ndị otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ha bụ ndị Kristian?

Ee! Dị ka ndị otù nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, anyị kwere na Jizọs Kraịst bụ Ọkpara nke Chineke na Onye Nzọpụta nke Ụwa. Ọ hụrụ anyị niile naanya karịa ka anyị nwere ike iche. Anyị na-ahụta onwe anyị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs dị uchu. Ebe ụfọdụ nkwenye anyị pụrụ iche, anyị kwere na site na ndụ, ije ozi, aja, na mbilite n’ọnwụ Ya, Jizọs Kraịst zọpụtara anyị site na mmehie, ntaram ahụhụ, na ọnwụ.

Mụtakwuo makankwenye anyị niile.

Kedụ ihe ofufe Nzukọ nsọ niile dị ka ya?

Oge ofufe ndị nke Nzukọ nsọ dị iche iche site ọgbakọ ruo na ọgbakọ. Otu osila dị, mgbe niile i nwere ike ịhụta otu ofufe inye otito nke bụ isi maka onye ọbụla, nke klaasị ndị nke ụmụntakịrị, ndị ntoroọbịa, na nke ndị dimkpa na-esote.

Ofufe maka onye ọbụla ka a na-akpọ “nzukọ oriri nsọ.” Nzukọ nke a gụnyere egwu, ekpere, na okwuchukwu niile (ma ọ bụ “okwu”) ndị a na-enye site nʻaka ndị otù dị iche iche nke ọgbakọ izu ụka ọbụla. Mana akụkụ kacha mkpa nke nzukọ nke a bụ mgbe anyị na-eri oriri nsọ (nke yiri kọmụnịọn) iji na-echeta Onye Nzọpụta.

Mụtakwuo ihe banyere ofufe Sọnde niile ma ọ bụ chọta nzukọ nsọ dị gị nso.

Gịnị kpatara Nzụkọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ ji enwe tempụl?

Maka Ndị nsọ Ubọchi ikpeazụ a, tempụl dị iche site na ụlọ ndị nke Nzukọ nsọ ndị ọzọ. Tempụl bụ ebe Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a na-anata nkuzi pụrụ iche banyere Chineke na Jizọs Kraịst. Niime tempụl, ndị otù na-eme ọgbụgba ndụ (ma ọ bụ ekwe nkwa) ndị dị ebighị ebi anyị na Chineke. Nke a gụnyere nkwa ndị nke idebe iwu nsọ niile, ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst, ikwesị ntụkwasị obi na-alụmdi, na inye aka lekọta onye na ibe ya site na ịdị na-eke ihe anyị nwere.

Ọzọkwa, niihi na anyị kwere na ezi na ụlọ na-adịgide ruo ebighị ebi, ọtụtụ niime ọrụ a na-arụ niime tempụl niile bụ ime ka njikọ ọnụ nke ezi na ụlọ dị ike karịa. Alụmdi niile niime tempụl ka a na-eme ịnọgide ruo ebighị ebi, ọ bụghị nnọọ “tutu ọnwụ ekewaa unu.” Ndị nne na nna na ụmụntakịrị na-aghọ ndị ezi na ụlọ dị ebighị ebi niime tempụl niile. Ndị ichie nwekwara ike nata ngọzi niile nke tempụl ma ọ bụrụ na mmadụ emee emume nsọ niile dị nsọ nʻọnọdụ ha ma ha anabata ihe omume nke ije ozi ahụ. Tempụl niile bụ ebe ihe omume na-aganiihu!

Kedụ ihe bụ Akwụkwọ nke Mọmọn?

Akwụkwọ nke Mọmọn  bụ akwụkwọ nke akwụkwọ nsọ mmụọ kpatere nke na-akuziri anyị banyere Chineke na Jizọs Kraịst. Ọ na-enyere anyị aka nata ntuzi aka maka ndụ nke aka anyị ma nwere ike nyere anyị aka nwee mmetụta ịnọ Jizọs Kraịst nso karịa. Ebee ka aha ahụ siri bịa? Narị kwuru narị afọ gara aga, onye amụma mgbe ochie akpọrọ Mọmọn chịkọtara ndekọihe nke ndị ya. Ha zutere ọtụtụ ihe aka mgba dịkwa ka anyị na-ezute. Ma dị nnoo ka anyị, ha chotara ume mgbe ha gbakwuru Jizọs Kraịst. Nweta ndubata nye Akwụkwọ nke Mọmọn gị na ndị mgbasa ozi ọma.

Akwụkwọ nke Mọmọn na-agakọ ya na Baịbụl dị ka ama ọzọ nke Jizọs Kraịst na ozi Ya dị nsọ dị ka Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta nke ụwa. Ịchịkọta ọnụ, Baịbụl na Akwụkwọ nke Mọmọn na-ewetakwu nghọta banyere ịhụnaanya dị ukwuu nke Chineke maka anyị niile ma nwere ike inyere anyị aka bịakwute Ya nso. 

Mụtakwuo ihe gbasara otu Baịbụl na Akwụkwọ nke Mọmọn na-esi arụkọta ọrụ ọnụ.

Anyị ọ kwere na Baịbụl?

Ee. Baịbụl bụ okwu nke Chineke, vọlum akwụkwọ nsọ dị nsọ, ma isoro nkuzi ya niile na-ewete ọn̄ụ na ndụ anyị. Etikọta ya na Baịbụl, anyị na-ahụkwa mkpatemmụọ niime akwụkwọ ndị ọzọ nke akwụkwọ nsọ pụrụ iche nye Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a. Ha na-arụkọta ọrụ ọnụ ikuziri anyị eziokwu ndị dị mkpa banyere Chineke na Jizọs Kraịst.

Mụtakwuo ihe banyere nkwenye anyị na Baịbụl.

Lekwuo

Bịakwute Chineke nso karịa ka i si eme. Zute ndị mgbasa ozi ọma.

Zute nʻikuku ma ọ bụ na mmadụ. Anyị ga-aza ajụjụ gị niile ma dubata gị na nzukọ nsọ nọ niime obodo gị.

Rịo maka Nleta
Two sister missionaries prepare to ride the subway in Hong Kong

Jizọs Kraịst, Onye Ọmụmaatụ Anyị Zuru oke

“Anyị kwesịrị inwe ịhụnaanya ma mee ihe dị mma nye ndị niile. Anyị kwesịrị izere esemokwu ma bụrụ ndị na-eme udo na nzikọrịta ozi anyị niile. Nke a apụtaghị imebi ụkpụrụ anyị na ihe ndị anyị na-ebute ụzọ, mana ịkwụsị ịlụsị ndị ọzọ ogụ maka nke ha. Nke ahụ bụ ihe Onye nlereanya Zuru oke anyị mere oge ozi Ya. Nke a bụ ihe ịmaatụ ahụ O hiweere anyị, dị ka Ọ kpọrọ anyị isoro Ya.”
Leon Parson will be doing a painting of President Oaks and has requested photos of President Dallin H. Oaks as reference
Onyeisi Dallin H. Oaks
Onye amụma na onyeisi nke Nzụkọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a

Obodo nke Okwukwe Lekwasịrị anya na Jizọs Kraịst

Four Corners: Primary Children
Ihe a Ga-atụanya ya na Nzukọ nsọ
Nzukọ nsọ bụ ebe mgbaba site na ọgba aghara niile nke ụbọchị niile nke ndụ—ebe i nwere ike ife Chineke ofufe gị na ndị ọzọ kwere ekwe na-agba mbọ ịdị ka Jizọs karịa. Ọ ga-amasị anyị ka gị bịa nleta!
Pacific, New Zealand, Stock Photos
Nkwenye anyị niile
Nkwenye anyị niile dabeere na Chineke na Jizọs Kraist. Mụtakwuo banyere ihe anyị kwenyere na otu isi nkwenye ndị ahụ nwere ike kpatee mmụọ gị isoro Onye Nzọpụta.
Jisie ike Mata Anyị
Pacific, Tonga, Stock Photos
Jisie ike Mata Anyị
Ị ga-achọta ndị otù Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a ebe ọbụla nʻụwa. Anyị bụ ndị enyi na ndị agbata obi gị na-arụkọta ọrụ ọnụ ịgbalị ime ụwa ebe dịtụ mma karịa.

Nweta ozi ndị akacha nwee ugbua sitere na Nzukọ nsọ.

Ihe ndị dị mma na-eme na gburugburu ụwa. Nweta ka ihe si kwụrụ ugbua na arụmarụ niile, mmemme niile, mbọ enyem aka ọdachi niile nke Nzukọ nsọ, na ihe ndị ọzọ.

Nleta Ọnụ ụlọ mgbasa ozi
Chile: Family Life
Chọta otu Nzukọ nsọ Dị Gị Nso.
Zukọta gị na ndị Mgbasa ozi ọma
Mụọ Akwụkwọ nke Mọmọn.